N’OGE ỌZỌ

IHE ỌMỤMỤ NKE 7

Adala Mbà

Adala Mbà

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ha na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma.”​—Ọrụ 5:42.

Ihe Pọl Mere

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Ọrụ Ndịozi 19:8-10. Zazie ajụjụ ndị a:

  1.    Mgbe ụfọdụ ndị megidere Pọl, kama ike ịgwụ ya, olee otú o si nọsie ike na-enyere ndị nwere mmasị aka?

  2.   Ugboro ole ka Pọl gaghachiri kụziere ndị nwere mmasị ihe, oleekwa mgbe o meruru ya?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Pọl?

2. Anyị kwesịrị iwepụta oge, gbaakwa ezigbo mbọ ka anyị nwee ike ịga nletaghachi nakwa ịmalite ọmụmụ Baịbụl.

Na-eme Ka Pọl

3. Dịrị njikere ịga na nke onye ahụ n’oge ga-akara ya mma. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ebe nakwa oge ga-akara ya mma? Olee mgbe ọ ga-enwe ohere ka mụ na ya kwurịta okwu?’ Dịrị njikere ịga leta ya ọ bụrụgodị na oge ọ chọrọ adịghị gị mma.

4. Jụọ ya oge ọ ga-achọ ka gị na ya kwuo ọzọ. I zichaa mmadụ ozi ọma, gbalịa ka gị na ya kwuo oge ị ga-akpọtụrụ ya ọzọ. Gbalịakwa ka ị gaghachi n’oge ahụ.

5. Adala mbà. Adịkwala ngwa iche na onye na-anaghị anọkarị n’ụlọ ma ọ bụ onye na-ejikarị ọrụ n’aka enweghị mmasị. (1 Kọr. 13:4, 7) Kama, na-agba mbọ ka ị hụ ya. Ma, gbalịsie ike iji oge gị na-eme ihe ga-akacha baa uru.​—1 Kọr. 9:26.