NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?—Nke 1: Ihe Baptizim Pụtara
Kwa afọ, a na-eme ọtụtụ ndị na-eto eto nne na nna ha zụrụ ka ha bụrụ Ndịama Jehova baptizim. Ì chewala echiche ime baptizim? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ịghọta ihe inyefe Chineke onwe gị na ime baptizim pụtara.
Gịnị bụ baptizim?
Baptizim e kwuru okwu ya na Baịbụl bụ imikpu mmadụ ná mmiri, ọ bụghị ifesa mmadụ mmiri n’isi. Imikpu mmadụ na mmiri nwekwaranụ ezigbo ihe ọ pụtara.
Imikpu gị ná mmiri n’oge a na-eme gị baptizim na-egosi ọhaneze na ị gaghịzi na-ebi ndụ otú dị gị mma.
Isi ná mmiri kulite gị na-egosi na ị malitela ibi ndụ ọhụrụ, nke ị ga na-emezi naanị ihe dị Chineke mma.
I mee baptizim, o gosiri na i kwetara n’ihu ọha na ọ bụ Jehova kwesịrị ịna-agwa gị ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ nakwa na i kwela ya nkwa na ị ga na-eme ihe ọ bụla ọ chọrọ ka i mee.
Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị mere i kwesịrị iji nọrọ n’ihu ọha mmadụ kwe Jehova nkwa na ị ga na-erubere ya isi ná ndụ gị niile? Gụọ 1 Jọn 4:19 na Mkpughe 4:11.
Gịnị bụ inyefe Chineke onwe gị?
Tupu i mee baptizim, i kwesịrị inyefe Jehova onwe gị mgbe naanị gị nọ. Olee otú ị ga-esi eme ya?
Ị ga-ekpe ekpere gwa Jehova na ị na-ekwe ya nkwa na ị ga-efe ya ruo mgbe ebighị ebi nakwa na ị ga na-eme ihe ọ chọrọ n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ nakwa n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ kpebiri ime.
Ọ bụ baptizim ị ga-eme ga-eme ka ndị ọzọ mara na i nyefeela Chineke onwe gị. Ọ ga-eme ka ndị ọzọ mara na ọ bụghịzi gị nwe onwe gị, kama na ọ bụzi Jehova nwe gị.—Matiu 16:24.
Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị mere ndụ gị ga-eji ka mma ma ị bụrụ nke Jehova? Gụọ Aịzaya 48:17, 18 na Ndị Hibru 11:6.
Gịnị mere ime baptizim ji dị mkpa?
Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ime baptizim. (Matiu 28:19, 20) N’ihi ya, baptizim ka bụkwa ihe dị mkpa Ndị Kraịst ga-emerịrị. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na mmadụ kwesịrị ime baptizim ka e wee zọpụta ya.—1 Pita 3:21.
Ma, ihe kwesịrị ime ka i kpebie ime baptizim bụ maka na ị hụrụ Jehova n’anya, jirikwa adịm ná mma gị na ya kpọrọ ihe. Obi kwesịrị ịdị gị otú ahụ ọ dị ọbụ abụ, onye dere, sị: ‘Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ maka ihe ọma niile o meere m? M ga-akpọku aha Jehova. M ga-emezu nkwa m kwere Jehova.’—Abụ Ọma 116:12-14.
Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ihe ọma Jehova meere gị, oleekwa otú ị ga-esi kwụghachi ya? Gụọ Diuterọnọmi 10:12, 13 na Ndị Rom 12:1.