NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Ètoruola M Ịlụ Di ma Ọ Bụ Nwunye?
Iji nyere gị aka ịza ajụjụ a, leruo onwe gị anya. Chee echiche banyere ihe ndị a:
Mmekọrịta gị na ndị ọzọ
Olee otú i si akpaso ndị mụrụ gị na ụmụnne gị àgwà? Ọ̀ na-esiri gị ike ijide onwe gị mgbe gị na ha na-emekọ ihe, ikekwe, gị ejiri olu ike ma ọ bụ ọnụ ọjọọ na-agwa ha okwu? Ọ bụrụ na a jụọ ha, gịnị ka ha ga-ekwu banyere gị? Otú i si akpaso ndị ezinụlọ gị àgwà na-egosi otú ị ga-esi na-akpaso di gị ma ọ bụ nwunye gị àgwà.—Ndị Efesọs 4:31.
Otú i si ele ihe anya
Ì nwere olileanya na ihe ga-aka mma, ka ị̀ na-eche na ọ ga-aka njọ? Ị̀ na-ekwenyere ndị ọzọ, ka ị̀ na-esi ọnwụ mgbe niile ka e mee ihe otú ị chọrọ? Ì nwere ike ijide onwe gị mgbe ihe siri ike? Ị̀ na-enwe ndidi? Ịmụta àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ugbu a ga-enyere gị aka ịbụ di ma ọ bụ nwunye n’ọdịnihu.—Ndị Galeshia 5:22, 23.
Otú gị na ego si aga.
Olee otú gị na ego si aga? Ị̀ na-ejikarị ụgwọ? Ị̀ na-anọgideli n’ọrụ i nwetara? Ọ bụrụ na ị naghị anọgideli na ya, gịnị mere? Ọ̀ bụ n’ihi otú ọrụ ahụ dị, ka ọ̀ bụ n’ihi onye ị na-arụrụ ọrụ, ka ọ̀ bụkwanụ n’ihi àgwà na-adịghị mma ị na-akpa? Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike iji ego gị eme ihe bara uru, olee otú ị ga-esi elekọta ezinụlọ gị?—1 Timoti 5:8.
Mmekọrịta gị na Chineke
Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, gịnị ka ị na-eme ka ị ghara imebi mmekọrịta gị na Chineke? Ị̀ na-ewepụta oge iji gụọ Baịbụl, iji gaa ozi ọma, na iji gaa ọmụmụ ihe? Onye ị ga-alụ kwesịrị ịlụ onye okwukwe ya siri ike.—Ekliziastis 4:9, 10.
Ị mata ụdị mmadụ ị bụ nke ọma, ị ga-enwe ike ichọta onye ga-enyere gị aka imekwu nke ọma, ọ bụghị onye na-agaghị enyere gị aka.