Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Meri, Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Meri, Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke?

 Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl kwuru na Meri, nne Jizọs, ka Chineke nyere ihe ùgwù nke ịmụ ọkpara Chineke mgbe ọ ka bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. E bula ụzọ buo amụma nke a na Baịbụl n’akwụkwọ Aịzaya, kwuokwa mgbe o mezuru n’Oziọma Matiu na Luk.

N’otu amụma e buru banyere mgbe a ga-amụ Mesaya, Aịzaya onye amụma kwuru, sị: “Lee! Nwa agbọghọ ahụ ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke.” (Aịzaya 7:​14) Onye dere Oziọma Matiu si n’ike mmụọ nsọ kwuo na amụma Aịzaya a mezuru mgbe Meri dị ime Jizọs. Mgbe Matiu kwuchara na Meri tụụrụ ime n’ike mmụọ nsọ, ọ sịrị: “Ihe a niile mere ka ihe Jehova kwuru site n’ọnụ onye amụma ya wee mezuo, nke sịrị: ‘Lee! Nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke * ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke, a ga-agụ ya Ịmanuel,’ nke pụtara, ma a sụgharịa ya, ‘Chineke Nọnyeere Anyị.’”​—Matiu 1:​22, 23.

Onye dere Oziọma Luk kọkwara otú Meri si tụrụ ime n’ike mmụọ nsọ. O dere na Chineke zigara mmụọ ozi Gebriel “ka ọ gakwuru nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke e kwere nkwa na otu nwoke aha ya bụ Josef ga-alụ, bụ́ onye si n’ụlọ Devid; aha nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ Meri.” (Luk 1:​26, 27) Meri n’onwe ya kwudịrị na ya amaghị nwoke. Mgbe a gwara Meri na ọ ga-abụ nne Jizọs, onye bụ́ Mesaya ahụ, ọ sịrị: “Olee otú nke a ga-esi mee, ebe ọ bụ na mụ na nwoke ọ bụla enwetụbeghị mmekọahụ?”​—Luk 1:​34.

 Olee otú nwa agbọghọ na-amaghị nwoke si nwee ike ịmụta nwa?

Ime Meri dị sitere n’ike mmụọ nsọ, nke pụtara na ọ bụ Chineke mere o ji kwe omume. (Matiu 1:​18) A gwara Meri, sị: “Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.” * (Luk 1:​35) Chineke si n’ụzọ ọrụ ebube bufee ndụ Ọkpara ya n’akpa nwa Meri, nke mere ka ọ dị ime.

 Gịnị mere o ji bụrụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-amụ Jizọs?

Ihe mere Chineke ji kwe ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mụọ Jizọs bụ ka Jizọs nwee ahụ́ zuru okè ọ ga-eji gbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie na ọnwụ. (Jọn 3:​16; Ndị Hibru 10:5) Ọ bụ Chineke bufere ndụ Jizọs n’akpa nwa Meri. Ka e mechaziri, o yiri ka mmụọ nsọ Chineke ò kpuchitere nwa ahụ e bu n’afọ ka ọ ghara inweta ezughị okè ọ bụla.​—Luk 1:​35.

Nke a mere ka a mụọ Jizọs ka ọ bụrụ mmadụ zuru okè, onye zuru okè otú ahụ Adam dị tupu ya emehie. Baịbụl kwuru banyere Jizọs, sị: “Ọ dịghị mmehie o mere.” (1 Pita 2:​22) Ebe ọ bụ na Jizọs bụ mmadụ zuru okè, ọ ga-enwe ike iji ndụ ya kwụọ ụgwọ ma gbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie na ọnwụ.​—1 Ndị Kọrint 15:​21, 22; 1 Timoti 2:​5, 6.

 Meri ọ̀ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ndụ ya niile?

Baịbụl ekwughị na Meri bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ndụ ya niile, kama o kwuru na Meri mụrụ ụmụ ndị ọzọ.​—Matiu 12:46; Mak 6:3; Luk 2:7; Jọn 7:5.

Baịbụl kwuru na Jizọs nwere ụmụnne ndị ọzọ

 Meri ọ̀ bụ ‘onye a tụrụ ime ya n’ejighị njọ’?

Mba. Dị ka akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia si kwuo, ozizi onye a tụrụ ime ya n’ejighị njọ ‘bụ ozizi kwuru na Meri, nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ebughị mmehie pụta ụwa. Na o ketaghị MMEHIE MBỤ ahụ anyị ketara n’aka nne na nna anyị mbụ. Onye ọ bụla ọzọ bi n’ụwa ketara mmehie. Ma Meri dị iche, e ji AMARA pụrụ iche mee ka ọ ghara ibute mmehie ahụ si n’aka Adama na Iv.’ *

Ma, e nweghị ebe ọ bụla Baịbụl kwuru na Meri ebughị mmehie ahụ anyị ketara n’aka Adam. (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:​12) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ihe Meri mere gosiri na o bu mmehie pụta ụwa. O wetara ihe a ga-eji chụọrọ ya àjà mmehie n’ụlọ nsọ dị nnọọ ka Iwu Mozis kwuru ka nwaanyị ọ bụla mụrụ nwa mee. (Levitikọs 12:​2-8; Luk 2:​21-​24) Akwụkwọ ahụ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: ‘O nweghị ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru ya hoo haa na Meri ebughị mmehie pụta ụwa. Ọ bụ Chọọchị ji aka ya kpebie ịkụzi ihe dị otú ahụ.’

 Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele Meri anya?

Meri bụ nwaanyị nwere okwukwe, na-erube isi, dịrị umeala n’obi ma hụ Chineke n’anya. O so n’otu n’ime ndị rubeere Chineke isi anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ha.​—Ndị Hibru 6:​12.

N’agbanyeghị na Meri nwere ihe ùgwù nke ịbụ nne Jizọs, Baịbụl ekwughị na anyị kwesịrị ife Meri ofufe ma ọ bụ kpegara ya ekpere. Jizọs enweghị mgbe ọ kwanyeere nne ya ùgwù pụrụ iche, o nweghịkwanụ ebe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee otú ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na e wezụga n’Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn na otu ebe ọzọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, e nweghị ebe ọzọ e kwuru ihe gbasara Meri n’akwụkwọ iri abụọ na abụọ ndị ọzọ dị n’Agba Ọhụrụ na Baịbụl.​—Ọrụ Ndịozi 1:​14.

O nweghị ebe ọ bụla e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na Ndị Kraịst oge mbụ kwanyeere Meri ùgwù pụrụ iche, ya fọdụzie ikpegara ya ekpere. Kama nke ahụ, Baịbụl kwuru na ọ bụ naanị Chineke ka Ndị Kraịst kwesịrị ife ofufe.—Matiu 4:10.

^ par. 2 N’amụma Aịzaya, okwu Hibru bụ́ ʽal·mahʹ e si na ya sụgharịta “nwa agbọghọ” nwere ike ịbụ nwa agbọghọ ma nwoke ma ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Ma Matiu si n’ike mmụọ nsọ jiri okwu Grik kacha doo anya bụ́ par·theʹnos kọwaa ya, nke pụtara “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.”

^ par. 4 Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ dịghị mma ikwu na Meri mụrụ “Ọkpara Chineke,” n’ihi na ọ na-eme ka o yie ka Chineke na nwaanyị ò nwere mmekọahụ. Ma, o nweghị ebe ụdị echiche ahụ dị n’Akwụkwọ Nsọ. Kama nke ahụ, Baịbụl kpọrọ Jizọs “Ọkpara Chineke,” kpọọkwa ya “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke” n’ihi na ọ bụ naanị ya ka Chineke kere n’onwe ya, bụrụkwa onye mbụ Chineke kere. (Ndị Kọlọsi 1:​13-​15) Baịbụl kpọkwara nwoke mbụ bụ́ Adam “nwa Chineke.” (Luk 3:38) Nke a bụ n’ihi na ọ bụ Chineke kere Adam.

^ par. 8 Mbipụta nke Abụọ, Mpịakọta nke 7, peeji nke 331.