Gaa n'Isiokwu

Gịnị ka Baịbụl Kwuru Banyere Ọdachi Ndị na-Emere Onwe Ha?

Gịnị ka Baịbụl Kwuru Banyere Ọdachi Ndị na-Emere Onwe Ha?

Ihe Baịbụl kwuru

Ọ bụghị Chineke ka ọdachi ndị na-emere onwe ha n’ụwa taa si n’aka, kama ọ na-eche banyere ndị ọdachi dakwasịrị. Ọdachi ndị na-emere onwe ha so ná nsogbu ndị Alaeze Chineke ga-ewepụrụ anyị. Ka ọ dịgodị, Chineke na-akasi ndị niile ọdachi ndị na-emere onwe ha dakwasịrị obi.​—2 Ndị Kọrịnt 1:3.

 Gịnị mere anyị ji kweta na ọdachi ndị na-emere onwe ha abụghị ntaramahụhụ si n’aka Chineke?

Ihe ndị Baịbụl kọrọ gosiri na otú ọdachi ndị na-emere onwe ha si eme dị iche na otú Chineke si eji ihe ndị o kere eke egosi ike ya.

  • Ọdachi ndị na-emere onwe ha na-egbu ma ndị ọma ma ndị ọjọọ. Ma na Baịbụl, n’ebe ndị a kọrọ otú Chineke si jiri ihe ndị o kere eke kpee ndị mmadụ ikpe, naanị ndị ajọ omume ka e gburu. Dị ka ihe atụ, n’oge ochie mgbe Chineke bibiri obodo Sọdọm na Gọmọra, o chebere nwoke ezi omume ahụ bụ́ Lọt na ụmụ ya nwaanyị abụọ. (Jenesis 19:​29, 30) Chineke hụrụ otú obi onye nke ọ bụla bi n’ebe ahụ dị ma bibie naanị ndị ọ ma na ha bụ ndị ajọ omume.​—Jenesis 18:​23-32; 1 Samuel 16:7.

  • Ọdachi ndị na-emere onwe ha anaghị ama ọkwa tupu ya emee, mgbe ụfọdụ o nweghị onye na-amadị mgbe ọ chọrọ ime. Ma, Chineke dọrọ ndị ajọ omume aka ná ntị tupu ya ejiri ihe ndị o kere eke bibie ha. Ndị rubere isi n’ịdọ aka ná ntị Chineke nwere ohere ịgbanahụ ọdachi ahụ.​—Jenesis 7:​1-5; Matiu 24:​38, 39.

  • Mgbe ụfọdụ, ụmụ mmadụ na-eso akpata ọdachi ndị na-emere onwe ha. Olee otú ha si eme ya? Ha na-emebi gburugburu ebe ndị mmadụ bi, na-ewu ụlọ n’ebe a na-enwekarị ala ọma jijiji, idei mmiri na oké ifufe. (Mkpughe 11:18) Ọ bụghị Chineke ka e kwesịrị ịta ụta mgbe ihe ndị a kpataara ndị mmadụ nsogbu.​—Ilu 19:3.

 Ọdachi ndị na-emere onwe ha hà so n’ihe ndị na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ?

Ee, Baịbụl buru amụma na a ga-enwe ọdachi ndị na-emere onwe ha n’oge “ọgwụgwụ usoro ihe a,” ma ọ bụ “n’oge ikpeazụ.” (Matiu 24:32; 2 Timoti 3:1) Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru gbasara oge anyị a, sị: “A ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.” (Matiu 24:7) N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ewepụ ihe niile na-akpata nsogbu na nhụjuanya n’ụwa a, ọdachi ndị na-emere onwe ha sokwa.​—Mkpughe 21:​3, 4.

 Olee otú chineke si enyere ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha dakwasịrị aka?

  • Chineke na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl akasi ha obi. Baịbụl mesiri anyị obi ike na Chineke na-eche banyere anyị nakwa na ọ na-ewute ya ma anyị na-ata ahụhụ. (Aịzaya 63:9; 1 Pita 5:​6, 7) Baịbụl mekwara ka anyị mata na Chineke kwere nkwa na oge na-abịa mgbe ọdachi ndị na-emere onwe ha na-agaghịzi adị.​—Gụọ isiokwu bụ́ “ Amaokwu Baịbụl ndị ga-akasi ndị ọdachi dakwasịrị obi.”

  • Chineke na-esi n’aka ndị na-efe ya akasi ndị ọdachi dakwasịrị obi. Chineke na-eji ndị na-efe ya nọ n’ụwa enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka, otú ahụ Jizọs si nyere ndị mmadụ aka mgbe ọ nọ n’ụwa. E buru n’amụma na Jizọs ga-akasị “ndị e tiwara obi” obi nakwa na ọ ga-akasi “ndị niile na-eru uju” obi. (Aịzaya 61:​1, 2) Ndị na-efe Chineke taa na-agbalịkwa ime otú ahụ.​—Jọn 13:15.

    Chineke na-ejikwa ndị na-efe ya na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka.​—Ọrụ Ndịozi 11:​28-30; Ndị Galeshia 6:10

Ebe Ndịàmà Jehova na-enyere ndị ajọ ifufe mebiri ihe ha aka na Pueto Riko

 Ò nwere ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịkwadebe maka ọdachi ndị na-emere onwe ha?

Ee. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ na-enye ntụziaka otú a ga-esi akwadebe maka ọdachi, o kwuru ihe ndị nwere ike inyere mmadụ aka. Dị ka ihe atụ:

  • Kwadebe akwadebe tupu ọdachi emee. Baịbụl kwuru na “onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Ọ dị mma ka anyị kwadebe ihe ụfọdụ tupu ọdachi emee. Ihe ndị so n’ihe ndị anyị ga-akwadebe bụ akpa anyị tinyere ihe ndị dị mkpa anyị nwere ike iji gbapụ ozugbo ọdachi mere. Ihe ọzọkwa bụ anyị na ndị ezinụlọ anyị ikwu ebe anyị niile ga-agbaga ma ọ bụrụ na e nwee ọdachi merenụ.

  • Ekwela ka ihe i nwere dị gị mkpa karịa ndụ gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe anyị ji bịa n’ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iwere si n’ime ya pụọ.” (1 Timoti 6:​7, 8) Anyị kwesịrị ịdị njikere ịhapụ ụlọ anyị nakwa ihe ndị anyị nwere mgbe ọdachi mere. Ọ dị mma ka anyị cheta na ndụ karịrị akụnụba.​—Matiu 6:25.