Gaa n'Isiokwu

Ihe Ndị Na-eto Eto Ibe Gị Kwuru

Nọrọ ebe a lee vidio ebe ndị na-eto eto na-ekwu ihe ha na ụwa na-alụ na otú ha si merie nsogbu ndị ha nwere. Ha si ebe dị iche iche n’ụwa.

 

Ịgụ Baịbụl

Ịgụ ihe adịghị mfe, ma ịgụ Baịbụl abụghị igbu oge. Lee vidio a ka ịhụ ihe ndị na-eto eto anọ kwuru gbasara otú ịgụ Baịbụl si abara ha uru.

Ikwere na Chineke

N’obere vidio a, ndị na-eto eto kwuru ihe mere ha ji kwere na e nwere Onye Okike.

Ndụ Kacha Mma Mmadụ Nwere Ike Ibi

Ị̀ chọrọ ibi ndụ ga-abara gị uru? Lee vidio a ka ị hụ ihe Cameron kọrọ gbasara otú o si bie ndụ bara uru n’obodo ọzọ.

Ego

Lee vidio a ka ị mata otú ị ga-esi na-echekwa ego gị, na-emefu ya, nakwa otú i kwesịrị isi na-ele ego anya.

Egwuregwu Iberiibe

Lee vidio a ka ị hụ ihe ndị na-eto eto ise kwuru gbasara egwuregwu iberiibe na ihe mmadụ ga-eme ma e gwusawa ya ụdị egwuregwu ahụ.