Olee Otú M Ga-esi Amata Ezigbo Okpukpe?
Ihe Baịbụl kwuru
Baịbụl ji ihe atụ mee ka a mata ihe dị iche ná ndị na-ekpe ezigbo okpukpe na ndị na-anaghị ekpe ezigbo okpukpe. Ọ sịrị: “Unu ga-eji mkpụrụ ha mata ha. Ndị mmadụ anaghị aghọrọ mkpụrụ vaịn n’ogwu ma ọ bụ mkpụrụ fig n’uke.” (Matiu 7:16) Otú ahụ a na-esi n’ihe osisi nke ọ bụla mịpụtara amata nke bụ́ osisi vaịn na osisi ogwu, ka i nwekwara ike isi n’ihe ndị nọ n’okpukpe dị iche iche na-eme, ya bụ, mkpụrụ ha na-amị mata ma okpukpe ha ọ̀ bụ nke ezigbo ya.
Ezigbo okpukpe na-akụzi eziokwu ndị dị na Baịbụl, ọ bụghị echiche ụmụ mmadụ. (Jọn 4:24; 17:17) Ọ na-akụzi eziokwu gbasara mkpụrụ obi nakwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs. (Abụ Ọma 37:29; Aịzaya 35:5, 6; Ezikiel 18:4) Ọ na-agbakwa ụgha ndị okpukpe na-agha n’anwụ.—Matiu 15:9; 23:27, 28.
Ezigbo okpukpe na-enyere ndị mmadụ aka ịmata onye Chineke bụ, na-akụzikwara ha na aha Chineke bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18; Aịzaya 42:8; Jọn 17:3, 6) Ọ naghị akụzi na Jehova nọ anyị ebe dị anya ma ọ bụ na anyị agaghị amatali ụdị onye ọ bụ. Kama, ọ na-akụzi na Jehova chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi.—Jems 4:8.
Ezigbo okpukpe na-akụzi na Jizọs Kraịst bụ onye Chineke si n’aka ya azọpụta ndị mmadụ. (Ọrụ Ndịozi 4:10, 12) Ndị na-ekpe ezigbo okpukpe na-eme ihe Jizọs nyere n’iwu, na-agbakwa mbọ ịna-eme ka ya.—Jọn 13:15; 15:14.
Ezigbo okpukpe kweere na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụ nsogbu niile dị n’ụwa a. Ndị na-ekpe ezigbo okpukpe na-agbasi mbọ ike ịgwa ndị ọzọ gbasara Alaeze a.—Matiu 10:7; 24:14.
Ezigbo okpukpe na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-ahụ ndị ọzọ n’anya n’atụghị anya irite ihe ọ bụla n’aka ha. (Jọn 13:35) Ọ na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-akwanyere onye ọ bụla ùgwù ma ghara ịkpọ mmadụ asị n’agbanyeghị agbụrụ ya, omenala ya, ma ọ bụ asụsụ ya. (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Ndị na-ekpe ezigbo okpukpe anaghị alụ agha n’ihi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya.—Maịka 4:3; 1 Jọn 3:11, 12.
Ezigbo okpukpe enweghị ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ. A naghịkwa etu ndị na-akụziri ha ihe okpookpo aha.—Matiu 23:8-12; 1 Pita 5:2, 3.
Ezigbo okpukpe anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:16; 18:36) Ma, ndị na-ekpe ezigbo okpukpe na-asọpụrụ ma na-erubere ndị ọchịchị obodo ha isi. Ha si otú a na-eme ihe Baịbụl kwuru, ya bụ, “kwụọnụ Siza ihe Siza [Siza nọchiri anya ndị ọchịchị], ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”—Mak 12:17; Ndị Rom 13:1, 2.
Ndị na-ekpe ezigbo okpukpe na-akpa àgwà dị mma mgbe niile, ọ bụghị ihe ha na-eme iji mezuo iwu. Ha na-eso ezigbo ntụziaka dị na Baịbụl gbasara omume ọma na omume ọjọọ n’ihe niile ha na-eme. (Ndị Efesọs 5:3-5; 1 Jọn 3:18) Ma, ọ pụtaghị na ha anaghị ekpori ndụ, kama, ha na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-efe “Chineke, onye obi ụtọ.”—1 Timoti 1:11.
Ndị na-ekpe ezigbo okpukpe dị ole na ole. (Matiu 7:13, 14) A na-eledakarị ndị na-ekpe ezigbo okpukpe anya, na-achị ha ọchị, na-akpagbukwa ha n’ihi na ha na-eme uche Chineke.—Matiu 5:10-12.
Ezigbo okpukpe abụghị naanị okpukpe ọ bụla masịrị mmadụ
Ọ bụrụ na ihe mere anyị ji ekpe okpukpe anyị na-ekpe bụ naanị maka otú o si amasị anyị, ọ pụtara na nsogbu dị. Baịbụl kwuru na e nwere oge ndị mmadụ ‘ga-akpọkọtara onwe ha ndị [okpukpe] ga na-akụziri ha ihe ha chọrọ ịnụ.’ (2 Timoti 4:3) Ma, Baịbụl gwara anyị ka anyị soro ndị na-ekpe “okpukpe dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị,” ọ bụrụgodị na ọ bụghị okpukpe ọtụtụ ndị na-ekpe—Jems 1:27 na ihe e dere n’ala ala peeji ya; Jọn 15:18, 19.

