NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Ahụ́ Adịghị Mama M ma Ọ Bụ Papa M?
Ihe gbasara ilekọta ndị ahụ́ na-adịghị anaghị echu ọtụtụ ndị na-eto eto ụra. A sị ka e kwuwe, o nwere ike iwe ọtụtụ afọ tupu mama ha ma ọ bụ papa ha arịawa ahụ́.
Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụkwanụ na mama gị ma ọ bụ papa gị amalite ịrịa ahụ́ mgbe ị ka na-eto eto? Lee ihe ndị na-eto eto abụọ ụdị ihe a mere kwuru.
Akụkọ Emmaline
Mama m na-arịa otu ọrịa a na-akpọ Ehlers-Danlos syndrome (EDS). Ọrịa a na-enye nsogbu n’ọkpụkpụ, n’anụ ahụ́, nakwa n’akwara.
E nweghị ọgwụ e ji agwọ ụdị ọrịa ahụ, o meekwala ka ahụ́ mama m ka njọ kemgbe afọ iri gara aga. O nwedịrị mgbe ọ na-afọ obere ka ọ nwụọ n’ihi na ọbara adịghị ya n’ahụ́, nweekwa mgbe ụdị ụfụ ọ na-afụ ya na eme ka ọ dị ya ka ya nwụọ.
Anyị bụ Ndịàmà Jehova, ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ na-enyekwara anyị ezigbo aka. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya, otu nwata nwaanyị mụ na ya nwere ike ịbụ ọgbọ, ziteere ndị ezinụlọ anyị ọmarịcha kaadị iji gwa anyị na ọ hụrụ anyị n’anya na iji gwa anyị na ọ ga na-enyere anyị aka. Obi dị m ụtọ na m nwere enyi dị ka ya.
Baịbụl enyekwarala m ezigbo aka. Dị ka ihe atụ, amaokwu kacha amasị m bụ Abụ Ọma 34:18, ebe sịrị: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso.” Amaokwu ọzọ na-amasịkwa m bụ Ndị Hibru 13:6, bụ́ ebe sịrị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu.”
Ọ bụ amaokwu ikpeazụ a kacha abara m uru. Ihe kacha atụ m egwu bụ na mama m ga-anwụnahụ m. M hụrụ ya n’anya nke ukwuu, obi na-adịkwa m mma ụbọchị ọ bụla ma mụ na ya nọrọ. Amaokwu Baịbụl ahụ mere ka obi sie m ike na mụ ekwesịghị ịna-atụ ụjọ ọdịnihu n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịanụ.
Ma e nwere ihe ọzọ na-atụ m egwu. Ihe ahụ bụ na ọrịa a mama m na-arịa si n’ọbara. Mama m butere ya n’aka mama ya, mụnwa ebutekwa ya n’aka mama m. N’eziokwu, mụnwa na-arịakwa ọrịa ahụ mama m na-arịa. Ma Ndị Hibru 13:6 emeela ka obi sie m ike na Jehova bụ onye ga “na-enyere m aka” n’ọrịa a m na-arịa.
Ka ọ dịgodi, m na-agbalị ka ihe ndị m nwere ugbu a na-eme m obi ụtọ. Anaghịkwa m eche gbasara ihe ndị mere m ma ọ bụ na-echegbu onwe m maka ọdịnihu. Ike ga-agwụ m ma m chewe ihe ndị mama m na-emelibu na ihe ndị ọ na-anaghị emelizi ugbu a. Baịbụl kwuru na ọnwụnwa ndị na-abịara anyị “na-adịru nwa oge, dịkwa mfe” ma e jiri ya tụnyere olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi na-arịaghịzi ọrịa.—2 Ndị Kọrịnt 4:17; Mkpughe 21:1-4.
Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị nyeere Emmaline aka ịna-enwe obi ụtọ? Olee ihe ị ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ mgbe nsogbu bịaara gị?
Akụkọ Emily
Mgbe m na-aga ụlọ akwụkwọ sekọndrị bụ mgbe mbụ papa m dara mba n’obi. Ọ dị m ka ọ bụghị papa m ahụ m mabu ka m na-ahụzi. Kemgbe ahụ, obi ọjọọ, egwu na nchekasị bụ ihe ya na ya na-alụ mgbe niile. Ọ rịala ọrịa a afọ iri na ise. Ama m na ọ dịghịrị ya mfe idi obi na-ajọ ya ezigbo njọ n’agbanyeghị na ọ ma na e nweghị ezigbo ihe mere obi ji kwesị ịna-ajọ ya njọ.
Anyị bụ Ndịàmà Jehova, ndị ọgbakọ anyị na-enyekwara anyị ezigbo aka. Ụmụnna anyị ndị ahụ nwere obiọma, ha na-aghọtakwa otú ihe si dịrị anyị. E nwebeghị onye mere ka papa m chee na o nweghị uru ọ bara n’ọgbakọ. Otú papa m si edi ọnwụnwa a bịaara ya mere ka m hụkwuo ya n’anya.
Ọ dị m ka papa m ahụ na-anaghị echegbu onwe ya, ọrịa na-ejighị, na-enwekwa obi ụtọ lọghachi, dịrịkwa otú ọ dị na mbụ. Ọ na-ewute m nke ukwuu na papa m ga na-alụso ọrịa a a na-anaghị ahụ anya ọgụ kwa ụbọchị.
N’agbanyeghị ihe a ya na papa m na-alụ, ọ na-agbalị na-enwe obi ụtọ. N’oge na-adịbeghị anya ọrịa ahụ ji ya aka ọjọọ, ọ gbalịrị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ọ bụrụgodị na ọ bụ amaokwu ole na ole. Ọ bụ ihe nyeere ya ezigbo aka inwe obi ike. Baịbụl ahụ ọ na-agụ, e nwere ike ịsị na ọ bụ obere ihe, zọrọ ya ndụ. Ihe papa m mere mgbe ahụ tọgburu m atọgbu.
Ihe e dere na Nehemaya 8:10 na-atọ m ụtọ. Ebe ahụ sịrị: “Ọṅụ Jehova bụ ebe unu e wusiri ike.” Ọ bụ nnọọ eziokwu. Oṅụ m na-enwe ma mụ na ụmụnna m nọrọ, ma m gaa ọmụmụ ihe, zaa ajụjụ ma ọ bụ mee ihe omume, na-eme ka m chefuo ihe ndị ahụ na-ewute m. Ọ na-eme ka obi dị m mma ụbọchị ahụ niile. Ihe a ya na papa m na-alụ akụzierela m na Jehova ga na-enyere anyị aka n’agbanyeghị ụdị nsogbu ọ bụla bịaara anyị.
Ihe ị ga-echebara echiche: Olee otú Emily si nyere papa ya aka n’ọrịa ya? Olee otú i nwere ike isi nyere onye dara mba n’obi aka?