NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka?—Nke 1: Na-agụ Baịbụl Gị
“Agbaala m mbọ ka m bido ịgụ Baịbụl. Ma m lechaa otú ọ hà, ike agwụ m.”—Briana, ọ dị afọ 15.
Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka.
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agụ Baịbụl?
E kwute okwu ịgụ Baịbụl, ọ̀ na-agwụ gị ike? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị ghọtara. O nwere ike ịbụ na ị na-echeta na Baịbụl buru ezigbo ibu, na mkpụrụ akwụkwọ ya dị ntakịrị, nakwa na e nweghị foto dị na ya. Ọ dịghịkwa ụtọ ka ile tiivi ma ọ bụ fim.
Mana, weregodị ya na ị hụrụ otu igbe oge ochie buru ezigbo ibu nke akụ̀ dị iche iche bara ezigbo uru juru n’ime ya. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịma ihe dị ya n’ime?
Baịbụl dị nnọọ ka igbe ahụ akụ̀ juru n’ime ya. Ihe ndị e dere na ya dị ka akụ̀. Ha ga-enyere gị aka
Ime mkpebi ndị dị mma
Ka gị na ndị mụrụ gị na-ebi n’udo
Imeta ezi ndị enyi
Ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị
Gịnị mere akwụkwọ a e dere n’oge ochie ji baa ezigbo uru otú a n’oge anyị? Ọ bụ maka na “ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) Ọ pụtara na ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl si n’aka Onye kacha mara ihe.
Olee otú m kwesịrị isi na-agụ Baịbụl?
Nke mbụ bụ ịgbalị gụọ Baịbụl, si n’isi ruo ná ngwụcha. Ọ ga-eme ka ị mata isi ihe Baịbụl na-ekwu. E nwere ọtụtụ ụzọ i nwere ike isi gụọ Baịbụl. Lee abụọ n’ime ha:
I nwere ike ịgụ akwụkwọ iri isii na isii dị na Baịbụl n’usoro ha si dị, ya bụ, malite na Jenesis ruo ná Mkpughe.
I nwere ike ịgụ Baịbụl n’usoro ihe ndị a kọrọ na ya si mee.
Ihe ga-enyere gị aka: Ị gaa na A7 na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, ị ga-ahụ ebe e depụtara ihe ndị mere ná ndụ Jizọs mgbe ọ nọ n’ụwa n’usoro ha si mee.
Ụzọ nke abụọ i nwere ike isi gụọ Baịbụl bụ ịgụ akụkọ kwuru gbasara ihe bụ́ mkpa gị ná ndụ. Dị ka ihe atụ:
Ị̀ ga-achọ imeta ndị enyi ị ga-atụkwasili obi? Gụọ akụkọ gbasara Jonatan na Devid. (1 Samuel isi nke 18-20) Ị gụchaa ya, mee ihe ndị e dere n’isiokwu bụ́ “Otú Ị Ga-esi Emeta Ezigbo Ndị Enyi,” ọ ga-enyere gị aka ịmụta ihe n’akụkọ ahụ.
Ị̀ chọrọ ka okwukwe gị sikwuo ike iji merie ọnwụnwa ndị na-abịara gị? Gụọ gbasara otú Josef si merie ọnwụnwa bịaara ya. (Jenesis, isi nke 39) Ị gụchaa ya, mee ihe ndị e dere n’isiokwu bụ́ “Otú Ị Ga-esi Merie Ọnwụnwa . . . Josef—Agba nke Mbụ” na “E Boro Ya Ebubo Ụgha! Josef—Agba nke Abụọ.” Isiokwu abụọ ahụ ga-enyere gị aka ịmụta ihe n’akụkọ ahụ.
Ị̀ ga-achọ ịmata otú ekpere nwere ike isi nyere gị aka? Gụọ akụkọ gbasra Nehemaya. (Nehemaya isi nke 1 na isi nke 2) Ka ị na-agụ ya, chọpụta ihe gosiri na ekpere ahụ Nehemaya kpere nyeere ya aka.
Ihe ga-enyere gị aka: Ị gụwa Baịbụl, nọrọ ebe ụzụ na-adịghị ka a ghara inwe ihe ga-eme ka uche gị pụọ n’ihe ị na-agụ.
Ụzọ nke atọ i nwere ike isi gụọ Baịbụl bụ ịhọrọ otu akụkọ Baịbụl ma ọ bụkwanụ otu ebe n’abụ ọma. Ị gụchaa ya, gị echee otú o si gbasa gị. Jụọkwa onwe gị ajụjụ ndị a:
Gịnị mere Jehova ji hụ na e denyere akụkọ a na Baịbụl?
Gịnị ka ọ na-egosi banyere ụdị onye Jehova bụ ma ọ bụ otú o si eme ihe?
Olee otú m ga-esi eme ihe a m mụtara?
Ihe ga-enyere gị aka: Kpebie na ị ga na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Dee ụbọchị ị ga-achọ ịmalite ma jiri Usoro Ọgụgụ Baịbụl nke dị na jw.org na-agụ ya.