Ntụziaka Maka Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
1. Ntụziaka dị n’akwụkwọ a ga-enyere ndị niile na-eme ihe omume n’ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ aka. Ha ga-eleba anya ná ntụziaka dị n’ebe ihe omume ha si n’akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nakwa n’ihe e kwuru gbasara ihe omume ha n’akwụkwọ a tupu ha amalite ịkwadebe ya. E kwesịrị ịgba ndị nkwusa niile ume ka ha soro na-eme ihe omume ụmụ akwụkwọ. Ndị na-abụghị ndị nkwusa, bụ́ ndị na-abịachi ọmụmụ ihe anya, nwekwara ike iso na-eme ihe omume ma ọ bụrụ na ha kwetara ihe Baịbụl na-akụzi, na-akpakwa àgwà otú Baịbụl kwuru na Onye Kraịst kwesịrị ịna-akpa àgwà. Ọ bụrụ na onye na-abụbeghị onye nkwusa chọrọ iso na-eme ihe omume, ya na Onye Nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ kwesịrị ikwurịta ihe ndị a chọrọ ya n’aka. Ọ bụrụ na o ruru eru, Onye Nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-agwa ya. Onye na-amụrụ ya ihe (ma ọ bụ nne ya ma ọ bụ nna ya bụ́ Onyeàmà Jehova) kwesịrị ịnọ mgbe ha na-ekwurịta ya. Ọ bụ otu ihe ahụ a chọrọ n’aka onye chọrọ ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ka a chọkwara n’aka yanwa.—od peeji nke 8 para. nke 8.
OKWU MMEGHE
2. Otu nkeji. N’izu ọ bụla, a bụchaa abụ ma kpee ekpere mmeghe, onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-ekwu okwu mmeghe ga-eme ka ụmụnna tụsiwe anya ihe ndị a ga-amụ n’ụbọchị ahụ ike. Ọ ga-elekwasị anya n’ihe ndị ga-abara ọgbakọ uru.
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
3. Okwu: Nkeji iri. A na-ede isiokwu okwu a nakwa ihe abụọ ma ọ bụ atọ gbara ọkpụrụkpụ a ga-ekwu na ya n’akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ka a ga-ekenye ya. N’izu ọ bụla a ga-ebido ịgụ akwụkwọ Baịbụl ọhụrụ, a ga-ebu ụzọ gosi obere vidio ga-akọwa akwụkwọ Baịbụl ahụ. Onye ga-eme ihe omume a nwere ike ịkọwa otú vidio a si gbasa isiokwu ọ na-ekwu. Ma, ọ ga-agbalị kwuchaa ihe abụọ ma ọ bụ atọ gbara ọkpụrụkpụ dị n’ebe ihe omume ya si. O kwesịrị iji ihe osise dị n’ebe ihe omume ya si mee ka ihe ọ na-ekwu dokwuo anya. O nwekwara ike ikwu ihe ndị ọzọ o metara na nchọnchọ ma ọ bụrụhaala na ọ ga-eme ka ihe ọ na-ekwu dokwuo anya.
4. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: Nkeji iri. Ọ ga-abụ ajụjụ na azịza. Ọ gaghị enwe okwu mmeghe ma ọ bụ okwu mmechi. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ga-eme ya. O kwesịrị ịjụcha ajụjụ abụọ ndị ahụ. Ọ ga-ekpebikwa ma à ga-agụ amaokwu Baịbụl ndị dị n’ebe ihe omume ya si. Onye ọ bụla a kpọrọ ka ọ zaa ajụjụ kwesịrị iji tịnkọm tịnkọm 30 ma ọ bụ ihe na-erughị ya zaa ya.
5. Ọgụgụ Baịbụl: Nkeji anọ. Ọ bụ nwanna nwoke ga-eme ihe omume a. Ọ ga-agụ ebe e kenyere ya n’ekwughị okwu mmeghe ma ọ bụ okwu mmechi. Onyeisi oche ọmụmụ ihe etiti izu ga-agbasi mbọ ike na-enyere ndị na-eme ihe omume a aka ka ha na-agụzi ihe agụzi, na-agụ ya otú ndị ọzọ ga-aghọta ya, na-agụ ya were were, na-agụ ya ka o doo anya, na-agbanwe ụda olu otú kwesịrị ekwesị, na-akwụsịtụ n’ebe ha kwesịrị ịkwụsịtụ, na-agụkwa ya otú ha si ekwu okwu. Ebe ọ bụ na ebe ụfọdụ a ga-agụ na Baịbụl nwere ike ịdị nkenke, ụfọdụ adị ogologo, onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ kwesịrị icheta otú nwa akwụkwọ nke ọ bụla si agụ ihe mgbe ọ na-eke ihe omume.
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
6. Nkeji iri na ise. A chọrọ ka agba nke a n’ọmụmụ ihe anyị nyere mmadụ niile aka ịkwadebe ihe anyị ga-ekwu n’ozi ọma na ịmụtakwu otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma ma na-akụzi ihe nke ọma. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ikenye ndị okenye ihe omume ụmụ akwụkwọ. Nwa akwụkwọ nke ọ bụla kwesịrị ịrụ ọrụ n’ihe ọmụmụ a chọrọ ka ọ rụọ ọrụ na ya na broshọ Izi Ihe ma ọ bụ na broshọ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. A ga-ede ebe ọ ga-arụ ọrụ n’akụkụ ebe ihe omume ya si n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Mgbe ụfọdụ, a ga-enwe ihe omume ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ya dị otú ahụ, ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ga-eme ya.—Gụọ paragraf nke 15 ka ị hụ otú e si eme ihe omume ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
7. Ịmalite Mkparịta Ụka: E nwere ike ikenye nwoke ma ọ bụ nwaanyị ihe omume a. E kenye ya nwoke, ọ bụ ya na nwoke ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya ga-eme ya. E kenyekwanụ ya nwaanyị, ọ bụ ya na nwaanyị ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya ga-eme ya. Ha nwere ike ịnọdụ ala ma ọ bụ guzoro ọtọ mee ya.—Ị chọọ ịmatakwu ihe a chọrọ ka i mee n’ihe omume a nakwa otú ị ga-esi eme ya, gụọ paragraf nke 12 na nke 13.
8. N’Oge Ọzọ: E nwere ike ikenye nwoke ma ọ bụ nwaanyị ihe omume a. E kenye ya nwoke, ọ bụ ya na nwoke ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya ga-eme ya. E kenyekwanụ ya nwaanyị, ọ bụ ya na nwaanyị ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya ga-eme ya. Ha nwere ike ịnọdụ ala ma ọ bụ guzoro ọtọ mee ya. (km 5/97 p. 2) Onye ga-eme ihe omume a kwesịrị igosi ihe a ga-ekwu ma a gaghachi na nke onye nwere mmasị n’oge mbụ e ziri ya ozi ọma.—Ị chọọ ịmatakwu ihe a chọrọ ka i mee n’ihe omume a na otú ị ga-esi eme ya, gụọ paragraf nke 12 na nke 13.
9. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs: E nwere ike ikenye nwoke ma ọ bụ nwaanyị ihe omume a. E kenye ya nwoke, ọ bụ ya na nwoke ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya ga-eme ya. E kenyekwanụ ya nwaanyị, ọ bụ ya na nwaanyị ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya ga-eme ya. (km 5/97 p. 2) Ha nwere ike ịnọdụ ala ma ọ bụ guzoro ọtọ mee ya. Ọ bụrụ na onye na-eme ihe omume a na-egosi na ha amụwala Baịbụl amụwa, ọ gaghị adị mkpa ka o kwuo okwu mmeghe ma ọ bụ okwu mmechi, ọ gwụla ma à gwara ya na a ga-ele ya anya n’okwu mmeghe ya ma ọ bụ n’okwu mmechi ya. Ọ bụghị iwu na ha ga-agụpụta paragraf niile dị n’ebe ihe omume ya si, ma ha nwekwara ike ịgụpụta ha niile.
10. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere: Ọ bụrụ okwu, a ga-ekenye ya nwoke. Ma ọ bụrụ ihe ngosi, e nwere ike ikenye ya nwoke ma ọ bụ nwaanyị. E kenye ya nwoke, ọ bụ ya na nwoke ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya ga-eme ya. E kenyekwanụ ya nwaanyị, ọ bụ ya na nwaanyị ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya ga-eme ya. Onye ga-eme ihe omume a ga-eji akọ zaa ajụjụ a jụrụ n’ihe omume ahụ otú ga-edo anya. Ọ bụ n’ebe ihe omume ya si ka ọ ga-enweta azịza ajụjụ ahụ. Ọ bụ ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-akpọ aha akwụkwọ ihe omume ya si ma ọ bụ na ọ gaghị akpọ.
11. Okwu: Ihe omume a ga-abụ okwu nke nwanna nwoke ga-agwa ọgbakọ. Ọ bụrụ na ebe e si nweta ihe omume a bụ n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, onye ga-eme ya ga-egosi otú a ga-esi eji amaokwu Baịbụl ndị e dere ebe ahụ ezi ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ọ ga-akọwa mgbe e nwere ike ịgụrụ mmadụ amaokwu Baịbụl a chọrọ ịgụ, kọwaa ihe amaokwu ahụ na-ekwu, nakwa otú a ga-esi eme ka onye a gụụrụ ya chebara ya echiche. Ọ bụrụ na ihe omume ahụ si n’otu n’ime nọmba ndị dị n’isiokwu ndị e nwere na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, onye ga-eme ya ga-egosi otú a ga-esi eme ihe e dere na nọmba e kenyere ya eme n’ozi ọma. O nwere ike ime ka a ghọta ihe atụ dị na nọmba nke 1 n’isiokwu ahụ ma ọ bụkwanụ ya akọwaa amaokwu ndị ọzọ dị n’isiokwu ahụ, ma ọ bụrụ na ime otú ahụ ga-abara ụmụnna uru.
12. Ihe A Chọrọ Ka E Mee: Ihe e kwuru na paragraf a nakwa na nke na-eso ya bụ otú a ga-esi na-eme ihe omume “Ịmalite Mkparịta Ụka” na “n’Oge Ọzọ.” Ọ gwụla ma è kwuru ihe dị iche, ihe onye ga-eme ihe omume a kwesịrị ime bụ ịkụziri onye ya na ya na-akparịta ụka otu eziokwu dị mfe nghọta si na Baịbụl nke ga-abara onye ahụ uru. Ọ ga-agwakwa ya ihe ya na ya ga-ekwu mgbe ọzọ. Onye ga-eme ihe omume a ga-ahọrọ isiokwu dabara adaba nke ga-amasịkwa ndị bi n’ógbè ha. Ọ ga-ekpebikwa ma ọ̀ ga-enye onye ahụ akwụkwọ ma ọ bụ gosi ya vidio si n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. Kama iburu ihe ndị ha ga-ekwu n’isi, ụmụ akwụkwọ ga-agbalị mụta nkà dị iche iche ga-enyere ha aka ịna-akpanyere ndị mmadụ ụka, dị ka igosi ndị ọzọ na ha nwere mmasị n’ebe ha nọ na ikwu okwu ka ebe mmadụ na ibe ya na-akparịta ụka.
13. Otú A Ga-esi Eme Ya: Onye ga-eme ihe omume a ga-eme ya ka ọ daba n’otú ihe si dị n’ógbè ha. Dị ka ihe atụ:
(1) Ozi Ụlọ n’Ụlọ: Otú a ga-esi eme ya bụ igosi otú e si ezi ozi ọma ụlọ n’ụlọ. O nwere ike izi ya ihu na ihu, n’ekwentị, ma ọ bụ e si n’akwụkwọ ozi zie ya. E nwekwara ike igosi otú a ga-esi agaghachi na nke onye e ziri ozi ọma n’ozi ụlọ n’ụlọ.
(2) Ịgba Àmà Mgbe A Na-anọghị n’Ozi: Otú a ga-esi eme ya bụ igosi otú e si eji ohere dapụtara mgbe mmadụ na ibe ya na-akparịta ụka zie ozi ọma. O nwere ike ịbụ mmadụ izi onye ọrụ ibe ya ozi ọma, nwa akwụkwọ ibe ya, onye agbata obi ya, onye ya na ya bakọrọ ụgbọala, ma ọ bụ onye ya na ya nọ mgbe ọ na-eme ihe ndị dịịrị ya n’ụbọchị.
(3) Ịgba Àmà n’Ebe Ndị Mmadụ Na-anọkarị: Otú a ga-esi eme ya bụ igosi otú e si eji ihe a na-akwagharị akwagharị ezi ozi ọma, izi ozi ọma n’ahịa, n’okporo ụzọ, n’ebe a na-abanye ụgbọala, ma ọ bụ n’ebe a na-adọsa ụgbọala, ma ọ bụkwanụ n’ebe ọ bụla ọzọ e nwere ike ịhụ ndị mmadụ.
14. Iji Akwụkwọ na Vidio Eme Ihe Omume: Dabere n’otú ihe si dị, nwa akwụkwọ nwere ike ikpebi ma ọ̀ ga-egosi vidio ma ọ bụ nyefee akwụkwọ. Ọ bụrụ na e nwere vidio n’ihe omume e nyere ya, ma ọ bụkwanụ na o kpebiri igosi vidio, ọ ga-ekwu aha vidio ọ chọrọ igosi, kwuokwa ihe ụfọdụ gbasara vidio ahụ, ma ọ gaghị akpọnye ya akpọnye.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
15. A bụchaa abụ, a ga-eme otu ihe omume ma ọ bụ abụọ ga-ewe nkeji 15 ndị ga-enyere ụmụnna aka ịna-eme ihe Okwu Chineke kwuru. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ka a ga-ekenye ihe omume a, ọ gwụkwala ma è nyere ntụziaka dị iche. Ma, ọ bụ naanị ndị okenye ka a ga na-ekenye ihe omume mkpa ọgbakọ. Ọ bụrụ na e kwuru na ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ n’ihe omume, nwanna ga-eme ya nwere ike ịjụ ụmụnna ajụjụ niile e dere n’ihe omume ya nakwa ajụjụ ndị ọzọ ga-eme ka ụmụnna ghọta ihe a na-ekwu. Okwu mmeghe ya kwesịrị ịdị nkenke ka o nwee ike iwepụtacha isi ihe dị n’ihe omume ya nakwa ka ụmụnna nwee ike itinyetụ ọnụ. Ọ bụrụ na a ga-agba mmadụ ajụjụ ọnụ n’ihe omume ahụ, ọ ga-aka mma ka onye ahụ gbagote n’ikpo okwu ma o kwe mee, kama ịnọ n’oche ya.
16. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: Nkeji iri atọ. Ọ bụ okenye ruru eru ka a ga-ekenye ihe omume a. (N’ọgbakọ e nwere ndị okenye ole na ole, e nwere ike ikenye ya ohu na-eje ozi ruru eru.) Ọ bụ ndị okenye ga-ekpebi okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ịna-eduzi ya. Ndị a họpụtara ka ha na-eduzi ya kwesịrị iduzi ya nke ọma otú ha ga-eduzicha ya n’oge e kenyere ha, meekwa ka a ghọta amaokwu Baịbụl ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na paragraf ndị a na-amụ, meekwa ka mmadụ niile ghọta uru isi ihe a na-amụ bara. Ha kwesịrị ịgụ ntụziaka ndị e nyere banyere iduzi ihe omume nwere ajụjụ na azịza, ka ha nwee ike ịna-eduzi ya nke ọma. (w23.04 p. 24, igbe) Ọ bụrụ na e wepụtachaala isi ihe dị n’ebe a na-amụ n’izu, ọ dịghị mkpa ịgbatịwa ọmụmụ ihe. O kwe mee, e kwesịrị ịna-agbanwe ndị ga na-eduzi ya na ndị ga na-agụpụta ihe a na-amụ n’izu ọ bụla. Ọ bụrụ na onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ekwuo ka a ghara ijicha nkeji iri atọ duzie ya, nwanna ga-eduzi ya ga-ekpebi ihe ọ ga-eme iji gbubilata oge. O nwere ike ikpebi ka a hapụ ịgụ paragraf ụfọdụ.
OKWU MMECHI
17. Nkeji atọ. Onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-ekwughachi ihe ndị dị ezigbo mkpa a mụrụ n’ụbọchị ahụ. Otu ụzọ o nwere ike isi mee ya ma ọ bụrụ na oge fọrọ bụ ịjụ ụmụnna ihe ndị ga-abara ha uru ha mụtara n’ọmụmụ ihe. Ọ ga-ekwukwa ihe a ga-amụ n’izu ọzọ. O nwekwara ike ịkpọ aha ụmụ akwụkwọ ndị ga-eme ihe omume n’izu ọzọ, ma ọ bụrụ na oge fọrọ. Ọ bụ n’oge a ka ọ ga-ama ọkwa ndị e kwesịrị ịmara ọgbakọ ma ọ bụ gụọ akwụkwọ ozi e kwesịrị ịgụrụ ha, ọ gwụla ma è kwuru ka e mee ihe dị iche. E kwesịghị ịna-ama ọkwa ihe ndị dị ka ebe a ga-ezukọ maka ozi ọma ma ọ bụ ebe a ga-aga ozi ọma ma ọ bụkwanụ otú a ga-esi edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. A ga-amapawa ihe ndị a na bọọdụ ịma ọkwa. Ọ bụrụ na oge e wepụtara maka okwu mmechi agaghị ezuru onyeisi oche ịma ọkwa ma ọ bụ ịgụ akwụkwọ ozi ndị e kwesịrị ịgụ, o kwesịrị ịgwa ụmụnna ndị ga-eme ihe omume ndị e nwere ná nkebi nke ikpeazụ, bụ́ Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ, ka ha gbubilata oge ihe omume ha ga-ewe. (Gụọ paragraf nke 16 na nke 19.) A ga-eji abụ na ekpere mechie ọmụmụ ihe a.
ỊJA MMA NA INYE NDỤMỌDỤ
18. Onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-eji naanị ihe dị ka otu nkeji jaa nwa akwụkwọ ọ bụla mere ihe omume mma ma nye ya ndụmọdụ dabara n’ebe a na-ele ya anya ka ọ rụọ ọrụ. Mgbe onyeisi oche na-akpọpụta nwa akwụkwọ ga-eme ihe omume, ọ gaghị ekwu ebe a na-ele ya anya ka ọ rụọ ọrụ. Ma, nwa akwụkwọ mechaa ihe omume ya, onyeisi oche ga-aja ya mma, kwuokwa ebe o lere ya anya. Ọ bụrụ na o mere nke ọma, ọ ga-ekwu ihe mere o ji bụrụ na o mere nke ọma. Ma, ọ bụrụ na o mechaghị nke ọma, ọ ga-emeda obi kwuo ihe mere o ji bụrụ na o mechaghị nke ọma nakwa otú ọ ga-esi eme ya mgbe ọzọ. Onyeisi oche nwekwara ike ikwu ihe ndị ọzọ gbasara ihe omume ahụ ma ọ bụrụ na o chere na ọ ga-abara nwa akwụkwọ ahụ ma ọ bụ ndị ọzọ uru. O nwekwara ike iji broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, broshọ bụ́ Izi Ihe, ma ọ bụkwanụ akwụkwọ bụ́ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi nyekwuo nwa akwụkwọ ndụmọdụ mgbe naanị ya na ya nọ ma ọmụmụ ihe gbasaa ma ọ bụkwanụ n’oge ọzọ. O nwere ike isi n’ebe a na-ele nwa akwụkwọ ahụ anya ka ọ rụọ ọrụ nye ya ndụmọdụ ahụ ma ọ bụkwanụ ya esi n’ọzọ.—Ị chọọ ịmatakwu ihe bụ́ ọrụ onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nakwa ihe bụ́ ọrụ onye na-enye ndụmọdụ, gụọ paragraf nke 19, 24, na 25.
IDEBE OGE
19. O nweghị ihe omume kwesịrị ịgafe oge e kenyere maka ya. Onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ekwesịghịkwa iri oge. N’agbanyeghị na e dere oge a ga-eji eme ihe omume nke ọ bụla n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, e wepụtachaa isi ihe ndị dị n’ihe omume e kenyere mmadụ, ọ dịghị mkpa imerekwa ihe omume ahụ na-aga naanị ka oge e kenyere maka ya gwụ. Ọ bụrụ na onye mere ihe omume erie oge, onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ma ọ bụ onye na-enye ndụmọdụ ga-enye onye ahụ ndụmọdụ, ma ọ gaghị abụ n’ihu ọha. (Gụọ paragraf nke 24 na nke 25.) Ihe niile a ga-eme n’ọmụmụ ihe a, ma abụ ma ekpere, ga-ewe otu awa na nkeji iri anọ na ise.
IZU ONYE NLEKỌTA SEKIT NA-ELETA ỌGBAKỌ
20. Onye nlekọta sekit bịa ileta ọgbakọ, ọgbakọ ga-enwe ọmụmụ ihe otú e si hazie ya n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Naanị ihe ga-agbanwe bụ na a gaghị enwe Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. Kama, onye nlekọta sekit ga-eji oge ahụ kwuo okwu mbụ ya nke ga-ewe nkeji 30. Ma tupu ya ekwuwe okwu ya, onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-achịkọta ihe a mụrụ n’ụbọchị ahụ, kwuo isi ihe a ga-amụ n’izu ọzọ, maa ọkwa ndị e kwesịrị ịma, gụọ akwụkwọ ozi ndị e kwesịrị ịgụ, kpọpụtazie onye nlekọta sekit. Onye nlekọta sekit kwuchaa okwu ya, ọ ga-eji abụ ọ họọrọ mechie ọmụmụ ihe ahụ. Ọ chọọ, o nwere ike ịkpọ nwanna nwoke ọzọ ka o kpee ekpere mmechi. A gaghị enwe klas ọzọ n’izu onye nlekọta sekit na-eleta ọgbakọ. Ìgwè na-amụ ihe n’asụsụ ọzọ nwere ike ịmụ ihe nke ha. Ma, o ruo mgbe onye nlekọta sekit ga-ekwu okwu ya, ha ga-esonyere ọgbakọ gee okwu ahụ.
IZU ỌGBAKỌ NA-AGA MGBAKỌ SEKIT MA Ọ BỤ MGBAKỌ UKWU
21. Ọmụmụ ihe agaghị adị n’izu ọgbakọ na-aga mgbakọ sekit ma ọ bụ mgbakọ ukwu. E kwesịrị ichetara ụmụnna ka ha mụọ ihe omume nke izu ahụ n’onwe ha ma ọ bụ n’ofufe ezinụlọ ha.
IZU A GA-ECHETA ỌNWỤ JIZỌS
22. Ọ bụrụ na ụbọchị a ga-echeta ọnwụ Jizọs dabara n’ụbọchị Mọnde, Tuzdee, Wenezdee, Tọzdee, ma ọ bụ Fraịdee, a gaghị enwe Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ n’izu ahụ.
ONYE NLEKỌTA ỌMỤMỤ IHE OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ
23. Ọ bụ okenye ndị okenye họpụtara ga-abụ onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Ọrụ ya bụ ịhụ na a haziri ọmụmụ etiti izu nke ọma nakwa na a na-eme ihe niile otú e kwuru n’akwụkwọ a ka a na-eme ha. Ya na onye na-enye ndụmọdụ kwesịrị ịna-arụkọ ọrụ. Onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nwetahaala Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, ọ ga-eke ihe omume niile a ga-eme n’ime ọnwa abụọ n’ọmụmụ ihe etiti izu, ma ihe omume ụmụ akwụkwọ ma ihe omume ndị na-abụghị nke ụmụ akwụkwọ ma nke ndị ga-abụ ndị isi oche n’ọmụmụ ihe etiti izu. Ma, ọ bụ ndị okenye ga-ekpebi ndị okenye ruru eru ịbụ ndị isi oche n’ọmụmụ ihe etiti izu. (Gụọ paragraf nke 3-16 na nke 24.) Mgbe ọ na-eke ihe omume ụmụ akwụkwọ, ọ ga-eburu afọ ndụ onye nke ọ bụla n’uche, otú ọ maruru ihe, nakwa otú ọnụ karuru ya ime ihe omume a ga-ekenye ya. Ọ ga-eburukwa ihe ndị a n’uche mgbe ọ na-eke ihe omume ndị ọzọ. E kwesịrị ikenye ndị niile ga-eme ihe omume ihe omume ha ọ́ dịkarịa ala izu atọ tupu ụbọchị ha ga-eme ha. Ọ bụ fọm bụ́ Akwụkwọ Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (S-89) ka e kwesịrị iji kenye ụmụ akwụkwọ ihe omume. Onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-ahụ na a mapawara akwụkwọ ebe e dere aha ndị niile nwere ihe omume na bọọdụ ịma ọkwa. Ndị okenye nwere ike ịhọpụta otu okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ga na-enyere ya aka. Ma, ọ bụ naanị ndị okenye ka e nwere ike ịgwa ka ha kee ihe omume na-abụghị nke ụmụ akwụkwọ.
ONYEISI OCHE ỌMỤMỤ IHE OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ
24. N’izu ọ bụla, otu okenye ga-abụ onyeisi oche n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. (N’ọgbakọ e nwere ndị okenye ole na ole, ohu na-eje ozi ruru eru nwere ike ịbụ onyeisi oche.) Ọ bụ ya ga-akwadebe okwu mmeghe na okwu mmechi ya. Ọ bụkwa ya ga-akpọpụta ndị niile ga-eme ihe omume, ọ bụrụkwa na ndị okenye adịghị ọtụtụ, o nwere ike ime ihe omume ụfọdụ, karịchaa, ihe omume ndị bụ́ ile vidio ndị a na-agaghị ekwu ihe ọ bụla ma e lechaa ha. Mmadụ mechaa ihe omume, o kwesịghị ikwu ọtụtụ okwu tupu ya akpọpụta onye ọzọ. Ọ bụ ndị okenye niile ga-ekpebi okenye ruru eru ịbụ onyeisi oche n’ọmụmụ ihe a. A ga na-ekenye okenye ọ bụla a họpụtara ịbụ onyeisi oche izu nke ọ ga-abụ onyeisi oche. Ọ bụ otú ihe si dịrị n’ọgbakọ ga-ekpebi ma onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ọ̀ ga na-abụ onyeisi oche n’ọmụmụ ihe etiti izu karịa ndị okenye ndị ọzọ ruru eru. Ọ bụrụ na okenye ruru eru iduzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, ọ ga-abụkwa na o ruru eru ịbụ onyeisi oche n’ọmụmụ ihe etiti izu. Ma biko, burunụ n’obi na okenye ga-abụ onyeisi oche ga na-eji obiọma aja ndị mere ihe omume mma, na-emedakwa obi ma o nyewe ụmụ akwụkwọ ndụmọdụ ndị ga-abara ha uru. Ọ bụkwa ya ga-ahụ na a gbasara ọmụmụ ihe n’oge e kwesịrị ịgbasa. (Gụọ paragraf nke 17 na nke 19.) Ọ bụrụ na ohere dị n’ikpo okwu maka idowe maịkrofon ọzọ nke onyeisi oche ga-eji na-akpọpụta ndị na-eme ihe omume, ya abụrụkwa na ọ chọrọ, e nwere ike idowere ya maịkrofon otú ọ ga-abụ, ya jiri ya na-akpọpụta onye ga-eme ihe omume, onye ahụ agaa guzoro na tebụl ikpo okwu na-eche ka o kwuchaa. Ọ bụrụkwa na onyeisi oche ọmụmụ ihe etiti izu chọrọ, e nwere ike idowere ya oche n’ikpo okwu ka ọ nọrọ ọdụ mgbe nwa akwụkwọ na-agụ Baịbụl nakwa mgbe a na-eme ihe omume na Mụtakwuo Izi Ozi Ọma nke Ọma. Ime otú a nwere ike ime ka a ghara igbu oge.
ONYE NA-ENYE NDỤMỌDỤ
25. Ọrụ onye na-enye ndụmọdụ bụ inye ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ndụmọdụ ma e nwee ebe ha kwesịrị imezikwu ihe n’ihe omume ha mere n’Ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, ma ha kwuo okwu ihu ọha, duzie Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ gụọ Ụlọ Nche ma ọ bụ akwụkwọ e ji amụ ihe n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. Mana, ọ gaghị enye ha ndụmọdụ n’ihu ọha.—Gụọ paragraf nke 19.
KLAS ỌZỌ
26. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị na-eme ihe omume ụmụ akwụkwọ, ọgbakọ nwere ike inwe klas ọzọ. Klas ọ bụla kwesịrị inwe onye ruru eru ga na-eduzi ya. Ọ ka mma ka ọ bụrụ okenye. N’ọgbakọ a na-enweghị okenye ga-eduzi ya, ohu na-eje ozi ruru eru nwere ike iduzi ya. Ọ bụ ndị okenye niile ga-ekpebi onye ga na-eduzi klas a. Ọ bụkwa ha ga-ekpebi ma ọ̀ ga-abụ otu onye duzie n’izu a, onye ọzọ eduzie n’izu ọzọ. Onye ga-eduzi ya kwesịrị iso ntụziaka e nyere na paragraf nke 18. Ọ bụrụ na e nwere klas ọzọ, e kwesịrị ịgwa ndị e kenyere ihe omume na klas a ka ha gaa na klas ha ma e mechaa ihe omume bụ́ Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke nke a na-eme n’Akụ̀ Ndị Si n’Okwu Chineke. Ha kwesịrị ịbataghachi ma e mechaa ihe omume ikpeazụ nwa akwụkwọ na-eme n’ọmụmụ ihe etiti izu.
VIDIO
27. E nwere vidio ndị a ga na-ele n’ọmụmụ ihe etiti izu. Vidio ndị a ga na-agba na JW Library. E nwere ike iji kọmputa, tablet, ma ọ bụ ekwentị nweta ha.
© 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
S-38-IB 9/25

