Gaa n'Isiokwu

ṄOMIE OKWUKWE HA | ỊLAỊJA

Ọ Tachiri Obi Ruo Ọgwụgwụ

Ọ Tachiri Obi Ruo Ọgwụgwụ

Ịlaịja nụrụ na Ehab anwụọla. Anyị nwere ike iji uche anyị hụ ka onye amụma a mere agadi na-emetụ afụ ọnụ ya aka ka ọ na-eche echiche, na-elegharị anya ka ọ na-echeta ihe ọ hụrụ n’aka ajọ eze ahụ kemgbe ọtụtụ afọ gara aga. O diela ọtụtụ ihe n’aka Eze Ehab. Eze a na nwunye ya Jezibel yiri ya egwu, chụọkwa ya ọhịa na ụzọ. O nwedịrị mgbe ọ fọrọ obere ka ha gbuo ya. Mgbe Jezibel nyere iwu ka e gbuo ọtụtụ n’ime ndị amụma Jehova, o nweghị ihe di ya mere iji gbochie ya. Anyaukwu ha mere ka ha gbaa izu gbuo otu nwoke aka ya dị ọcha, aha ya bụ Nebọt, na ụmụ ya. Ọ bụ ihe a mere ka Ịlaịja zie ya ozi amamikpe Jehova ziri. Ọ gwara ya na Jehova ajụla ya na ezinụlọ ya. Ugbu a, ihe ahụ Jehova kwuru na-emezuzi. Ehab nwụrụ otú ahụ Jehova kwuru.—1 Ndị Eze 18:4; 21:1-26; 22:37, 38; 2 Ndị Eze 9:26.

Ma, Ịlaịja ma na ya ka kwesịkwara ịna-atachi obi n’ihi na Jezibel ka nọ ndụ. Ọ ka nọkwa na-akpa ike ma n’ezinụlọ ya ma n’Izrel niile. A ka nwekwara nsogbu ndị ọzọ ga-abịara Ịlaịja, nweekwa ọtụtụ ihe ọ ga-akụziri Ịlaịsha bụ́ onye ga-anọchi ya. Ka anyị tụlee ọrụ atọ Ịlaịja ka ga-arụ tupu ozi ya akụrụ ọnụ. Ka anyị na-atụle otú okwukwe ya si nyere ya aka ịtachi obi, anyị ga-ahụ ihe anyị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike n’oge a jọgburu onwe ya anyị bi na ya.

Ọ Ga-ama Ehazaya Ikpe

Ehazaya, bụ́ nwa Ehab na Jezibel, bụzi eze Izrel. Ọ mụtaghị ihe n’ihe mere ha, kama o sooro ụzọ ọjọọ nne na nna ya. (1 Ndị Eze 22:52) Ehazaya fere Bel otú ahụ nne na nna ya mere. Ife Bel na-eme ka ndị na-efe ya na-eme ihe ọjọọ, dị ka, ịgba akwụna n’ụlọ arụsị. Ha na-ejidị ụmụ ha achụrụ chi ahụ àjà. Ò nwere ihe ga-eme ka Ehazaya gbanwee ụzọ ya ma mee ka ndị ọ na-achị kwụsị inupụrụ Jehova isi?

Na mberede, ọdachi dakwasịrị eze a dị mpako. O si n’elu ụlọ ya daa ma merụọ ezigbo ahụ́. N’agbanyeghị na ihe ahụ mere ya chọrọ ịta isi ya, ọ rịọghị Jehova ka o nyere ya aka. Kama, o zigara ndị mmadụ ka ha gaa Ekrọn, nke dị na Filistia bụ́ obodo ndị iro ha, gaa jụọ chi a na-akpọ Belzibọb ma ọ̀ ga-agbakekwa n’ọrịa ya. Ihe a were Jehova ezigbo iwe, ya edunye mmụọ ozi ya ka ọ gaa gwa Ịlaịja ka ọ gakwuru ha mgbe ha ka nọ n’ụzọ. Onye amụma ahụ ziri ha ozi na-agba agba ná ntị ha ga-ezi eze ahụ. Ọ gwara ha na Ehazaya emeela ihe jọgburu onwe ya. O mere ka à ga-asị na e nweghị Chineke n’Izrel. Jehova kpebiri na Ehazaya agaghị agbake n’ọrịa ahụ.—2 Ndị Eze 1:2-4.

Ehazaya achọghị ichegharị. Ọ jụrụ ha, sị: “Olee otú nwoke ahụ dị nke gbagotere zute unu wee gwa unu ihe ndị a?” Otú ndị ahụ o zigara si kọwaara ya ụdị uwe nwoke ahụ yi mere ka ọ mata na ọ bụ onye amụma. Uwe ahụ abụghị nke ndị oké ozu. Ehazaya kwuziri ozugbo, sị: “Ọ bụ Ịlaịja.” (2 Ndị Eze 1:7, 8) Anyị kwesịrị iburu n’obi na Ịlaịja ebighị ndụ okomoko. O ji ndụ ya niile jeere Jehova ozi. Ọ bụ ya mere na e nwere ike ịmata ya ma a kọwaa otú uwe ya dị. O doro anya na ọ bụghị otú a ka ọ dị Ehazaya na nne na nna ya. Ha bụ ndị anyaukwu. Akụkọ Ịlaịja na-echetara anyị na anyị kwesịrị ịna-eme ihe ahụ Jizọs gwara anyị. Ọ gwara anyị ka anyị ghara ịna-ebi ndụ okomoko, gwakwa anyị ka anyị na-elekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa.—Matiu 6:22-24.

Obi adịghị Ehazaya mma n’ihi ozi a e ziri ya, ya achọọ imesi Ịlaịja ike. O zigara ndị agha dị mmadụ iri ise na onyeisi ha ka ha gaa kpụtara ya Ịlaịja. Mgbe ha hụrụ ka Ịlaịja “nọ ọdụ n’elu ugwu,” * onyeisi ndị agha ahụ ji ọnụ ọjọọ gwa Ịlaịja na eze sị ya ‘gbadata.’ O nwere ike ịbụ na ihe ihe a ha gwara ya pụtara bụ ka ọ bịa ka a gaa gbuo ya. Legodị, n’agbanyeghị na ha ma na Ịlaịja bụ “onye nke Chineke,” ndị agha ahụ chere na ha ga-eyili ya egwu. Ma, ha agaghị emeli ya. Ịlaịja gwara onyeisi ndị agha ahụ, sị: “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke, ka ọkụ si n’eluigwe daa rechapụ gị na ndị agha iri ise gị.” Chineke mere ihe ozugbo ahụ. “Ọkụ wee si n’eluigwe daa rechapụ ya na ndị agha iri ise ya.” (2 Ndị Eze 1:9, 10) Ihe a mere ndị agha ahụ na-echetara anyị na obi anaghị adị Jehova mma ma ndị mmadụ na-akparị ndị na-ejere ya ozi.—1 Ihe E Mere 16:21, 22.

Ehazaya zigara onyeisi ndị agha ọzọ na ndị agha iri ise. Onyeisi agha nke a dị iberiibe karịa onye nke mbụ. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na ọ mụtaghị ihe n’ọnwụ ndị agha iri ise na otu ahụ n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na ọ hụrụ na ntụ ha ka wụsa n’ala ebe ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụghị naanị na ọ gwara ya ka ọ “gbadata” otú ahụ onyeisi agha nke mbụ ahụ dị mpako kwuru, kama, o tinyere ya “ọsọ ọsọ.” Ihe a gosiri na ọ dị ezigbo iberiibe. Ọ bụ otú a ka ya na ndị ya na ha so si nwụọ ka ndị nke mbụ ahụ. Onye kacha daa iberiibe bụ eze ahụ. N’agbanyeghị ihe ndị ahụ merenụ, o zipụkwara ndị agha ọzọ. Ma, onyeisi ndị agha nke atọ a ka ha mara ihe. O ji nwayọọ bịakwute Ịlaịja, rịọ ya ka ọ ghara igbu ya na ndị agha ya. Ebe ọ bụ na Ịlaịja bụ onye na-efe Chineke, o ṅomiri Jehova ma meere nwoke a dị umeala n’obi ebere. Mmụọ ozi Jehova gwara Ịlaịja ka o soro ha gawa, ya esoro ha gawa. Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ gwaghachiri eze ọjọọ ahụ ihe Jehova kwuru na ọ ga-eme ya. Ehazaya mechara nwụọ otú ahụ Chineke kwuru. Ihe ọ chịrị bụ naanị afọ abụọ.—2 Ndị Eze 1:11-17.

Ịlaịja ṅomiri Jehova ma meere nwoke a dị umeala n’obi ebere

Olee ihe nyeere Ịlaịja aka ịtachi obi n’agbanyeghị na ọ bụ ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke gbara ya gburugburu? Anyịnwa nwere ike ịmụta ihe n’azịza ajụjụ a. Ò nwetụla mgbe ezigbo iwe were gị n’ihi na onye ị hụrụ n’anya jụrụ ige ntị n’ihe ga-abara ya uru ma họrọ ime ihe ga-aghọ ya ahịa? Olee ihe anyị ga-eme ma ụdị ihe a mee? Ebe ndị agha ahụ hụrụ Ịlaịja, ya bụ, “n’elu ugwu,” ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme. Anyị amaghị ihe mere Ịlaịja ji gaa ebe ahụ. Ma, anyị ma na o jighị ekpere egwu egwu. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ọ gara ebe ahụ dị jụụ ka ka ọ nọrọ ebe ahụ kpee ekpere. (Jems 5:16-18) Anyị kwesịkwara ịna-ewepụta oge mgbe naanị anyị nọ, na-akọrọ Chineke ihe niile bụ́ mkpa anyị na ihe niile na-echegbu anyị. Mgbe anyị na-eme otú ahụ, anyị kwesịrị ịna-akpọ ya aha ya. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịtachi obi ọ bụrụgodị na ndị gbara anyị gburugburu na-eme otú o si masị ha.

Ọ Ga-enyefe Onye Ọzọ Ọrụ Ya

Ugbu a, oge eruola ka Ịlaịja nyefee onye ọzọ ọrụ ya. Legodị ihe o mere. Ka ya na Ịlaịsha si obodo Gilgal na-apụ, ọ gwara Ịlaịsha ka ọ nọdụ ebe ahụ ka naanị ya soro gawa Betel, nke dị ihe dị ka kilomita iri na otu ma e si Gilgal gawa ya. Ịlaịsha gwara ya hoo haa, sị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, dịkwa nnọọ ka mkpụrụ obi gị dị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Mgbe ha rutere Betel, Ịlaịja gwara Ịlaịsha na naanị ya ga-aga Jeriko, nke dị ihe dị ka kilomita iri abụọ na abụọ ma e si Betel gawa ya. Ịlaịsha gwakwara ya ihe ahụ ọ gwara ya na nke mbụ. Mgbe ha ruru Jeriko, Ịlaịja gwakwara ya ka ọ nọrọ na Jeriko ka naanị ya gaa Osimiri Jọdan, nke dị ihe dị ka kilomita asatọ ma e si Jeriko gawa ya. Ịlaịsha gwakwara ya otu ihe ahụ. O kweghị ahapụ Ịlaịja.​—2 Ndị Eze 2:1-6.

Ịlaịsha hụrụ Ịlaịja n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ka Rut nwere n’ebe Neomi nọ. Ụdị ịhụnanya a na-eme ka mmadụ ghara ịhapụ ibe ya. (Rut 1:15, 16) Àgwà a dị ndị niile na-efe Chineke mkpa taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ànyị hụrụ ihe mere anyị ji kwesị inwe àgwà a otú ahụ Ịlaịsha nwere?

O doro anya na otú a Ịlaịsha si hụ Ịlaịja n’anya gbara Ịlaịja ezigbo ume. Ọ bụ ihe a mere o ji hụ ọrụ ebube ikpeazụ Ịlaịja rụrụ. Ịlaịja tiri uwe e ji mara ya n’akụkụ Osimiri Jọdan na-asọ asọ ma dị omimi, mmiri ahụ ekewaa abụọ. Ndị ọzọ hụrụ ọrụ ebube a bụ “ndị ikom iri ise n’ime ụmụ ndị amụma.” Ọ ga-abụ na ha so ná ndị a na-azụ ka ha na-ebute ụzọ n’ofufe Chineke n’Izrel. (2 Ndị Eze 2:7, 8) O nwere ike ịbụ Ịlaịja haziri ọzụzụ ahụ. Afọ ole na ole gara aga, e nwere mgbe Ịlaịja chere na ọ bụ naanị ya fọrọ n’ime ndị na-efe Chineke n’obodo ahụ. Kemgbe ahụ, Jehova agọziela Ịlaịja n’ihi ndidi ya. O mere ka ọ hụ ka ndị ohu Chineke na-emekwu nke ọma n’ofufe ha na-efe ya.—1 Ndị Eze 19:10.

Mgbe Ịlaịja na Ịlaịsha gafechara Osimiri Jọdan, Ịlaịja gwara Ịlaịsha, sị: “Rịọ ihe m ga-emere gị tupu e wepụ m n’ebe ị nọ.” Ịlaịja ma na oge ọ ga-apụ eruola. Iwe abịaghị wewe ya na Ịlaịsha ga-anọchizi ya, rụwazie ọrụ ya, a malitezie ịkwanyere ya ùgwù ka onye amụma. Kama, ọ dị njikere inyere ya aka n’ụzọ ọ bụla. Naanị ihe Ịlaịsha rịọrọ ya bụ: “Biko, ọ bụ ka m nweta òkè abụọ nke mmụọ gị.” (2 Ndị Eze 2:9) Ihe ọ rịọrọ abụghị ka e nye ya mmụọ nsọ e nyere Ịlaịja okpukpu abụọ. Kama, ihe ọ na-arịọ bụ ka e nye ya ihe nketa otú ahụ a na-enye ọkpara. Iwu Mozis kwuru ka a na-enye onye bụ́ ọkpara òkè kachanụ ma ọ bụ òkè abụọ ebe ọ bụ ya ga-aghọ onyeisi ezinụlọ. (Diuterọnọmi 21:17) Ebe ọ bụ na ọ na-aga ịnọchi Ịlaịja, ọ ga-abụ na ọ chọpụtara na o kwesịrị inwe obi ike ka Ịlaịja iji nwee ike ịrụ ọrụ e nyere ya.

Ịlaịja agwaghị ya na ya ga-emere ya ihe ahụ ọ rịọrọ ya. Ọ hapụụrụ ya Jehova. Ihe a gosiri na ọ dị umeala n’obi. Ọ bụrụ na Jehova ekwe ka Ịlaịsha hụ Ịlaịja mgbe ọ na-ewepụ ya, ọ pụtara na Chineke ga-emere ya ihe ọ rịọrọ. Ka ndị a bụ́ enyi kemgbe ọtụtụ afọ nọ “na-ekwu okwu ka ha na-aga” n’ụzọ, o nwere ihe dị egwu merenụ.—2 Ndị Eze 2:10, 11.

Enyi Ịlaịja na Ịlaịsha bụ nyeere ha abụọ aka idi nsogbu ndị bịaara ha

Ìhè si na mbara ígwé nwuo ma na-abịaru nso n’ebe Ịlaịja na Ịlaịsha nọ. O nwere ike ịbụ na ebe niile na-azụ wuruwuru, ana-anụkwa mkpọtụ na-eme dị ka ebe oké ifufe na-efe. O nwekwara ihe na-acha ọkụ so ifufe ahụ na-agbadata n’ebe ha nọ. Ọ ga-abụ na ihe a mere ka ụjọ jide ha, ha asụlawa azụ ma gbapụ n’ebe ibe ha nọ. Ha hụrụ ụgbọ agha na-acha ọkụ ọkụ na ịnyịnya ndị na-acha ọkụ ọkụ. Ịlaịja matara na oge ya eruola. Ọ̀ banyere n’ụgbọ agha ahụ? Baịbụl ekwughị. Ma, ihe anyị ma bụ na ọ hụziri onwe ya ka oké ifufe bu ya na-agbago n’eluigwe.

Ezigbo egwu bịara Ịlaịsha, ya anọrọ ebe ahụ na-ele n’anya n’anya. Ebe ọ bụ na Ịlaịsha hụrụ ihe a dị egwu ka ọ na-eme, ọ ma na Jehova ga-enye ya “òkè abụọ” nke mmụọ Ịlaịja ka o nwee obi ike ka ya. Mana, ọ bụghị ihe a ka Ịlaịsha nọ na-eche n’oge ahụ. Ọ na-ewute ya na ọ maghị ebe ezigbo enyị ya nwoke gawara, o cheghịkwa na ọ ga-ahụ ya ọzọ. O tiri mkpu, sị: “Nna m, nna m, ụgbọ ịnyịnya agha Izrel na ndị na-agba ịnyịnya ya!” Ịlaịsha nọ na-ele ezigbo enyi ya ọ hụrụ n’anya ruo mgbe ọ na-ahụghịzi ya. Ihe a wutere ya nke na ọ dọwara uwe ya.—2 Ndị Eze 2:12.

Ịlaịja ọ̀ nụrụ mkpu enyi ya nwoke nọ na-eti mgbe ahụ a na-ebugo ya? Ò bere ákwá n’ihi ya? Nke ọ bụla ọ bụ, o doro ya anya na ọ ma na enyi ya nwoke ahụ nyeere ya aka ịtachi obi ná nsogbu ụfọdụ bịaara ya. Ka anyị gbalịa meta ndị hụrụ Chineke n’anya ma na-achọ ime uche ya enyi, otú ahụ Ịlaịja mere.

Jehova bugara Ịlaịja ebe o nyere ya ọrụ ọzọ

Ọrụ Ikpeazụ Ọ Ga-arụ

Olee ebe Ịlaịja gara? Ụfọdụ okpukpe na-akụzi na e bugoro ya n’eluigwe ka ya na Chineke nọrọ. Mana ọ bụghị eziokwu. Ka ọtụtụ afọ gachara, Jizọs Kraịst kwuru na e nwebeghị onye rigorola n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa. (Jọn 3:13) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị agụọ na ‘Ịlaịja rịgooro n’eluigwe n’oké ifufe,’ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: Olee eluigwe nke ọ bụ? (2 Ndị Eze 2:11) Na Baịbụl, a na-akpọ ebe Chineke bi “eluigwe,” na-akpọkwa mbara ígwé, ebe e nwere urukpuru na ebe nnụnụ na-efegharị, eluigwe. (Abụ Ọma 147:8) Ọ bụ mbara ígwé bụ eluigwe ahụ Ịlaịja rịgoro. Oleezi ihe mere?

Jehova bugara onye amụma a ọ hụrụ n’anya, bụ́ Ịlaịja, ebe o nyere ya ọrụ ọzọ. O nyere ya ọrụ na Juda, bụ́ obodo dị nso n’ebe ọ nọbu. Mgbe ihe dị ka afọ asaa gachara, ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ ka na-arụrụ Chineke ọrụ na Juda. Onye na-achị Juda n’oge ahụ bụ ajọ Eze Jehoram. Eze ahụ lụrụ nwa Ehab na Jezibel. Ihe ọ pụtara bụ na ha ka na-emekwa ihe ọjọọ Ehab na Jezibel mere. Jehova gwara Ịlaịja ka o degara Jehoram akwụkwọ ozi iji zie ya ozi amamikpe. Jehoram mechara nwụọ otú ahụ Jehova kwuru. Ihe jọgburu onwe gbasara ọnwụ ya bụ na Baịbụl kwuru, sị: “Ọ nwụrụ n’enweghị onye nwere mmasị n’ebe ọ nọ.”—2 Ihe E Mere 21:12-20.

Ịlaịja adịtụdịghị ka nwoke ọjọọ a bụ́ Jehoram. Anyị amaghị kpọmkwem mgbe Ịlaịja nwụrụ ma ọ bụ otú o si nwụọ. Ma, anyị ma na ọ nwụghị ka Jehoram, bụ́ onye nwụrụ n’enweghị onye ọnwụ ya wutere. O wutere Ịlaịsha, wutekwa ndị amụma ndị ọzọ. Mgbe ihe dị ka otu puku afọ gachara, Jehova ka na-echeta Ịlaịja. Otú anyị si mata bụ na o so ná ndị Jehova mere ka ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs hụ n’ọhụụ mgbe ahụ Jizọs nwoghara n’ihu ha. (Matiu 17:1-9) Ị̀ ga-achọ inwe okwukwe siri ike n’agbanyeghị nsogbu, otú ahụ Ịlaịja nwere? Ọ bụrụ otú ahụ, meta ndị hụrụ Chineke n’anya enyi, ka ihe ka gị mkpa ná ndụ bụrụ ihe gbasara ofufe Chineke, sikwa n’ala ala obi gị na-ekpe ekpere mgbe niile. I mee otú ahụ, Jehova agaghị echefu gị.

^ par. 9 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na ugwu ahụ e kwuru okwu ya ebe a bụ Ugwu Kamel. Ọ bụ ebe ahụ ka Chineke nọ mee ka Ịlaịja merie ndị amụma Bel n’afọ ole na ole gara aga. Ma, Baịbụl akpọghị aha ugwu ahụ.