NDỊ NA-ETO ETO

Ụlọ Akwụkwọ

Igbo
Ụlọ Akwụkwọ
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1011748/univ/wpub/1011748_univ_sqr_xl.jpg

Ụlọ Akwụkwọ

Ihe ndị ị na-eme n’ụlọ akwụkwọ ga-egosi ma ị̀ na-eche echiche nke ọma, ma obi ọ̀ ga-eruli gị ala, gị ana-enwe obi ụtọ nakwa ma ị̀ ga na-eme ihe dị Chineke mma. Olee otú ị ga-esi na-eme nke ọma ka ị na-aga akwụkwọ, ike agharakwa ịgwụkasị gị ahụ́?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mụ na Onye Nkụzi M Dịrị ná Mma?

Ọ bụrụ na ihe anaghị adabara gị na onye nkụzi unu, o nwere ihe ndị ị ga-eme ka obi ghara ịna-ajọ gị njọ oge niile ị na-agụ akwụkwọ. Lee ihe ndị i nwere ike ime.

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ike Ịga Akwụkwọ Agwụla M?

Ọ bụrụ na ike ịga akwụkwọ agwụla gị, echela na ọ bụ naanị gị ka ọ gwụrụ. Chọpụta ihe i nwere ike ime ka i lewe agụmakwụkwọ anya otú kwesịrị ekwesị.

Gịnị Ka M Ga-eme Ma A Chọwa M Okwu?

Ọtụtụ ndị a na-achọ okwu chere na e nweghị onye ga-enyere ha aka. Isiokwu a kọwara ihe i nwere ike ime ma mmadụ chọwa gị okwu.

Gịnị Ga-enyere M Aka Idi Okwu A Na-achọ M?

E nwere ike ị gaghị emeli ka a kwụsị ịchọ gị okwu, ma i nwere ike ikpebi ihe ị ga-eme ma a chọọ gị okwu.

Otú Ị Ga-esi Emeri Onye Na-achọ Gị Okwu n’Emetụghị Ya Aka

Lee ihe mere ndị mmadụ ji achọ okwu na ihe ị ga-eme ma a chọọ gị okwu.

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Amụ Asụsụ Ọzọ?

Gịnị mere o ji esi ike? Oleekwa uru ọ bara?

Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịmụta Asụsụ Ọzọ

Ị chọọ ịmụta asụsụ ọzọ, ị ga-ewepụta oge, tinye mgbalị, na-amụchi ya anya. Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịhazi otú ị ga-esi amụta asụsụ ọzọ.

È Nwere Onye Kere Ihe Niile Ka Ọ̀ Bụ na E Nweghị?—Agba nke Mbụ:Olee Ihe Mere Ị Ga-eji Kwere na Chineke Dị?

Ị̀ ga-achọ ka obi sikwuo gị ike ma ị gwawa mmadụ ihe mere i ji kwere na Chineke? Gụọ ihe i nwere ike ịza onye jụrụ gị ihe mere i ji kwere na Chineke.