Gaa n'Isiokwu

Ònye Bụ Nwunye Ken?

Ònye Bụ Nwunye Ken?

Ihe Baịbụl Kwuru

Ken bụ nwa mbụ nwoke mbụ na nwaanyị mbụ mụrụ. Ọ lụrụ otu n’ime ụmụnne ya ma ọ bụ onye ikwu ya. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ ihe Baịbụl kwuru gbasara Ken na ndị ezinụlọ ha.

Ihe bụ eziokwu gbasara Ken na ndị ezinụlọ ha

  • Ọ bụ Adam na Iv mụrụ onye ọ bụla dị ndụ. Chineke ‘sitere n’otu mmadụ [Adam] mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.’ (Ọrụ Ndịozi 17:26) Nwunye Adam bụ́ Iv ghọrọ, “nne nke onye ọ bụla dị ndụ.” (Jenesis 3: 20) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na Ken lụrụ onye Adam na Iv mụkwara.

  • Ken na nwanne ya nwoke Ebel bụ ndị Iv bu ụzọ mụọ n’ime ụmụ niile ọ mụrụ. (Jenesis 4: 1, 2) Mgbe a chụpụrụ Ken n’ihi na o gburu nwanne ya, ọ sịrị: “Onye ọ bụla hụrụ m ga-egbu m.” (Jenesis 4: 14) Olee onye Ken na-atụ ụjọ na ọ ga-egbu ya? Baịbụl kwuru na Adam “mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.” (Jenesis 5:4) Ọ ga-abụ na ndị Ken na-atụ ụjọ na ha ga-egbu ya bụ ụmụ ndị ọzọ ahụ Adam na Iv mụrụ.

  • N’oge ochie, mmadụ ịlụ nwanne ya abụghị ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, nwoke ezi omume bụ́ Ebreham lụrụ nwanne ya nwaanyị. (Jenesis 20:12) Ebe mbụ a machiri mmadụ ịlụ nwanne ya bụ n’Iwu Mozis. E mere iwu a ọtụtụ afọ Ken nwụchara. (Levitikọs 18: 9, 12, 13) O yiri ka ụmụ ndị lụrụ nwanne ha n’oge ahụ na-amụta anaghị enwe nkwarụ otú ahụ ndị nke oge a na-enwe.

  • Ihe Baịbụl kọrọ gbasara Adam na Iv, na ndị ezinụlọ ha bụ eziokwu. Ọ bụghị naanị na Jenesis, bụ́ nke Mozis dere, ka e dere usoro ọmụmụ Adam. Ezra na Luk bụ́ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme dekwara ya n’akwụkwọ ha dere. (Jenesis 5: 3-5;1 Ihe E Mere 1: 1-4; Luk 3: 38) Ndị dere Baịbụl mere ka anyị mara na akụkọ Ken bụ ihe mere eme.—Ndị Hibru 11:4; 1 Jọn 3:12; Jud 11.