NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mụ na Onye Nkụzi M Dịrị ná Mma?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mụ na Onye Nkụzi M Dịrị ná Mma?

 Ndị nkụzi obi ọjọọ

 Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ụmụ akwụkwọ niile nwere onye nkụzi ha chere na ọ na-emesi ha ike, na ọ na-anaghị ekwe ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko, ma ọ bụ na ọ dị obi ọjọọ.

  •   Luis, nwa okorobịa dị afọ 21 kwuru, sị: “N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nwere otu onye nkụzi na-agwakarị ụmụ akwụkwọ okwu ọjọọ, ọ naghịkwa akwanyere ha ùgwù. O nwere ike ịbụ na o chere na a gaghị achụ ya n’ọrụ ebe ọ bụ na ọ fọrọ obere ka ọ laa ezumike nká.”

  •   Melanie, nwa agbọghọ dị afọ 25, ka na-echeta otú onye nkụzi ha si emeso ya ihe otú dị iche n’otu o si emeso ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ. Melanie kwuru, sị: “Onye nkụzi anyị ahụ kwuru na ihe mere na ya anaghị ekwe m ṅụrụ mmiri tọgbọ iko bụ na anaghị m aga chọọchị ọtụtụ ndị na-aga. O kwukwara na otú ahụ o si emeso m ga-eme ka imesi m ike ghara ịbụrụ m nsogbu mgbe m ga-eto n’ihi na ọ marala m ahụ́.”

 Ọ bụrụ na ihe anaghị adabara gị na onye nkụzi unu, o nwere ihe ndị ị ga-eme ka obi ghara ịna-ajọ gị njọ oge niile ị na-agụ akwụkwọ. Lee ihe ndị i nwere ike ime.

 Ihe ndị i nwere ike ime

  •   Dịrị njikere ịna-eme ihe onye nkụzi gị nke ọ bụla chọrọ. Ihe otu onye nkụzi na-achọ ka ụmụ akwụkwọ ya na-eme na-adị iche n’ihe onye nkụzi ọzọ na-achọ ka ha na-eme. Gbaa mbọ chọpụta ihe onye nkụzi ọ bụla chọrọ ka ị na-eme, gbalịakwa na-eme ya.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ma ihe na-ege ntị ka ọ mụtakwuo ihe.”​—Ilu 1:5.

     “M chọpụtara na m kwesịrị ịna-eme ihe otú na-amasị onye nkụzi m, n’ihi ya, m na-eme ike m niile ime ihe ndị o kwuru ka e mee, otú ọ chọrọ ka e si mee ha. Ihe a mere ka ihe na-adabara mụ na ya.”​—Christopher

  •   Na-akwanyere ndị nkụzi gị ùgwù. Gbalịa jiri olu ọma na-agwa ndị nkụzi gị okwu. Ọ bụrụgodị na ha agwa gị okwu otú na-adịghị mma, asakwala ha okwu. Cheta na ha na-ele gị anya na ị bụ nwa akwụkwọ ha, ọ bụghị ọgbọ ha.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ka okwu unu na-atọ ụtọ mgbe niile ka ihe e tinyere nnu. Ọ ga-eme ka unu mara otú unu ga-esi azaghachi onye ọ bụla.”​—Ndị Kọlọsi 4:6.

     “Ị gbaa mbọ na-akwanyere ndị nkụzi unu ùgwù, ha ga na-emeso gị otú dị mma n’ihi na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ anaghị akwanyere ha ùgwù.”​—Ciara

  •   Na-aghọta ndị nkụzi gị. Ndị nkụzi bụkwa mmadụ otú ahụ ụmụ akwụkwọ bụ. N’ihi ya, otú ahụ ndị ọzọ nwere ọtụtụ ihe ha na-eme na ihe ndị na-echegbu ha ka hanwa nwekwara. N’ihi ya, ekwula ngwa ngwa na onye nkụzi gị dị obi ọjọọ ma ọ bụ na ọ kpọrọ gị asị.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Anyị niile na-emejọ ihe.”​—Jems 3:2.

     “Ọrụ nkụzi adịghị mfe. Ịchịkọta ọtụtụ ụmụaka ka ha nọrọ jii ka e nwee ike kụziere ha ihe abụghị obere ọrụ. N’ihi ya, m na-agwa onwe m na m na-akpa ezigbo àgwà, ọ ga-ebelatara onye nkụzi anyị ọrụ o nwere.”​—Alexis

  •    Gwa papa gị na mama gị gbasara ya. Ndị kacha achọ ka ihe gaziere gị bụ nne na nna gị. Ha chọrọ ka ị na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ha nwekwara ike ịgwa gị ihe ị ga-eme ka ihe na-adabara gị na ndị nkụzi ọ na-esi ike imete mma.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu.”​—Ilu 15:22.

     “Idozi nsogbu dị iche iche doro ndị nne na nna anya karịa ndị na-eto eto. N’ihi ya, nabata ndụmọdụ ha. O nwere ike inyere gị aka imeri nsogbu ndị ị na-enwe.”​—Olivia

 Otú gị na onye nkụzi gị nwere ike isi kwurịta okwu

 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka ị gakwuru onye nkụzi unu ka gị na ya kwurịta nsogbu ahụ unu na-enwe. Echegbula onwe gị ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị na olu unu ga-alawa elu. Cheta na ihe ị na-aga abụghị ka unu rụwa ụka, kama ọ bụ ka unu kwurịta okwu. O nwere ike iju gị anya na ọ bụ otú dị mfe isi edozi okwu unu.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Ka anyị na-eme ihe ọ bụla anyị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo.”​—Ndị Rom 14:19.

 “Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ọ bụ naanị gị ka onye nkụzi ahụ na-akpaso àgwà na-adịghị mma, jụọ ya ma ò nwere ihe i mere ya na-ewe ya iwe. Ihe ọ zara gị ga-enyere gị aka ịma ebe ị ga-emezikwu.”​—Juliana

 “O nwere ike ịkacha mma ka i meda obi gwa onye nkụzi unu otú obi dị gị mgbe naanị gị na ya nọ, i nwere ike ime ya tupu akwụkwọ amalite ma ọ bụ mgbe a gbasara. O nwere ike ichebara okwu ahụ echiche ma nwee obi ụtọ maka otú i si bịakwute ya ka unu kwurịta nsogbu ahụ.”​—Benjamin

 IHE MERE EME

 “O nwere oge m na-anaghị eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, onye nkụzi anyị enyekwaraghị m aka ọ bụla. M chọdịrị ịkwụsị ịga akwụkwọ n’ihi na otú o si na-emeso m ihe mere ka ike ịga akwụkwọ gwụ m.

 “M gakwuuru onye nkụzi ọzọ ma kọọrọ ya nsogbu a ka ọ tụọrọ m aro ihe m ga-eme. Ọ gwara m, sị: ‘Ọ machaghị gị nke ọma, gịnwa amachaghịkwa ya. I kwesịrị ịga gwa ya ihe bụ́ nsogbu gị. O nwedịrị ike ime ka ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ ụjọ na-atụ ịga ka ha na ya kwurịta okwu kwụsị ịtụ ụjọ.’

 “Achọbughị m ime ihe ahụ ọ gwara m. Ma, mgbe m chebaara ya echiche, m hụrụ na ọ bụ ihe m kwesịrị ime. Ọ bụrụ na m chọrọ ka ihe gbanwee, m kwesịrị ibute ụzọ n’ihe ọ bụla a ga-eme ka ọ gbanwee.

 “N’echi ya, m gakwuuru onye nkụzi ahụ wetuo obi gwa ya na otú o si akụzi ihe na-amasị m nakwa na m chọrọ ịna-aghọta ihe ọ na-akụzi nke ọma. Mana na amaghị m ihe m ga-eme n’ihi na ịghọta ya na-esiri m ike. Ọ gwara m ihe ụfọdụ m nwere ike ime, wepụtakwa oge ya ịna-enyere m aka ma a gbasaa akwụkwọ ma ọ bụ ịna-ezitere m ihe ndị ga-enyere m aka n’ozi iimel.

 “Ihe a juru m ezigbo anya. Mkparịta ụka ahụ mere ka mụ na onye nkụzi ahụ dịrị ná mma, ịga akwụkwọ atọwakwa m ụtọ.”​—Maria

 Ihe i nwere ike ime: Ọ bụrụ na e nwere onye nkụzi ihe na-anaghị adabachara gị na ya, were ya na ị ga-esi na ya mụta ihe ga-enyere gị aka ma i too. Katie bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 22 kwuru, sị: “Ọ bụrụgodị na ị gụchaa akwụkwọ, a ka ga-enwe ndị gị na ha ga-emekọ ihe ọkwá ha gbagotere, ndị ihe na-agaghị adabachara gị na ha. Ọ bụrụ na i mere ka ihe dabawara gị na onye nkụzi ihe na-anaghị adababuru gị na ya, ị ga-amali otú ị ga-esi mee ka ihe dabawara gị na onye ọ bụla ọzọ n’ọdịnihu.”