NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Izigara Ndị Ọzọ Ozi Iberiibe?
Gịnị bụ izigara ndị ọzọ ozi iberiibe?
Ozi iberiibe bụ iji ekwentị ezigara ndị ọzọ ozi, foto, ma ọ bụ vidio gbasara mmekọahụ ma ọ bụ ndị gba ọtọ. Otu nwoke kwuru, sị: “Taa, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mmadụ niile na-ezigara ndị ọzọ ozi iberiibe. Gị na mmadụ nwere ike na-ezirịta ozi, tupu gị amara ihe na-eme, unu amalite izigara ibe unu foto banyere mmekọahụ.”
Gịnị mere ndị mmadụ ji ezigara ndị ọzọ ihe ndị a? Akwụkwọ bụ́ The New York Times kwuru na otu ọkàikpe sịrị na ụfọdụ ndị na-eto eto chere na “ọ bụrụ na i nwere foto ebe onye gị na ya na-akpa gba ọtọ n’ekwentị gị, ọ na-egosi na ị na-enwe mmekọahụ.” Otu onye na-eto eto kpọrọ ya “otú kacha mma isi nwee mmekọahụ.” Ọ sịrị na isi otú ahụ enwe mmekọahụ “emekataghị mee ka mmadụ tụta ime ma ọ bụ bute ọrịa a na-ebute ná mmekọahụ.”
Ihe ndị ọzọ mere ndị na-eto eto ji ezigara ndị ọzọ ozi iberiibe bụ:
Ka ha gosi onye ha chọrọ ka ha na ya kpawa na ha na-anwụrụ ya.
Maka na mmadụ ebula ụzọ zitere ha foto gbasara mmekọahụ, ha echezie na ha kwesịrị izigakwara onye ahụ ụdị foto ahụ.
Olee ihe izigara mmadụ ozi iberiibe nwere ike ịkpata?
Mgbe ọ bụla i ji ekwentị zigara onye ọzọ foto gị, foto ahụ apụọla gị n’aka, ọ bụghịzi gị ga-ekwu ihe ndị e nwere ike iji ya eme, ma ọ bụkwanụ otú ọ ga-esi eme ka ndị ọzọ na-ele gị anya. E nwere otu nwaanyị e ji ime nchọnchọ mara, aha ya bụ Amanda Lenhart. N’otu isiokwu o dere banyere izigara ndị ọzọ ozi iberiibe, nke otu ụlọ ọrụ aha ya bụ Pew Research Center wepụtara, o dere, sị: “Ọ dịzi mfe n’oge a izigara ndị ọzọ ihe mmadụ mejọrọ ma ọ bụ ihe ọ na-emetaghị, ọ na-adịkwa mfe idowe ha ebe ndị ọzọ ga na-ahụ ya.”
Mgbe ụfọdụ
Onye eziteere foto ndị gba ọtọ na-ezigara ya ndị enyi ya iji mee ha obi ụtọ.
Ụmụ nwaanyị hapụ ndị enyi ha nwoke ha na ha na-akpa, ndị enyi ha nwoke ahụ na-ezigara ndị ọzọ foto ebe ha gba ọtọ iji mesie ha ike.
Ị̀ MA IHE A? Ọtụtụ oge, a na-ele iji ekwentị ezigara mmadụ foto ndị gba ọtọ anya otú e si ele imetọ ụmụaka ma ọ bụ izigara ụmụaka foto ndị gba ọtọ. E kpeedịla ụfọdụ ụmụaka ikpe na ha dara iwu gbasara mmekọahụ maka na ha zigaara ndị ọzọ ozi iberiibe.
Gịnị ka Baịbụl kwuru?
Baịbụl gosiri na e nweghị ihe o mere di na nwunye inwe mmekọahụ. (Ilu 5:18) Ma o kwuru ihe doro anya gbasara ndị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ. Legodị ihe amaokwu Baịbụl ndị a kwuru:
“Unu ekwesịghịdị ịna-ekwurịta gbasara ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha niile ma ọ bụ anyaukwu, . . . Unu emekwala omume na-eme ihere ma ọ bụ kwuo okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ.”—Ndị Efesọs 5:3, 4.
“Meenụ ka ahụ́ unu nwụọ n’ihe gbasara ịkwa iko, adịghị ọcha, ejideghị onwe unu ma agụụ mmekọahụ gụwa unu, ihe ọjọọ ịgụ unu agụụ, na anyaukwu.”—Ndị Kọlọsi 3:5.
Amaokwu ndị a gwara anyị ka anyị zere “ịkwa iko” (ya bụ, ndị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ), ma ọ gwakwara anyị ka anyị zere “adịghị ọcha” (ya bụ, ihe ọ bụla nwere ike imerụ omume anyị), gwakwa anyị ka anyị zere “agụụ mmekọahụ” (ya bụ, agụụ inwe mmekọahụ nwere ike ime ka mmadụ mee omume rụrụ arụ, ọ bụghị agụụ na-agụ mmadụ ka ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ).
Jụọ onwe gị, sị:
Gịnị mere izigara ndị ọzọ ozi iberiibe ji soro n’ihe ndị bụ́ “adịghị ọcha”?
Olee otú o si eme ka “agụụ mmekọahụ” na-adịghị mma gụwa mmadụ?
Gịnị mere agụụ ikiri ma ọ bụ izigara ndị ọzọ foto ndị gba ọtọ ji bụrụ “ihe ọjọọ”?
Amaokwu Baịbụl ndị a na-egosi ihe ndị ọzọ dị ezigbo mkpa mere anyị ji kwesị izere izigara ndị ọzọ ozi iberiibe.
“Gbalịsie ike ka ihe gị dị Chineke mma, ka ị bụrụkwa onye ọrụ nke ihe ọ rụrụ na-anaghị eme ihere.”—2 Timoti 2:15.
“Chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche. Unu kwesịrị ịna-akpa àgwà dị nsọ, na-efe Chineke”—2 Pita 3:11.
Amaokwu ndị a na-egosi uru ime omume dị ọcha bara. Ị na-ebi ndụ dị mma, ị gaghị na-echegbu onwe gị na ị ga-emecha kwaa ụta maka ihe ndị i mere.—Ndị Galeshia 6:7.
Jụọ onwe gị, sị:
Olee ụdị onye m bụ?
M̀ na-eche banyere otú e nwere ike isi na-ele ndị ọzọ anya?
Ọ̀ na-amasị m iji ihe na-agbawa ndị ọzọ obi atụrụ ndụ?
Olee otú izigara ndị ọzọ ozi iberiibe nwere ike isi mebie aha m?
Olee otú izigara ndị ọzọ ozi iberiibe nwere ike isi mee ka ndị mụrụ m kwụsị ịtụkwasị m obi?
AKỤKỌ MERE EME “E nwere otu enyi m na-achọghị ka ndị ọzọ mara na e nwere nwa okorobịa ya na ya na-akpa. O zigaara enyi ya nwoke ahụ foto ya ebe ọ gba ọtọ, yanwa ezitekwara ya nke ya. O rudịghị abalị abụọ, papa nke nwaanyị agwa ya ka o nye ya ekwentị ya ka o lee. Obi gbawara papa ya mgbe ọ hụrụ ozi ndị ahụ. Ọ jụrụ nwa ya nwaanyị gbasara ozi ndị ahụ, ya akọọrọ ya ihe niile gbasara ya. Ama m na ihe ahụ enyi m nwaanyị mere wutere ya, ma o riri papa ya na mama ya ọnụ, weekwa ha ezigbo iwe. O siziiri ha ike ịtụkwasị ya obi ọzọ.”
Nke bụ́ eziokwu: Mmadụ na-akpụ ùgwù ya n’ala ma ọ na-ezigara ndị ọzọ ozi iberiibe ma ọ bụ na-ekiri ya ekiri. Otu nwa agbọghọ enyi ya nwoke nyegidere nsogbu ka o zitere ya foto ya ebe ọ gba ọtọ, ya emechaa zigara ya foto ahụ, kwuru, sị: “Ihere onwe m na-eme, m na-ewesakwa onwe m iwe.”
Ebe ọ bụ na izigara ndị ọzọ ozi iberiibe nwere ike ịkpatara gị na ndị ọzọ nsogbu, nweekwa ike ime ka e kpee gị ikpe, ọ ga-adị mma ma i mee ihe ndị a Baịbụl kwuru:
“Gbaara ihe na-agụ ndị na-eto eto agụụ ọsọ.”—2 Timoti 2:22.
“Nyere m aka ka m ghara ịna-ele ihe na-abaghị uru.”—Abụ Ọma 119:37.
Gịnị ka ị ga-eme?
Na-eme ihe Baịbụl kwuru n’ihe ọ bụla ị na-eme ná ndụ. Legodị ihe otu nwa agbọghọ aha ya bụ Janet kwuru. Olee ihe i chere ka mma ka o mee?
“E nwere oge m hụrụ otu nwa okorobịa, ya anara m akara ekwentị m, nyekwa m nke ya. Tupu otu izu agaa, ọ malitere ịgwa m ka m zitere ya foto ndị m sere ebe m yi ákwà na-ekpuchighị ahụ́ m nke ọma.”
Gịnị ka i chere Janet kwesịrị ime? Gịnị ka ị ga-eme?
NKE A I nwere ike na-eche, sị: ‘E nweghị ihe o mere. A sị kwuwe, ọ bụrụ na anyị gara ịgwu mmiri, ọ ga-ahụnụ m ebe m yi ụdị ákwà ahụ.’
NKE B I nwere ike na-eche, sị: ‘Amachaghị m ihe o bu n’uche. Ka m buru ụzọ zigara ya foto ebe m yi ákwà kpuchitụrụ m ahụ́, mụ amarazie ihe ọ ga-eme.’
NKE CH I nwere ike na-eche, sị: ‘E nweghị ihe ọzọ nwa okorobịa a chọrọ ma ọ bụghị ka anyị nwee mmekọahụ. M ga-egbu ozi a o ziteere m.’
Nke CH kacha mma, ọ̀ kwa ya? Ị manụ na Baịbụl kwuru, sị: “Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo, ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.”—Ilu 22:3.
Ihe a anyị kwuru gbasara Janet gosiri na ihe na-emekarị ka mmadụ malite izigara ndị ọzọ ozi iberiibe ma ọ bụ malite ịkpa àgwà ọjọọ ndị ọzọ bụ ileghara otu ajụjụ anya, ya bụ: Ị̀ na-asa anya ná mmiri ahọrọ ndị gị na ha ga-abụ enyi? (Ilu 13:20) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sarah kwuru, sị: “Gị na ndị na-anaghị anabata omume ọjọọ na-akpa.” Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Delia kwetara ihe a, ọ sịrị: “Ihe bụ́ mkpa ụfọdụ ndị i chere na ha bụ ndị enyi gị bụ ime ka ị kwụsị ịkpa àgwà ọma, ọ bụghị inyere gị aka ka ị na-akpa àgwà ọma. Ọ bụrụhaala na ha anaghị edebe iwu Chineke, ọ pụtara na ha chọrọ ka ị kwụsị ime ihe ị ma dị mma. Ọ̀ bụ ụdị ihe a ka ị chọrọ?”