NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú M Ga-esi Họrọ Onye Na-eme Nke Ọma M Ga Na-eme Ka Ya?

Olee Otú M Ga-esi Họrọ Onye Na-eme Nke Ọma M Ga Na-eme Ka Ya?

 “Ihe nyeere m aka mgbe nsogbu bịaara m n’ụlọ akwụkwọ bụ icheta onye m chọrọ ịna-eme ka ya nwetụrụla ụdị nsogbu ahụ. M cheta ihe onye ahụ mere, m na-agbazi mbọ mee ka ya. Inwe onye m chọrọ ịna-eme ka ya mere ka ọ dịtụrụ m mfe ịna-emeri nsogbu.”​—Haley.

 Inwe onye ị na-eme ka ya nwere ike inyere gị aka izere nsogbu, nyekwara gị aka ime ihe ndị ị chọrọ ime ná ndụ. Ma, ihe a niile ga-enwe isi ma ị họrọ ezigbo mmadụ ị ga na-eme ka ya.

 Gịnị mere i ji kwesị ịsa anya ná mmiri họrọ onye ị ga na-eme ka ya?

  •   Otú ndị ị họọrọ ịna-eme ka ha si akpa àgwà ga-akpa otú i si akpa àgwà aka.

     Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha na-echeta ndị na-akpa àgwà ndị e ji ama atụ. Ọ sịrị: “Nweekwanụ ụdị okwukwe ha nwere mgbe unu na-ahụ uru omume ọma ha bara.”​—Ndị Hibru 13:7.

     Aro: Ebe ọ bụ na ndị ị họọrọ ịna-eme ka ha nwere ike ime ka ị kpawa àgwà ọma ma ọ bụ àgwa ọjọọ, gbalịa họrọ ndị a na-ekwu okwu ọma gbasara àgwà ha. Ahọrọla mmadụ naanị n’ihi na ọ bụ onye a ma ama ma ọ bụ n’ihi na gị na ya bụ ọgbọ.

     “Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka Onye Kraịst ibe m aha ya bụ Adam, ma otú o si akpa àgwà ma otú o si eme ihe ndị ọzọ kụziiri m ihe. Ọ na-atụ m n’anya na m ka na-echeta ụfọdụ ihe ọ na-ekwu na ụfọdụ ihe ọ na-eme. Ọ maghị otú ndụ ya si baara m uru.”​—Colin.

  •   Otú ndị ị họọrọ ịna-eme ka ha si eche echiche ga-akpa otú i si eche echiche na otú obi na-adị gị aka.

     Baịbụl kwuru, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”​—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

     Aro: Họrọ onye nwere àgwà ọma ị ga na-eme ka ya. Ahọrọla mmadụ naanị n’ihi na ọ mara mma. Ị họrọ onye ahụ naanị n’ihi mma ya, ihe ị ga-emecha hụ agaghị abụ ihe ị tụrụ anya ya.

     “Ọ bụrụ na ị na-ejikarị onwe gị atụnyere ndị mara mma pụrụ iche, ọ ga-eme ka ị na-eche na ị baghị uru nakwa na ị jọrọ njọ. O nwekwara ike ime ka ị na-echegbukarị onwe gị gbasara otú ị dị.”​—Tamara.

     Ihe ị ga-echebara echiche: Olee nsogbu mmadụ nwere ike inwe ma ọ họrọ ndị a ma ama na ndị na-eme egwuregwu ka ndị ọ ga na-eme ka ha?

  •   Ụdị ndị ị họọrọ ịna-eme ka ha nwere ike ime ka i mee ihe ndị i bu n’obi ime ma ọ bụ ghara ime ha.

     Baịbụl kwuru, sị: “Onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe.”​—Ilu 13:20.

     Aro: Ka ndị ị ga-ahọrọ ịna-eme ka ha bụrụ ndị na-akpa àgwà ọma ndị ị chọrọ ịna-akpa. Ka ị na-ahụ otú ha si eme, i nwere ike ịmụta otú ị ga-esi eme ihe ndị i bu n’obi ime n’ọdịnihu.

     “Ọ ka mma mmadụ ikwu ihe a kapịrị ọnụ o bu n’obi ime, kama ikwu ihe a na-akapịghị ọnụ, dị ka ihe atụ, kama ịsị ‘achọrọ m ịna-emekwu nke ọma,’ ọ ka mma ịsị ‘achọrọ m ịna-emekwu nke ọma ka Jane. Ọ na-agakarị ihe n’oge, na-ejikwa ọrụ ya akpọrọ ihe.’”​—Miriam.

     Nke bụ́ eziokwu bụ: Ị họrọ ezigbo mmadụ ị ga na-eme ka ya, ọ ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ịbụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ.

I nwee ezigbo mmadụ ị na-eme ka ya, o nwere ike ime ka ọ dịrị gị mfe ime ihe ndị i bu n’obi ime.

 Otú ị ga-esi ahọrọ ezigbo mmadụ

 E nwere ụzọ abụọ i nwere ike isi họrọ onye ị ga na-eme ka ya.

  1.   I nwere ike họrọ otu àgwà ị ga-achọ ịna-akpakwu ma chọtazie onye ihe ya na-amasị gị na-akpa àgwà ahụ.

  2.   I nwere ike họrọ otu onye ihe ya na-amasị gị ma chọta otu àgwà onye ahụ na-akpa ị ga-achọ ịkpawa.

 Ndị nwere ike iso ná ndị ị ga na-eme ka ha bụ:

  •  Ndị ọgbọ gị. “M chọrọ ịna-eme ka ezigbo enyi m. E nweghị otú o si jiri ọrụ n’aka na-egbochi ya ịga nyere onye ọzọ aka. Ọ bụ eziokwu na m tọrọ ya, ma m hụrụ na o nwere ọmarịcha àgwà ndị m na-enweghị. Ihe a na-emekwa ka m chọọ ịna-eme ka ya.”​—Miriam.

  •  Ndị torola eto. Ha nwere ike ịbụ ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị gị na ha na-ekpe otu okpukpe. “O doro anya na papa m na mama m bụ ndị m kwesịrị ịna-eme ka ha. Ha nwere àgwà ndị magburu onwe ha. M na-ahụ ihe ndị ha na-emejọ, ma m na-ahụkwa na ha na-erubere Jehova isi n’agbanyeghị ya. Ọ ga-amasị m ka a na-ekwu ụdị okwu ọma a banyere m mgbe m ga-etoru ka ha.”​—Annette.

  •  Ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. “M họrọla ọtụtụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl m ga na-eme ka ha, dị ka, Timoti, Rut, Job, Pita, na otu nwata nwaanyị onye Izrel. E nwere ihe mere m ji họrọ onye nke ọ bụla n’ime ha. Ka m na-amụtakwu gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na baịbụl, akụkọ ha na-abakwuru m uru. Ọ na-atọ m ezigbo ụtọ ịmụ gbasara ndị a n’akwụkwọ Ṅomie Okwukwe Ha, nakwa n’ebe a kpọrọ ‘Ebe E Dere Ndị M Ga-eṅomi’ n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ​—Azịza Ndị Na-adị Irè, mpịakọta nke mbụ na nke abụọ.”​—Melinda.

 Aro: Ahọrọla naanị otu onye ị ga na-eme ka ya. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Lekwasịkwanụ anya ná ndị na-ebi ndụ otú unu hụrụ anyị si ebi.”​—Ndị Filipaị 3:17.

 Ị̀ ma ihe a? I nwere ike ịbụrụ onye ọzọ onye ọ ga na-eṅomi. Baịbụl kwuru, sị: “Ka otú i si ekwu okwu, otú i si akpa àgwà, otú i si hụ ndị ọzọ n’anya, otú i si nwee okwukwe, na otú i si ebi ndụ dị ọcha bụrụ ihe ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ji ama atụ.”​—1 Timoti 4:12.

 “I nwere ike ịna-enyere ndị ọzọ aka ịna-akpa àgwà ọma n’agbanyeghị na gịnwa nwekwara àgwà ndị ị chọrọ ịna-emekwu nke ọma na ha. Ị maghị ndị na-ele gị, ị maghịkwa otú ihe i kwuru nwere ike isi agbanwe ndụ mmadụ.”​—Kiana.