Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

2 Timoti 1:7​—“Chineke Enyeghị Anyị Mmụọ nke Ụjọ”

2 Timoti 1:7​—“Chineke Enyeghị Anyị Mmụọ nke Ụjọ”

 “N’ihi na mmụọ nsọ Chineke nyere anyị anaghị eme ka anyị tụwa ụjọ, kama, ọ na-enye anyị ike, na-eme ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya, na-emekwa ka anyị na-ele ihe anya otú dị mma.”​—2 Timoti 1:7, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ, kama mmụọ nke ike, nke ịhụnanya na nke ịkwanyere onwe anyị ugwu.”​—2 Timoti 1:7, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe 2 Timoti 1:7 Pụtara

 Chineke nwere ike inyere mmadụ aka ịkata obi mee ihe dị mma. Ọ chọghị ka anyị na-atụ “ụjọ,” ya bụ, ụdị ụjọ nwere ike ime ka anyị ghara ime ihe dị ya mma.

 Legodị ihe atọ Chineke na-eme ka anyị nwee e kwuru n’amaokwu a ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ.

 “Ike.” Ndị Kraịst akatala obi na-efe Chineke n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ha nakwa nsogbu ndị iro ha obi fere azụ na-enye ha. Ụjọ emebeghị ka ha laa azụ. (2 Ndị Kọrịnt 11:23-27) Olee ihe na-enyere ha aka? Legodị otú Pọl onyeozi si kwuo ya. Ọ sịrị: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Chineke nwere ike inye ndị na-efe ya “ike karịrị ike mmadụ” iji merie nsogbu ọ bụla.​—2 Ndị Kọrịnt 4:7.

 ‘Ịhụ ndị ọzọ n’anya.’ Ịhụ Chineke n’anya nke ukwuu ga-enyere Onye Kraịst aka ịkata obi mee ihe dị mma. Ọ bụrụkwa na Onye Kraịst ahụ ndị ọzọ n’anya, ọ ga-eme ka ọ na-eche gbasara ha karịa onwe ya, ọ bụrụgodị na a na-akpagbu ya ma ọ bụ na o nwere ike ịta isi ya.​—Jọn 13:34; 15:13.

 ‘Ịna-ele ihe anya otú dị mma.’ Mgbe ọ bụla Baịbụl kwuru na mmadụ na-ele ihe anya otú dị mma, ihe ọ na-apụta bụ na onye ahụ na-eji ihe ndị Baịbụl kwuru ekpebi ihe ndị dị mma ọ ga-eme. Onye na-ele ihe anya otú dị mma na-eche echiche nke ọma, ma mgbe ihe siiri ya ike. Ọ na-eme mkpebi ndị gosiri na ọ na-eche echiche otú Chineke chọrọ, na-echeta na adịm ná mma ya na Chineke dị mkpa karịa ihe ndị ọzọ chere.

Ihe Ndị Gbara 2 Timoti 1:7 Gburugburu

 Ọ bụ Pọl onyeozi dere akwụkwọ Timoti nke Abụọ. O degaara ya Timoti, bụ́ ezigbo enyi ya na onye ya na ya na-arụkọ ọrụ. N’akwụkwọ ozi a, Pọl medara obi gbaa ya ume ka o jisie ike na-emekwu nke ọma n’ozi ọma. (2 Timoti 1:1, 2) Ọ ga-abụ na Timoti bụ onye ihere, nke nwere ike ime ka ọ ghara ịna-eme ihe niile ọ ga-emeli n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Timoti 4:12) Ma Pọl chetaara Timoti na e nwere onyinye e nyere ya, ya bụ, ọrụ pụrụ iche e nyere ya n’ọgbakọ. Pọl gwara Timoti ka ụjọ ghara ịtụ ya mgbe o ji ikike o nwere ịbụ okenye na-arụ ọrụ n’ọgbakọ, mgbe ọ na-ezi ozi ọma, nakwa mgbe a na-akpagbu ya n’ihi okwukwe ya.​—2 Timoti 1:6-8.

 Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Timoti ka Pọl gwara ihe a, ihe o kwuru na-eme ka obi sie ndị niile chọrọ ife Chineke taa ike na Chineke ga-enyere ha aka ime otú ahụ n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara ha.