Igbo
Gịnị Ka M Ga-eme Ma M Daa Iwu Nne na Nna M Tiri?
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/500600104/univ/art/500600104_univ_sqr_xl.jpg
ijwyp isiokwu 100

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ma M Daa Iwu Nne na Nna M Tiri?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma M Daa Iwu Nne na Nna M Tiri?

 Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na nne na nna ọ bụla na-eti iwu ga na-achị ụmụ ha. Ụfọdụ n’ime iwu ndị ahụ bụ gbasara oge ha chọrọ ka ọ bụrụ na ụmụ ha alọtala n’ụlọ, oge ụmụ ha ga na-eji apị ekwentị ha, na otú ụmụ ha kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ.

 Gịnị ka ị ga-eme ma ị daa otu n’ime iwu nne na nna gị tiri? O nweghị ihe ị ga-emeli gbasara iwu ahụ ị dara, ma ị ga-emeli ka ihe ghara ịka njọ. Isiokwu a ga-egosi gị otú ị ga-esi eme ya.

 Ihe ị na-ekwesịghị ime

  •   Ọ bụrụ na nne na nna gị amaghị na ị daala iwu ha tiri, i nwere ike ịchọ ka i zochiere ha ihe i mere.

  •   Ha matakwanụ na ị daala iwu ha tiri, i nwere ike ịchọ ka ị gọrọ isi gị ma ọ bụ chọwa onye ị ga-ebo ya.

 Ma, o nweghị nke i kwesịrị ime n’ime ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na i zochie ihe merenụ ma ọ bụ gọrọwa isi gị, ị na-egosi na ị ka na-akpa àgwà ụmụaka. Nne na nna gị ga-ewere ya na o nwebeghị ihe ị ma.

 “Ịgha ụgha agaghị enyere gị aka. Eziokwu ga-emecha pụta ìhè. Ya pụta ìhè, ahụhụ ha ga-ata gị ga-akarị nke ha gaara ata gị ma a sị na ị dị mbụ gwa ha eziokwu.”​—Diana.

 Ihe ka mma ị ga-eme

  •   Kweta ihe i mejọrọ. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe agaghị agaziri onye na-ezochi mmehie ya.” (Ilu 28:13) Nne na nna gị ma na i zughị okè. N’agbanyeghị ya, ha na-atụ anya ka ị na-agwa ha eziokwu.

     “Nne na nna gị ga-aka emere gị ebere ma ị gwa ha eziokwu. Ha ga-atụkwasịkwu gị obi ma ha chọpụta na ị na-ekwu eziokwu.”​—Olivia.

  •   Rịọ mgbaghara. Baịbụl kwuru, sị: “Dịrịnụ umeala n’obi.” (1 Pita 5:5) Ọ bụ onye dị umeala n’obi ga-asịli “Biko, gbaghara m,” ọ bụkwa ịdị umeala ga-eme ka mmadụ ghara ịchọwa otú ọ ga-esi gọrọ isi ya.

     “Ndị na-agbalị mgbe niile ka ha gọrọ isi ha ma ha mejọọ ihe na-eme ka akọnuche ha kwụsị ịrụ ọrụ nke ọma. N’ikpeazụ, obi ha agaghịzi na-ama ha ikpe ma ha mee ihe ọjọọ.”​—Heather.

  •    Nabata ihe ọ bụla e mere gị maka ihe i mejọrọ. Baịbụl kwuru, sị: “Nabatanụ aka ná ntị a na-adọ unu.” (Ilu 8:33) Atamula ntamu, kama nabata ahụhụ ọ bụla nne na nna gị tara gị ma ọ bụ ihe ọ bụla ha gbochiri gị ime n’ihi ihe i mejọrọ.

     “Ọ bụrụ na ị na-emekwu mkpesa maka ahụhụ a tara gị, ihe ga na-akakwuru gị njọ. E gbochie gị ime ihe ụfọdụ, gbalịa nabata ya, elekwasịkwala anya n’ihe e gbochiri gị ime.”​—Jason.

  •   Gbaa mbọ ka a malitekwa ịtụkwasị gị obi. Baịbụl kwuru, sị: ‘Yipụnụ àgwà ochie unu.’ (Ndị Efesọs 4:22) Malitekwa kpawa àgwà otú ga-eme ka nne na nna gị tụkwasị gị obi.

     “Ọ bụrụ na ị na-eme mkpebi ndị dị mma ma gosi nne na nna gị na ị gaghị emekwa ihe na-adịghị mma ahụ i meburu, ha ga-amalitekwa ịtụkwasị gị obi.”​—Karen.

 IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA: Na-eme ihe karịrị ihe a tụrụ anya ka i mee, ọ ga-egosi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Dị ka ihe atụ, oge ọzọ ị pụrụ apụ, kpọọ ndị mụrụ gị n’ekwentị mgbe ị nọ n’ụzọ na-alọta ma gwa ha na ị lọtawala, ọ bụrụgodị na ị nọfebeghị oge ha gwara gị jiri lọta. Ọ ga-eme ka ha ghọta na ị chọrọ ka ha tụkwasịwakwa gị obi.