Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Owu Ghara Ịna-ama M?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Owu Ghara Ịna-ama M?

Ihe i nwere ike ime

 1. Mee ka uche gị dịrị n’ihe ndị ị ma eme. (2 Ndị Kọrịnt 11:6) Ọ bụ eziokwu na ọ dị mma ka ị mara ihe ndị ị na-anaghị emeta, ma cheta na o nwere ihe ndị ị na-emeta. Ị mata na o nwere ihe ndị ị ma eme, ọ ga-eme ka ị ghara ịna-eche na o nweghị ihe ị dị mma ya, ọ ga-emekwa ka owu kwụsị ịna-ama gị. Jụgodị onwe gị, sị, ‘Olee ihe ndị m ma eme?’ Chee gbasara ihe ndị ị ma eme na ọmarịcha àgwà ndị i nwere.

 2. Na-ahụ ndị ọzọ n’anya. Ihe mbụ ị ga-eme bụ ibido gosiwa mmadụ ole na ole na ị hụrụ ha n’anya. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Jorge kwuru, sị: “Naanị ịjụ ndị ọzọ otú ha mere ma ọ bụ otú ọrụ ha si aga ga-eme ka ị matakwuo ha.”

I nwere ike imeri nsogbu ahụ mere ndị ọgbọ gị ji agbara gị ọsọ

 Ihe ga-enyere gị aka: Ndị gị na ha ga na-akpa ekwesịghị ịbụ naanị ndị ọgbọ gị. E nwere ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ha na ibe ha bụ ezigbo enyi, ma, e nweghị otú ha si bụrụ ọgbọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ, Rut na Neomi, Devid na Jonatan, nakwa Timoti na Pọl. (Rut 1:16, 17; 1 Samuel 18:1; 1 Ndị Kọrịnt 4:17) Ihe ọzọ ị ga-eburu n’obi bụ na mgbe gị na ndị mmadụ na-akparịta ụka, o kwesịrị ịbụ onye kwuo ibe ya ekwuo. Ọ bụghị naanị gị ga-ekwuru na-aga. Obi na-atọ ndị mmadụ ụtọ ma ndị ọzọ na-ege ha ntị. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị bụ onye ihere, cheta na ọ bụghị naanị ga-ekwucha ihe niile. O nwekwara mgbe ị ga na-ege ege!

 3. ‘Ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ gị n’obi.’ (1 Pita 3:8) Ọ bụrụgodị na i kwetaghị ihe onye ọzọ na-ekwu, medaa obi chere ka o kwuchaa. Kwuo gbasara ihe ndị gị na onye ahụ kwekọrịtara na ha. Ọ bụrụ na i chere na ọ dị mkpa ka i kwuo uche gị n’ihe ụfọdụ unu na-ekwekọrịtaghị, meda obi kwuo ya; ekwukwala ya otú ọ ga-akpasu onye ahụ iwe.

Ihe ga-enyere gị aka: Na-agwa ndị ọzọ okwu otú gịnwa ga-achọkwa ka ha si na-agwa gị. Ọ bụrụ na gị na ndị mmadụ na-arụkarị ụka, gị ana-edowe ọnụ otú ọ bụla dị gị mma agwa ha okwu, na-akparị ha, jiri ha na-eme ihe ọchị ma ọ bụ na-egosi ha na ị ka ha bụrụ ndị ezi omume, ọ ga-eme ka ha na-agbara gị ọsọ. Ma, ha ga na-abịa gị nso ma ọ bụrụ na i mee ‘ka okwu gị dịrị n’amara mgbe niile.”—Ndị Kọlọsi 4:6.