Gaa n'Isiokwu

Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ​—Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Nkịtị?

Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ​—Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Nkịtị?

Ihe Baịbụl kwuru

Iju Mmiri ahụ mere eme n’ụwa a. Chineke ji ya bibie ndị ajọ mmadụ juru ụwa mgbe ahụ, ma gwa Noa ka ọ rụọ ụgbọ o ji chebe ndị ezigbo mmadụ na ụmụ anụmanụ. (Jenesis 6:​11-20) Otu ihe mere anyị ga-eji kweta na Iju Mmiri ahụ mere eme bụ na e dere ya n’Akwụkwọ Nsọ, nke bụ́ akwụkwọ e “si n’ike mmụọ nsọ Chineke” dee.​—2 Timoti 3:16.

 Ò mere eme ka ọ̀ bụ akụkọ ifo?

Baịbụl kwuru na Noa bụ onye dịrị ndụ n’ụwa a, kwuokwa na Iju Mmiri ahụ mere eme, ọ bụghị akụkọ ifo.

  • Ndị so dee Baịbụl kwetara na Noa bụ onye dịrị ndụ n’ụwa a. Dị ka ihe atụ, mmadụ abụọ so dee Baịbụl, bụ́ Ezra na Luk, bụ ndị na-akọ akụkọ ihe ndị mere n’oge ochie. Ha lezikwara anya nke ọma mgbe ha na-akpọ aha ndị nna nna mba Izrel. Ebe ọ bụ na ha denyere aha Noa, o gosiri na ọ bụ onye dịrị ndụ n’eziokwu. (1 Ihe E Mere 1:4; Luk 3:36) Matiu na Luk, ndị so dee gbasara ozi Jizọs, dekwara ihe ndị Jizọs kwuru banyere Noa na Iju Mmiri ahụ.​—Matiu 24:​37-39; Luk 17:​26, 27.

    Ezikiel onye amụma na Pọl onyeozi kwukwara na Noa bụ onye anyị ga-esi n’aka ya mụta ime ezi omume na inwe okwukwe. (Ezikiel 14:​14, 20; Ndị Hibru 11:7) Ò nwere uru ọ bara ma ọ bụrụ na ọ bụ onye na-enweghị mgbe ọ dịrị ndụ ka ha chọrọ ka anyị mụta ihe n’aka ya? O doro anya na Noa na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ rubeere Chineke isi bụ ndị anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ha n’ihi na ha bụ ndị biri ndụ n’ụwa a.​—Ndị Hibru 12:1; Jems 5:17.

  • Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ kpọmkwem banyere Iju Mmiri ahụ. Mgbe Baịbụl kọrọ maka Iju Mmiri ahụ, o bidoghị ya otú e si ebido akụkọ ifo dị ka ịsị “O ruru otu ụbọchị,” ka a ga-asị na ọ bụ akụkọ ifo. Kama nke ahụ, Baịbụl kwuru afọ, ọnwa na ụbọchị ihe niile mere n’oge Iju Mmiri ahụ mere. (Jenesis 7:11; 8:​4, 13, 14) O kwukwara otú ụgbọ Noa ahụ hà. (Jenesis 6:15) Ihe ndị a Baịbụl kwuru gbasara ụgbọ ahụ mere ka anyị mata na akụkọ Iju Mmiri ahụ mere eme, ọ bụghị akụkọ ifo.

 Gịnị mere e ji nwee Iju Mmiri ahụ?

Baịbụl kwuru na tupu Iju Mmiri ahụ, “ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu.” (Jenesis 6:5) O kwukwara na ‘ụwa bụ ihe e bibiri ebibi n’anya ezi Chineke’ n’ihi na ime ihe ike na ịkwa iko jupụtara n’ụwa.​—Jenesis 6:11; Jud 6, 7.

Baịbụl kwuru na isi sekpụ ntị butere nsogbu n’ụwa mgbe ahụ bụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi, ndị hapụrụ eluigwe bịa n’ụwa kpọrọ ụmụ nwaanyị ha na ha enwee mmekọahụ. Ndị mmụọ ozi a mụtara ụmụ a kpọrọ ndị Nefilim, ndị rụsara ndị bi n’ụwa n’oge ahụ arụrụala dị egwu. (Jenesis 6:​1, 2, 4) Chineke kpebiziri na ya ga-ekpochapụ ndị ọjọọ niile ahụ n’ụwa ka ndị ezi mmadụ fọrọ n’ụwa nwee ike ibido ndụ n’isi.​—Jenesis 6:​6, 7, 17.

 Ndị mmadụ hà ama na-aga enwe Iju Mmiri?

Ee. Chineke gwara Noa ihe ga-emenụ ma gwa ya ka ọ rụọ ụgbọ a ga-eji zọpụta ma ndị ezinụlọ ya ma ụmụ anụmanụ. (Jenesis 6:​13, 14; 7:​1-4) Noa mekwara ka ndị mmadụ mara ihe na-aga ime, ma ha egeghị ya ntị. (2 Pita 2:5) Baịbụl kwuru, sị: “Ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile.”​—Matiu 24:​37-39.

 Olee otú ụgbọ Noa dị?

Ụgbọ ahụ yiri akpati ma ọ bụ igbe toro ogologo, nke dị ihe dị ka otu narị mita na iri atọ na atọ n’ogologo, mita iri abụọ na abụọ n’obosara, ebe ịdị elu ya bụ mita iri na atọ. * E ji osisi gofa rụọ ya, jirikwa korota techie ya ime na azụ. Ọ dị okpukpu atọ, e kebisikwere ime ya ekebi. Ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ dị n’akụkụ ya, ọ dịkwa ka windo ya dị n’ebe elu ya. O yiri ka a rụlitere ihe e ji kụchie elu ụgbọ ahụ elu ka mmiri wụsara na ya nwee ike ịna-agbapụ agbapụ.​—Jenesis 6:​14-16.

 Afọ ole ka ò were Noa ịrụ ụgbọ ahụ?

Baịbụl ekwughị afọ ole o were Noa ịrụ ụgbọ ahụ, ma o yiri ka ò ji ihe dị ka iri afọ anọ ma ọ bụ iri afọ ise rụọ ya. Noa akarịala narị afọ ise mgbe a mụrụ nwa ya nke mbụ, ọ dịkwa narị afọ isii mgbe Iju Mmiri ahụ bidoro. *​—Jenesis 5:32; 7:6.

Ọ bụ mgbe ụmụ Noa atọ torola ogo mmadụ ma lụọ nwaanyị ka Chineke gwara Noa ka ọ rụọ ụgbọ. Nke a pụtakwara na ihe dị ka iri afọ ise ma ọ bụ isii agaala mgbe ahụ. (Jenesis 6:​14, 18) N’ihi ya, ọ dịghị njọ ikwu na o nwere ike ịbụ na ịrụcha ụgbọ ahụ were iri afọ anọ ma ọ bụ iri afọ ise.

^ par. 9 Na Baịbụl e ji kubit kọwaa otú akụkụ dị iche iche n’ụgbọ ahụ hà. Otu akwụkwọ ji ihe osise akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na “ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kubit ndị Hibru bụ 44.45 sentimita (ma ọ bụ 17.5 inch).”​—The Illustrated Bible Dictionary, Revised Edition, Part 3, peeji nke 1635.

^ par. 10 Ị chọọ ịma afọ ole ndị dị ka Noa dịruru ndụ, gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Dịrị Ndụ n’Oge Baịbụl Hà Dịrị Ogologo Ndụ Otú E Kwuru na Ha Dịrị?” nke gbara n’Ụlọ Nche December 1, 2010.