Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Tora?

Gịnị Bụ Tora?

Ihe Baịbụl kwuru

Okwu bụ́ “Tora” si n’okwu Hibru bụ toh·rahʹ, nke nwere ike ịpụta “ntụziaka,” “nkụzi” ma ọ bụ “iwu.” * (Ilu 1:8; 3:1; 28:4) Ihe atụ ndị na-esonụ na-egosi otú e si kọwaa ihe okwu Hibru ahụ bụ Tora pụtara na Baịbụl.

  • Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ akwụkwọ ise ndị mbụ nke Baịbụl Tora. Ha bụ: Jenesis, Ọpụpụ, Levitikọs, Ọnụ Ọgụgụ na Diuterọnọmi. N’asụsụ Grik, a na-akpọ ha Pentatuk, nke pụtara “otu mpịakọta nwere nkebi ise.” Ọ bụ Mozis dere Tora. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya “akwụkwọ Iwu Mozis.” (Jọshụa 8:31; Nehemaya 8:1) Na mbụ, e dere ya n’otu akwụkwọ ma mechaa kewasịa ya ka ọ dị mfe ọgụgụ, dịkwa mfe nghọta.

  • A na-akpọkwa iwu e nyere mba Izrel banyere ihe ụfọdụ Tora. Dị ka ihe atụ “iwu [toh·rahʹ] metụtara àjà mmehie,” “iwu banyere ekpenta,” nakwa “iwu banyere onye Naziraịt.”​—Levitikọs 6:​25; 14:57; Ọnụ Ọgụgụ 6:​13.

  • Mgbe ụfọdụ, Toh·rahʹ nwere ike ịpụta ntụziaka na nkụzi, ma ò si n’aka ndị nne na nna, ndị mara ihe, ma ọ bụ n’aka Chineke.​—Ilu 1:8; 3:1; 13:14; Aịzaya 2:3.

Olee ihe ndị dị na Tora ma ọ bụ Pentatuk?

  • Akụkọ ihe mere eme gbasara otú Chineke si mesoo ụmụ mmadụ malite mgbe Chineke bidoro ike ihe ruo mgbe Mozis nwụrụ.​—Jenesis 1:​27, 28; Diuterọnọmi 34:5.

  • Ihe ndị dị n’Iwu Mozis. (Ọpụpụ 24:3) E nwere ihe karịrị narị iwu isii n’Iwu ahụ. Nke kacha gbaa ọkpụrụkpụ n’ime ha bụ Shema, ma ọ bụ nkwupụta nke okwukwe ndị Juu. Otu ihe e dere na Shema bụ: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Diuterọnọmi 6:4-9) Jizọs kwuru na nke a bụ “iwu kasị ukwuu bụrụkwa nke mbụ.”​—Matiu 22:36-​38.

  • Aha ahụ bụ́ Jehova gbara na ya ugboro otu puku na narị asatọ. Na Tora, e nwere iwu kwuru na ndị mmadụ kwesịrị ịna-akpọ aha Chineke, o gbochighị ndị mmadụ ịkpọ ya.​—Ọnụ Ọgụgụ 6:​22-​27; Diuterọnọmi 6:​13; 10:8; 21:5.

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara Tora

Ụgha: Iwu Tora na-adịru ebighi ebi, a gaghịkwa ahapụ ya.

Eziokwu: Ná nsụgharị Baịbụl ụfọdụ, e kwuru na ihe ụfọdụ e dere na Tora, dị ka ihe gbasara Ụbọchị izu ike, ndị nchụàjà na Ụbọchị Mkpuchi Mmehie “ga-adị ruo ọgbọ ha niile” ma ọ bụ “ọgbụgba ndụ ebighị ebi.” (Ọpụpụ 31:16; 40:15; Levitikọs 16:33, 34, Nsụgharị Union Version) Ma, okwu Hibru e dere n’amaokwu ndị ahụ nwekwara ike ịpụta mgbe a na-amaghị ama, ọ bụghị mgbe ebighị ebi. * Mgbe ihe dị ka narị afọ itoolu Chineke na ụmụ Izrel ji iwu Mozis gbaa ndụ gachara, Chineke buru amụma na ya ga-eji “ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie ya.” (Jeremaya 31:31-33) Mgbe Chineke “sịrị ‘ọgbụgba ndụ ọhụrụ,’ o mewo ka [ọgbụgba ndụ] nke mbụ bụrụ ihe oge ya gafeworo.” (Ndị Hibru 8:7-13) N’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, e nweziri ọgbụgba ndụ ọhụrụ e ji dochie ọgbụgba ndụ ochie ahụ.​—Ndị Efesọs 2:​15.

Ụgha: E kwesịrị idebe iwu ndị dị n’akwụkwọ okpukpe ndị Juu bụ Talmud nakwa omenala ndị Juu a na-edeghị n’Iwu Chineke otú ahụ e si edebe iwu ndị e dere na Tora.

Eziokwu: O nweghị ebe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na Chineke nyere Mozis iwu ndị ọzọ a na-edeghị ede ha kwesịrị idebe mgbe o nyechara ha iwu ndị e dere na Tora. Kama, Baịbụl kwuru sị: “Jehova wee gaa n’ihu ịsị Mozis: ‘Deere onwe gị okwu ndị a.’” (Ọpụpụ 34:27) E mechara detuo iwu ndị ahụ a na-edeghị ede n’otu akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Mishnah, mechazie denye ya n’akwụkwọ okpukpe ndị Juu bụ́ Talmud. Ihe juru na ya bụ́ omenala ndị Juu ndị Farisii chepụtara. Ọtụtụ mgbe, ihe dị n’omenala ndị ahụ na-adị iche n’ihe ndị e dere na Tora. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị Farisii, sị: “Unu emewo ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi ọdịnala unu.”—Matiu 15:​1-9.

Ụgha: E kwesịghị ịkụziri ụmụ nwaanyị Tora.

Eziokwu: Otu n’ime ihe e kwuru n’Iwu Mozis bụ ka a gụọrọ ndị Izrel niile Iwu ahụ dum, ma ụmụ nwaanyị ma ụmụntakịrị. N’ihi gịnị? “Ka ha wee gee ntị, ka ha mụtakwa ihe, ka ha tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke [ha] ma lezie anya idebe ihe niile e kwuru n’iwu [ahụ].”​—Diuterọnọmi 31:10-​12. *

Ụgha: E nwere ihe ndị e dere na Tora nke ihe ha pụtara dị iche n’ihe e dere.

Eziokwu: Onye dere ihe ndị dị na Tora, bụ́ Mozis kwuru na ihe e dere na ya doro anya dịkwa mfe nghọta, ha adịghị mgbagwoju anya. (Diuterọnọmi 30:11-14) Ihe mere ụfọdụ ndị ji ekwu na ihe ndị e dere na Tora nwere ihe ndị dị iche ha pụtara bụ n’ihi ihe omimi dị iche iche ndị Juu kweere a kpọrọ Kabbalah. Ha na-eji “akọ chepụta” otú ha ga-esi na-akọwa Akwụkwọ Nsọ. *​—2 Pita 1:​16.

^ par. 1 Lee mbipụta e degharịrị edegharị nke akwụkwọ bụ́ The Strongest Strong’s Exhaustive Concordance of the Bible, ihe odide nke 8451 ná nkebi bụ́ “Hebrew-Aramaic Dictionary-Index to the Old Testament.”

^ par. 9 Lee akwụkwọ bụ́ Theological Wordbook of the Old Testament, Mpịakọta nke 2, peeji nke 672-​673.

^ par. 13 N’Iwu ndị Juu, a naghị ekwe ụmụ nwaanyị gụọ Tora, mana ihe e kwuru na Tora bụ na onye ọ bụla kwesịrị ịgụ ya. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Mishnah kwuru ihe otu onye Rabaị aha ya bụ Eliezer ben Hyrcanus kwuru. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla na-akụziri nwa ya nwaanyị Tora, na-akụziri ya okwu rụrụ arụ.” (Sotah 3:4) E dekwara ụdị ihe a n’akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Talmud nke Jeruselem. Ọ sịrị: “Kama a ga-akụziri ụmụ nwaanyị Tora, ọ ka mma na a gbara ya ọkụ.”—Sotah 3:​19a.

^ par. 15 Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Judaica kwuru otú ndị Juu kweere n’ihe omimi dị iche iche si were Tora. Ọ sịrị: “Tora enweghị otu ihe doro anya ọ pụtara, kama e nwere ọtụtụ ihe dị iche iche ọ pụtara n’ebe dị iche iche.”—Mbipụta nke abụọ, Mpịakọta nke 11, peeji nke 659.