Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Egwuregwu?

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Egwuregwu?

 Egwuregwu nwere ike ịbara gị uru ma ọ bụ kpatara gị nsogbu. Ọ bụ ụdị egwuregwu ị na-egwu, otú i si egwu ya nakwa awa ole i ji egwu ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-abara gị uru.

 Olee uru egwuregwu bara?

 Egwuregwu na-eme ka ahụ́ gbasie mmadụ ike. Baịbụl kwuru na ‘ọzụzụ nke ahụ́ bara uru.’ (1 Timoti 4:8) Otu nwa okorobịa aha ya bụ Ryan kwuru, sị: “Igwu egwuregwu na-eme ka mmadụ dị garagara. Ọ ka mma karịa ịnọ n’ime ụlọ na-egwu egwuregwu vidio.”

 Egwuregwu na-eme ka mmadụ mụta iso ndị ọzọ emekọ ihe nakwa ịna-ejide onwe ya. Baịbụl mere ihe atụ banyere igwu egwu ma jiri ya kụzie ihe bara uru. O kwuru, sị: “Ndị niile na-agba ọsọ n’ọsọ egwuregwu na-agba ọsọ, ma naanị otu onye na-enweta ihe a na-agbata n’ọsọ. . . . Onye ọ bụla nke sokwa n’asọmpi na-enwe njide onwe onye n’ihe niile.” (1 Ndị Kọrịnt 9:​24, 25) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Mmadụ ga-amụtarịrị iso ndị ọzọ emekọ ihe, mụtakwa ịna-ejide onwe ya ka ya na ndị ọzọ nwee ike igwu egwuregwu. Nwa agbọghọ aha ya bụ Abigail kwetara na ihe a bụ eziokwu. Ọ sịrị, “Igwu egwuregwu emeela ka m mụta otú mụ na ndị ọzọ ga-esi na-akparịta ụka ma na-emekọ ihe ọnụ.”

 Egwuregwu na-eme ka mmadụ nwee ndị enyi. Egwuregwu na-eme ka ndị mmadụ na ibe ha na-emekọ ihe. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Jordan, sịrị, “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ egwuregwu niile ka a na-asọmpi na ha. Ma, igwu egwuregwu ga-emekwa ka i nwee ọtụtụ ndị enyi ma ọ bụrụ na ị na-ele ya anya ka ihe ga-eme ka obi dị gị mma.”

 Olee nsogbu o nwere ike ịkpata?

 Ụdị egwuregwu ị na-egwu. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.”​—Abụ Ọma 11:5.

 O doro anya na e nwere egwuregwu ụfọdụ ihe a na-eme na ha bụ naanị ihe ike. Dị ka ihe atụ, nwa agbọghọ aha ya bụ Lauren sịrị: “Ihe onye ọ bụla na-eti ọkpọ na-ebu n’obi bụ ka o merụọ ibe ya ezigbo ahụ́. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị anaghị alụ ọgụ. Gịnịzi mere ile ndị na-alụ ọgụ ga-eji na-atọ anyị ụtọ?”

 Ihe ị ga-echebara echiche: Ì chere na igwu egwuregwu vidio a na-eme ihe ike na ya ma ọ bụ ile ya ele agaghị eme ka ị na-eme ihe ike? Ọ bụrụ na i chere otú ahụ, cheta na Abụ Ọma 11:5 kwuru na Jehova kpọrọ onye “hụrụ ime ihe ike n’anya” asị, ọ bụghị naanị onye na-eme ihe ike.

 Otú i si egwu egwuregwu. Baịbụl sịrị: Emela ‘ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ onye onwe ya na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka gị.’​—Ndị Filipaị 2:3.

 Nke bụ́ eziokwu bụ na obere asọmpi na-adịkarị n’egwuregwu ọ bụla a na-enwe òtù abụọ ma ọ bụ karịa na ya. Ma, ọ bụrụ na anyị a na-esi ọnwụ ka anyị merie, egwuregwu ahụ agaghịzi adị ụtọ. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Brian kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ akpachaghị anya, o nwere ike ịna-esi ọnwụ ka o merie n’egwuregwu. Ọ bụrụ na mmadụ ma egwuregwu ọ na-eme nke ọma, ọ ga-adịkwu mkpa ka onye ahụ mụta ịna-ejide onwe ya.”

 Ihe ị ga-echebara echiche: Otu nwa okorobịa aha ya bụ Chris kwuru, sị: “Anyị na-agba bọl kwa izu, anyị na-emerụkwa ahụ́.” Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ na-emerụ ahụ́ n’egwuregwu a? Gịnị ka m nwere ike ime ka anyị ghara ịna-emerụkarị ahụ́?’

 Awa ole i ji egwu egwu. Baịbụl sịrị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”​—Ndị Filipaị 1:​10.

 I kwesịrị ịhazi oge gị ka i nwee ike ibu ụzọ na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke. Ọtụtụ egwuregwu na-ewe oge igwu ha ma ọ bụ ile ha ele. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Daria kwuru, sị: “Mụ na mama m na-esekarị okwu gbasara awa ole m na-eji ele tiivi, n’ihi na e nwere ezigbo ihe m kwesịrị iji oge ndị ahụ eme.

Mmadụ igwufe egwuregwu ókè dị ka mmadụ itinyebiga nnụ ókè ná nri

 Ihe ị ga-echebara echiche: Ị̀ na-ege nne na nna gị ntị ma ha gwa gị ihe ndị ka mkpa ị ga-eji oge gị eme? Nwa agbọghọ aha ya bụ Trina kwuru na e nwere mgbe ya na ụmụnne ya na-ahapụ ọrụ dịịrị ha, na-ele ndị na-egwu egwuregwu na tiivi. N’oge ahụ, mama ha na-echetara ha na a na-akwụ ndị ahụ na-egwu egwuregwu ụgwọ, ma hà lere ha ma hà eleghị ha. Mama ha na-ajụzi ha, sị, ‘Ònye na-akwụ unu ụgwọ?’ Trina kwuru na ihe okwu mama ha pụtara bụ na ọrụ ndị ahụ bụ egwuregwu ahụ ha na-egwu. Ma, ọ bụrụ na hanwa ahapụ ọrụ e nyere ha n’ụlọ akwụkwọ nakwa ọrụ ndị ọzọ dịịrị ha gaa na-ele tiivi, n’ọdịnihu, ha agaghị enwe ike inweta ihe ha ga-eji na-elekọta onwe ha. O kwuru na ihe mama ha na-agwa ha bụ na igwu egwu ma ọ bụ ile ya na tiivi ekwesịghị ịbụ ihe kacha ha mkpa.