NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Èruola M Mụ na Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị Ibe M Ịkpawa?
Gịnị ka nwoke na nwaanyị ịkpa pụtara?
Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpapụ mgbe niile. Gị na ya ùnu na-akpa?
Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị hụrụ ibe unu n’anya. Ọtụtụ ugboro n’ụbọchị, ị na-eji ekwentị ezigara ya ozi ma ọ bụ na-akpọ ya. Gị na ya ùnu na-akpa?
Mgbe ọ bụla gị na ndị enyi gị zukọtara, gị na otu onye ahụ na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-anọkarị. Gị na ya ùnu na-akpa?
O nwere ike o sighịrị gị ike ịza ajụjụ nke mbụ ahụ. Ma o nwere ike ịbụ na i bu ụzọ chee echiche tupu gị azaa ajụjụ nke abụọ na nke atọ. Gịnị ka nwoke na nwaanyị ịkpa pụtara?
N’eziokwu, nwoke na nwaanyị ịkpa pụtara na ha abụọ na-emekọ ihe ọnụ ma nwee mmasị n’ebe ibe ha nọ.
N’ihi ya, azịza ajụjụ atọ ahụ a jụrụ na mbụ bụ ee. Ma ọ̀ bụ n’ekwentị, ma ọ̀ bụ n’ihu n’ihu, n’ebe ndị mmadụ nọ ma ọ̀ bụ n’ebe ndị mmadụ na-anọghị, ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwere mmasị n’ebe ibe unu nọ, na-ezirịtakwa ozi mgbe niile, unu na-akpa.
Gịnị mere nwoke na nwaanyị ji akpa?
E kwesịrị inwe ezigbo ihe mere nwoke na nwaanyị ga-eji na-akpa. Ọ bụ iji nyere nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa aka ịmata ma hà ga-alụ.
N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ndị ọgbọ gị na-ewere nwoke na nwaanyị ịkpa dị ka ihe egwuregwu. Ma eleghị anya, ọ na-atọ ha ụtọ ka ha na enyi ha nwoke ma ọ bụ enyi ha nwaanyị ihe ya kasị amasị ha na-anọ, n’agbanyeghị na ha achọghị ịlụ onye ahụ. Ụfọdụ nwere ike iwere enyi ha nwoke ma ọ bụ enyi ha nwaanyị dị ka onye ha ga-eji na-akpa nganga n’ihu ọha.
Ọtụtụ mgbe, nwoke na nwaanyị na-akpa n’ebughị n’obi ịlụ onwe ha, ọ gaghị egbu oge, ha esee. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Heather kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime ndị na-eto eto ndị nwere enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị na-etisa n’ime otu izu ma ọ bụ abụọ. Ha na-ewere nwoke na nwaanyị ịkpa ka ihe na-ekwesịghị ịdịte aka. E nwekwara ike ikwu na ọ na-eme ka ha mụta ịgba alụkwaghịm kama ịmụta ịnọgide n’alụmdi na nwunye.”
O doro anya na mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa, ị na-eri onye ahụ obi. Ya mere, jide n’aka na i bu ezigbo ihe n’obi.—Luk 6:31.
Ọ bụrụ na gị na onye ị na-ebughi n’obi ịlụ na-akpa, ị na-eme ka nwata ji ihe o ji egwuri egwu a zụtaara ya ọhụrụ egwuri egwu, mechaa tụfuo ya
Chegodị echiche: Ị̀ chọrọ ka onye ọzọ were obi gị na-egwuri egwu dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe ụmụaka ji egwuri egwu, nke a ga-atụtụrụ, tụfuokwa n’egbughị oge? N’ihi ya, emekwala ya onye ọzọ. Baịbụl kwuru na ịhụnanya ‘adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị.’ —1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.
Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chelsea sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m na-eche na nwoke na nwaanyị ịkpa kwesịrị ịbụ ihe egwuregwu. Ma ọ bụghị ihe egwuregwu ma otu onye buru n’obi na ha ga-alụ, ma onye nke ọzọ ebughị ya n’obi otú ahụ.”
Ihe ga-enyere gị aka: Ọ bụrụ na ị chọwala onye ị ga-alụ, gụọ 2 Pita 1:5-7, gị ahọrọ otu àgwà i kwesịrị ịrụ ọrụ na ya. Otu ọnwa gafee, chọpụta ma ị̀ mụtala ime nke ọma n’àgwà ahụ.
Ètoruola m inwe onye mụ na ya ga na-akpa?
Afọ ole ka i chere onye na-eto eto kwesịrị ịdị tupu ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya akpawa?
Jụọ papa gị ma ọ bụ mama gị ajụjụ ahụ.
Afọ ole papa gị ma ọ bụ mama gị gwara gị nwere ike ịkarị afọ ole i chere onye na-eto eto kwesịrị ịdị. O nwere ike ọ gaghị akarị ya! I nwere ike ịbụ otu n’ime ndị na-eto eto maara ihe, ndị kpebiri na ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha agaghị akpa ruo mgbe ha toruru ịmata onwe ha nke ọma.
Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Danielle kpebiri ime otú ahụ. Ọ sịrị: “Ụdị onye m gaara achọ ịlụ n’afọ abụọ gara aga dị nnọọ iche n’ụdị onye m ga-achọ ịlụ ugbu a. Ọbụna ugbu a, echeghị m na m ga-ekpebili ụdị onye m ga-alụ. Mgbe m chere na amatala m ihe m chọrọ, afọ ole na ole agafeekwa, mgbe ahụ ka m ga-echewe echiche ka mụ na nwoke kpawa.”
E nwere ihe ọzọ mere o ji dị mma ka mmadụ cheretụ. Baịbụl ji okwu bụ́ “ntoju ntorobịa” kọwaa oge agụụ mmekọahụ na-esi ike ná ndụ. (1 Ndị Kọrịnt 7:36) Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa mgbe ị ka nọ n’oge ntoju ntorobịa, o nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụsiwe gị ike, meekwa ka i mee omume ọjọọ.
N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ọ bụghị ihe ọjọọ n’anya ndị ọgbọ gị. Ọ na-anụ ọtụtụ n’ime ha ọkụ n’obi inwe mmekọahụ. Ma i nwere ike izere ụdị echiche ahụ! (Ndị Rom 12:2) A sị ka e kwuwe, Baịbụl dụrụ gị ọdụ ka ‘ị gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Ọ bụrụ na i chere ruo mgbe ị gafere oge ntoju ntorobịa, ‘ị gaghị ekwe ka ọdachi dakwasị gị.’—Ekliziastis 11:10.
Gịnị mere i ji kwesị ichere ruo mgbe i ruru ogo ya tupu gị enwee onye gị na ya ga na-akpa?
Ọ bụrụ na mmadụ enyewe gị nsogbu ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa mgbe ị na-achọbeghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye, o yiri mmadụ ịmanye gị ile ule n’ihe ị ka malitere ịmụ amụ. O doro anya na ọ gaghị adị mma otú ahụ! I kwesịrị ịmụ ihe ahụ ruo ogologo oge ka i nwee ike ịmata ụdị ajụjụ a ga-ajụ gị n’ule ahụ.
O yiri nwoke na nwaanyị ịkpa.
Nwoke na nwaanyị ịkpa abụghị ntakịrị ihe. Ya mere, tupu gị enwewe mmasị n’ebe mmadụ nọ, i kwesịrị iwepụta oge mụọ “ihe” dị oké mkpa, ya bụ, otú ị ga-esi bụrụ ezigbo enyi ndị mmadụ.
Mgbe ị ga-emecha hụ onye ị ga-alụ, ọ ga-adịrị gị mfe ime ka mmekọrịta gị na ya sie ike. A sị ka e kwuwe, ọ bụ mmadụ abụọ bụ ezigbo enyi ga-abụli di na nwunye na-ebi n’udo.
Icheretụ tupu gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị amalite ịkpa agaghị eme ka i yie onye e kere agbụ. Kama nke ahụ, ọ ga-eme ka i nwekwuo ike ‘ịṅụrị ọṅụ mgbe ị bụ onye ntorobịa.’ (Ekliziastis 11:9) Ọ ga-eme ka i nwee oge ị ga-eji kwadebe onwe gị, ya bụ, imezikwu àgwà gị, nke ka nke, imezikwu mmekọrịta gị na Chineke.—Abụ Ákwá 3:27.
Ka ọ dị ugbu a, gị na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwere ike ịna-akpakọrịta. Olee ụzọ kacha mma ị ga-esi na-eme otú ahụ? Unu kwesịrị ịna-akpakọrịta n’ìgwè ebe ụmụ okoro, ụmụ agbọghọ na ndị mere okenye nọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Tammy sịrị: “Echere m na ọ ka ụtọ otú ahụ. Ọ ka mma inwe ọtụtụ ndị enyi.” Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Monica kwetara ihe Tammy kwuru ma sị: “Ọ bara nnọọ uru ka ndị na-eto eto na-akpakọrịta n’ìgwè, n’ihi na ị ga-ahụ ndị nwere àgwà dị iche iche.”
Ma, ọ bụrụ na i nwee mmasị n’ebe otu onye nọ, n’oge na-adịghị anya, i nwere ike iji aka gị kpatara onwe gị obi mgbawa. Ya mere, ya adịla gị oké ngwa ngwa. Jiri oge a i nwere ugbu a mụta otú e si emeta enyi, nakwa otú enyi na enyi si adị ná mma. Ọ bụrụ na i mechaa kpebie ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kpawa, ị ga-amatakwu onwe gị, matakwa ụdị àgwà ị chọrọ ka onye ị ga-alụ nwee.