Gaa n'Isiokwu

Olee Otú Jizọs Dị?

Olee Otú Jizọs Dị?

Ihe Baịbụl kwuru

O nweghị onye ma otú Jizọs dị n’ihi na Baịbụl akọwaghị otú ọ dị n’elu ahụ. Ihe nke ahụ gosiri bụ na otú Jizọs dị n’elu ahụ́ adịghị mkpa. Mana, Baịbụl kwuru ihe nwere ike inyere anyị aka ịmata otú Jizọs dị.

  • Otú ọ dị: Jizọs bụ onye Juu. O nwere ike ịbụ na o yiri mama ya bụ́kwa onye Juu. (Ndị Hibru 7:14) Ọ yighị ka ọdịdị ya ọ̀ dị iche na nke ndị ọzọ. E nwere mgbe o si Galili gaa Jeruselem n’enweghị onye matara na ọ bụ ya. (Jọn 7:10, 11) O dokwara anya na otú ọ dị adịghị iche na otú ndị na-eso ụzọ ya dị. Cheta na ọ bụ Judas Iskarịọt mere ihe ndị ahụ bịara ijide ya ji mara na ọ bụ ya bụ Jizọs.​—Matiu 26:47-49.

  • Otú ntutu isi ya hà: O yighị ka ntutu isi Jizọs ò toro ogologo n’ihi na Baịbụl sịrị na “ọ bụrụ na nwoke enwee ogologo ntutu isi, ọ bụụrụ ya ihe ihere.”—1 Ndị Kọrịnt 11:14.

  • Otú afụ ọnụ ya hà: Jizọs ruwere afụ ọnụ. O mere ihe dị n’iwu ndị Juu bụ nke machiri ụmụ nwoke ịkpụchapụ “ọnụ ọnụ ajị agba” ha. (Levitikọs 19:27; Ndị Galeshia 4:4) N’amụma e buru gbasara ahụhụ Jizọs ga-ata, Baịbụl kpọtụrụ ajị agba ya aha.​—Aịzaya 50:6.

  • Otú ahụ́ ya dị: Ihe niile e kwuru na Baịbụl gosiri na ahụ́ gbasiri Jizọs ike. Mgbe ọ na-aga ozi ọma, ọ gara iji ọtụtụ maịl. (Matiu 9:35) Ọ chụpụrụ ndị na-ere ahịa n’ụlọ nsọ ugboro abụọ, kpuo tebụl ndị na-agbanwe ego n’ala, jiri ụtarị chụpụ ndị niile na-ere atụrụ na ehi ebe ahụ. (Luk 19:45, 46; Jọn 2:14, 15) Ọtụ akwụkwọ a na-akpọ McClintock and Strong’s Cyclopedia Mpịakọta nke IV, peeji nke 884 kwuru sị: “Ihe niile e dere n’Oziọma gosiri na ahụ́ gbasiri Jizọs ike.”

  • Otú ihu ya na-adị: Jizọs na-emesapụ ihu, o nwekwara obiọma. O doro anya na otú ihu ya na-adị gosiri ya. (Matiu 11:28, 29) Mmadụ niile na-abịakwute ya ka o nyere ha aka. (Luk 5:12, 13; 7:37, 38) Obi na-erudị ụmụaka ala ma ha na ya nọrọ.​—Matiu 19:13-15; Mak 9:35-37.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu banyere otú Jizọs dị

Ụgha: Ụfọdụ sị na ọ ga-abụrịrị na Jizọs bụ onye Afrịka n’ihi na akwụkwọ Mkpughe ji ntutu isi ya tụnyere owu jirikwa ụkwụ ya tụnyere “ezigbo ọla kọpa.”​—Mkpughe 1:14, 15.

Eziokwu: Ihe ụfọdụ e dere n’akwụkwọ Mkpughe bụ “ihe atụ.” (Mkpughe 1:1) E ji otú e si kọwaa ntutu isi ya na ụkwụ ya kọwaa àgwà ndị o nwere mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ bụghị otú ọ dị mgbe ọ nọ n’ụwa. Mkpughe 1:14 kwuru na “isi ya na ntutu isi ya na-achakwa ọcha dị ka owu ọcha, dị ka snoo.” Ihe a na-ekwu okwu ya ebe a abụghị otú ntutu isi ya dị, kama, ọ bụ otú ọ na-acha. Otú isi ya na-acha nọchiri anya amamihe ihe o nwere, n’ihi na ọ dịla anya e kere ya. (Mkpughe 3:14) Ebe a anaghị ekwu na isi Jizọs dị ka owu ma ọ bụ na ọ dị ka snoo.

Ụkwụ Jizọs dị ka “ezigbo ọla kọpa nke na-egbukepụ n’oké ọkụ.” (Mkpughe 1:15) Ihu ya dịkwa ka “anyanwụ nke na-achasi ike.” (Mkpughe 1:16) Ebe ọ bụ na e nweghị ndị akpụkpọ ahụ́ ha na-acha otú a, ọ ga-abụ na e ji ya gosi na Jizọs bụ “onye bi n’ìhè a na-apụghị iru nso” mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ.​—1 Timoti 6:16.

Ụgha: Jizọs akpaghị ume.

Eziokwu: Ihe ndị Jizọs mere gosiri na ọ bụ dimkpa. Dị ka ihe atụ, mgbe ìgwè mmadụ bịara ijide ya, ọ gwara ha na ọ bụ ya ka ha na-achọ. (Jọn 18:4-8) Ọ ga-abụrịrị na Jizọs gbasiri ike mere o ji bụrụ ọkwá nkà na-eji ngwá ọrụ siri ike arụ ọrụ.​—Mak 6:3.

Oleezi ihe mere e ji sị mmadụ nyere Jizọs aka buru osisi ịta ahụhụ ya? Oleekwa ihe mere o ji buru ndị ọzọ a kpọgidere ha na ya n’elu osisi ụzọ nwụọ? (Luk 23:26; Jọn 19:31-33) Tupu akpọgbuo Jizọs, ezigbo ike gwụrụ ya. Ọ mụ anya n’abalị bọtara ụbọchị ahụ niile. Ihe so kpata ya bụ na obi erughị ya ala. (Luk 22:42-44) Ndị Juu rụsara ya arụrụala n’abalị ahụ, ndị Rom akụọ ya duka duka n’ụtụtụ ya. (Matiu 26:67, 68; Jọn 19:1-3) O nwere ike ịbụ ihe ndị a niile so mee ka ọ nwụọ ọsọ ọsọ.

Ụgha: O nweghị mgbe ihu tọrọ Jizọs ọchị.

Eziokwu: Jizọs mere nnọọ ka Nna ya nke eluigwe, bụ́ onye Baịbụl kpọrọ “onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11; Jọn 14:9) Jizọs kụzidịịrị ndị ọzọ ihe ha ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ. (Matiu 5:3-9; Luk 11:28) Ihe ndị a niile gosiri na otú ihu Jizọs na-adị na-egosi na ọ bụ onye obi na-adị ya ụtọ.