NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Ọ̀ Dị Njọ Nwoke Idina Nwoke ma Ọ Bụ Nwaanyị Idina Nwaanyị?

Ọ̀ Dị Njọ Nwoke Idina Nwoke ma Ọ Bụ Nwaanyị Idina Nwaanyị?

 “Mgbe m na-eto eto, ọ na-agụ m agụụ ka mụ na ụmụ nwoke ibe m na-edina. O so n’ihe ndị kacha bụụrụ m nsogbu. M nọ na-eche na e nwere ebe m ga-etoru, ụdị ihe ahụ akwụsị ịgụ m agụụ. Ma, ọ ka na-agụ m agụụ ruo ugbu a.”​—David, ọ dị afọ 23.

 David bụ Onye Kraịst chọrọ ịna-eme ihe dị Chineke mma. Ma, ò nwere ike ịna-eme ihe dị Chineke mma n’agbanyeghị na ọ na-agụ ya agụụ ka ya na ụmụ nwoke ibe ya nwee mmekọahụ? Olee otú Chineke si ele nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị anya?

 Gịnị ka Baịbụl kwuru?

 Otú ndị mmadụ si ele nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị anya na-adị iche iche n’ihi omenala obodo ha ma ọ bụ oge ha dịrị ndụ. Ma, ọ bụghị otú ọtụtụ ndị si ele ihe anya na-ekwu otú Ndị Kraịst ga-esi na-ele ihe anya, ha anaghịkwa ekwere ihe ọ bụla ndị mmadụ na-akụzi. (Ndị Efesọs 4:14) Kama, ọ bụ ihe Baịbụl kwuru na-ekpebi otú ha si ele nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị anya, ọ bụkwa ya na-ekpebi otú ha si ele ihe ọ bụla ọzọ anya.

 Ihe Baịbụl kwuru banyere nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị doro anya. Okwu Chineke sịrị:

  •  “Gị na nwoke ibe gị enwela mmekọahụ.”​—Levitikọs 18:22.

  •  “Ebe ọ bụ na ha chọrọ ime ihe dị ha n’obi, Chineke hapụrụ ha ka . . . agụụ mmekọahụ na-eme ihere na-agụ ha. Ụmụ nwaanyị ha hapụrụ mmekọahụ nwoke na nwaanyị, ha na ụmụ nwaanyị ibe ha ana-enwezi mmekọahụ.”​—Ndị Rom 1:24, 26.

  •  “Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko, ndị na-ekpere arụsị, ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-akwa iko, ndị na-ekwe ka ụmụ nwoke ibe ha dinaa ha, ndị na-edina ụmụ nwoke ibe ha, ndị ohi, ndị anyaukwu, ndị aṅụrụma, ndị na-ekwujọ mmadụ, nakwa ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa Alaeze Chineke.”​—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

 N’eziokwu, Chineke chọrọ ka mmadụ niile na-eme ihe o kwuru, ma ndị ọ na-agụ agụụ ka ha na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwee mmekọahụ, ma ndị ọ na-agụ agụụ ka ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwee mmekọahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye ọ bụla kwesịrị ịna-ejide onwe ya mgbe ọ bụla ime ihe na-adịghị Chineke mma gụwara ya.​—Ndị Kọlọsi 3:5.

 Ọ̀ pụtara na . . . ?

 Ọ̀ pụtara na Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịkpọ nwoke na-edina nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị na-edina nwaanyị ibe ya asị?

 Mba. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl ekwughị ka anyị kpọọ onye ọ bụla asị, ma onye ahụ ọ̀ na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ma ọ bụ na ọ naghị edina. Kama, ọ gwara anyị ka anyị ‘na-agba mbọ ka anyị na mmadụ niile na-adị n’udo,’ n’agbanyeghị ụdị ndụ ha na-ebi. (Ndị Hibru 12:14) N’ihi ya, ọ dịghị mma ịna-achọ ndị na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha okwu, ịna-arụsa ha arụrụala, ma ọ bụ si otú ọ bụla ọzọ na-emegbu ha.

 Ọ̀ pụtara na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-agba iwu gọọmenti ndị kwuru na nwoke nwere ike ịlụ nwoke ma ọ bụ na nwaanyị nwere ike ịlụ nwaanyị ụkwụ?

 Baịbụl kwuru na otú Chineke si hazie alụmdi na nwunye bụ na otu nwoke kwesịrị ịlụ otu nwaanyị. (Matiu 19:4-6) Ma, ndị ọchịchị lebawa anya n’iwu ha ga-eti gbasara nwoke ịlụ nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ịlụ nwaanyị ibe ya, ihe na-abụ mkpa ha bụ ihe ga-abara ha uru na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụghị ma ọ̀ bụ ihe dị mma ka ọ̀ bụ ihe na-adịghị mma. Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha ghara itinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 18:36) N’ihi ya, gọọmenti tie iwu gbasara nwoke ịlụ nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ịlụ nwaanyị ibe ya ma ọ bụ gbasara nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị idina, Ndị Kraịst anaghị adụnyere ha ukwu ma ọ bụ na-agba ya ụkwụ.

 Ma, ọ bụrụkwanụ na . . . ?

 Ma, ọ bụrụkwanụ na mmadụ na-edina nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya? Onye ahụ ọ̀ ga-akwụsịli ya?

 Ee. Ụfọdụ ndị n’oge ndị ozi kwụsịrị ya. Mgbe Baịbụl kwuchara na ndị na-edina nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha agaghị eketa Alaeze Chineke, ọ sịrị: “Ụfọdụ n’ime unu na-akpabu àgwà ndị a.”​—1 Ndị Kọrịnt 6:11.

 Ọ bụrụ na mmadụ akwụsị àgwà a, ọ̀ pụtara na e nweghịzi mgbe agụụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ga-agụ ya ọzọ otú ọ na-agụbu ya? Mba. Baịbụl kwuru, sị: “Yirinụ àgwà ọhụrụ, nke Chineke na-eme ka anyị na-akpa ma anyị mata ya nke ọma. Ọ bụ ya ga-eme ka àgwà anyị na-agbanwe.” (Ndị Kọlọsi 3:10) Mmadụ anaghị agbanwe otu ugboro, ọ bụ ihe a na-eji nwayọọ nwayọọ eme.

 Ma, ọ bụrụkwanụ na mmadụ chọrọ ịna-eme ihe Chineke chọrọ, ma agụụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya a ka na-agụ?

 Ọ bụ mmadụ ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-anọ na-eche gbasara ihe na-agụ ya agụụ na otú ọ ga-esi enweta ya ka ọ̀ ga-akwụsị iche gbasara ihe ahụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị n’okwu a. Gịnị mere anyị ji kwuo ihe a? Baịbụl kwuru, sị: “Na-ekwenụ ka mmụọ nsọ na-edu unu, unu agaghịkwa eme ihe ọ bụla na-agụ ahụ́ unu agụụ.”​—Ndị Galeshia 5:16.

 Ị̀ chọpụtara na amaokwu a ekwughị na e nweghị ihe ga-agụ ahụ́ mmadụ agụụ? Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na mmadụ ga-enweta ike ọ ga-eji merie ihe na-agụ ya agụụ ma ọ na-emechi ihe ndị gbasara ofufe Chineke anya, dị ka ịmụ Baịbụl na ikpe ekpere.

 David e kwuru gbasara ya ná mmalite isiokwu a chọpụtara na ihe a bụ eziokwu, karịchaa mgbe ọ kọọrọ nne na nna ya bụ́ Ndị Kraịst ihe ya na ya na-alụ. O kwuru, sị: “Ọ dị nnọọ ka e bupụụrụ m nnukwu ibu na-anyịgbu m. A sị na m kọọrọ papa m na mama m nsogbu m n’oge, m gaara enwe obi ụtọ oge m na-eto eto karịa otú m nwere.”

 N’eziokwu, anyị na-aka enwe obi ụtọ ma anyị na-edebe iwu Jehova nyere. Obi siri anyị ike na iwu ya niile ‘ziri ezi, na-emekwa ka obi ṅụrịa ọṅụ.’ Obi sikwara anyị ike na “onye na-edebe ha na-enweta ụgwọ ọrụ buru ibu.”​—Abụ Ọma 19:8, 11.