NDỊ NA-ETO ETO

Ihe E Ji Mara Gị

Igbo
Ihe E Ji Mara Gị
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1011745/univ/wpub/1011745_univ_sqr_xl.jpg

Ihe E Ji Mara Gị

Ònye ka ị bụ? Olee ihe ndị i ji kpọrọ ihe? Ịmata ihe ndị a banyere onwe gị ga-enyere gị aka iji aka gị na-ekpebi ihe ndị ị ga-eji ndụ gị na-eme kama ịhapụ ka ọ bụrụ ndị ọzọ ga na-agwa gị ihe ị ga-eme.

My Character

Olee Ụdị Onye M Bụ?

Ịmata ihe ndị ị ga-emeli, ihe ndị ị na-anaghị emeta na ihe ndị ị chọrọ ime ga-enyere gị aka ma e nyewe gị nsogbu ka i mee ihe ọjọọ.

Ònye Ka M Bụ?

Ịmata azịza ajụjụ a ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị na-abịara gị.

Gịnị Mere O Ji Dị́ Mma Ịna-akwụwa Aka Ọtọ?

Ọ̀ bụ na ihe anaghị agaziiri ndị na-anaghị akwụwa aka ọtọ?

Gịnị Mere na I Kwesịghị Ịna-agha Ụgha?

Ị̀ kwesịrị ịgha ụgha ka ihe wee gaara gị nke ọma? Jiri aka gị chọpụta ihe mere ikwu eziokwu ji baa uru.

Ị̀ Na-akwụwa Aka Ọtọ?

Jiri ajụjụ atọ a chọpụta ma ị̀ na-akwụwa aka ọtọ.

Àbụ M A Kwaa A Kwụrụ?

Ebe ọ bụ na a naghị agbata nsogbu ụwa n’ọsọ, ọ dị mkpa na ị ga-amụta ịbụ a kwaa a kwụrụ, ụdị nsogbu ọ sọkwara ya bịara gị, ma ọ̀ dị nnukwu ma ọ̀ dị obere.

Ihe Ị Ga-eme ma Ihe Gbanweere Gị

Ihe nwere ike ịgbanwere onye ọ bụla n’ime anyị. Gụọ isiokwu a ka ị hụ ihe nyeere ụfọdụ ndị aka mgbe ihe gbanweere ha.

Ihe Ị Ga-eme ma A Dụọ Gị Ọdụ

Olee otú mba a baara gị ya ewee gị iwe nwere ike isi baara gị uru?

Gịnị Bụ Ịkpọasị?

Kemgbe ụwa ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị. Si na Baịbụl mụta ihe ị ga-eme ka ị ghara ịna-akpọ ndị ọzọ asị.

Mmadụ Ịna-agba Mbọ Ka A Mara Ya Amara n’Ịntanet Ọ̀ Bara Uru?

Ụfọdụ ndị na-eme ihe nwere ike ịta isi ha naanị ka ha nwee ọtụtụ ndị na-achọ ịhụ ihe ndị ha na-etinye n’Ịntanet ma ọ bụ ọtụtụ ndị ihe ha tinyere na-amasị. Ịbụ onye a ma ama n’Ịntanet ò ruru ịgbara ụdị mbọ a?

Otú Ị Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ Gị Na-enye Gị

Ndị ọgbọ anyị nwere ike ime ka anyị mewe ihe na-adịghị mma. Gịnị ka i kwesịrị ịma banyere ya, olee otú ị ga-esi merie ya?

Olee Ihe M Ga-eme Ka Ndị Ọgbọ M Ghara Ịnwata M Ime Ihe Na-adịghị Mma?

Chọpụta otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka.

Ekwela Ka Ndị Ọgbọ Gị Rafuo Gị

E nwere ihe anọ ga-enyere gị aka ịna-ekpebi ihe n’onwe gị kama ịna-eme ihe naanị maka na ndị ọgbọ gị sị gị mee ya.

Kwụsie Ike n’Ihe Ị Ma Bụ́ Eziokwu!

Chọpụta ihe nyeere Jeremaya aka ịdọ ndị Juda aka ná ntị.

Olee Otú M Ga-esi Họrọ Onye Na-eme Nke Ọma M Ga Na-eme Ka Ya?

Inwe onye ị na-eme ka ya nwere ike ime ka i zere nsogbu, nyere gị aka ime ihe ndị i bu n’obi ime, meekwa ka ihe gaziere gị ná ndụ. Ma olee onye i kwesịrị ịna-eme ka ya?

My Actions

Gịnị Mere M Ga-eji Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma?

E nwere ụzọ abụọ imere ndị ọzọ ihe ọma ga-esi baara gị uru. Olee ụzọ abụọ ọ bụ?

Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma M Mejọọ Ihe?

Onye ọ bụla na-emejọ ihe, ma ọ bụghị onye ọ bụla na-esi n’ihe o mejọrọ mụta ihe.

Olee Otú M Ga-esi Na-emeri Ọnwụnwa?

Chọpụta ihe atọ dị mkpa ga-enyere gị aka ka ị ghara ime ihe ọjọọ nwere ike ịgụ gị agụụ.

Otú Ị Ga-esi Na-ezere Ọnwụnwa

Onye ọ bụla kwesịrị ịna-ezere ọnwụnwa. Gụọ ihe isii ga-enyere gị aka ịma otú ị ga-esi na-ezere ọnwụnwa.

My Appearance

Efe M Yi Ọ̀ Dị Mma?

Mụta otú ị ga-esi zere ihe atọ na-adịghị mma ndị mmadụ na-eme gbasara ejiji.

Ilerukwu Onwe Gị Anya

Akwụkwọ a e ji edetu ihe nwere ike inyere gị aka ịmata otú ị ga-esi na-eji ejiji dị́ mma.

Ihe Ndị Na-eto Eto Kwuru Gbasara Otú Mmadụ Dị

Gịnị mere o ji esiri ndị na-eto eto ike ịnabata otú ahụ́ ha dị? Gịnị ga-enyere ha aka?

Gịnị Mere M Ji Echegbu Onwe M Maka Otú M Dị?

Mụta otú ị ga-esi na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.

Gịnị Mere Otú M Dị Ji Echu M Ụra?

Obi ọ̀ na-ajọ gị njọ ma i lee onwe gị n’enyo? Olee ihe ndị i nwere ike ime ka ị dịkwuo mma nanya?

M̀ Kwesịrị Igbu Egbugbu n’Ahụ́?

Olee ihe ga-enyere gị aka ikpebi ihe dị mma ị ga-eme?

Chee Echiche Tupu I Gbuo Egbugbu n’Ahụ́

Mmadụ ide ihe dị́ na Baịbụl n’ahụ́ ya ọ̀ dị mma?