Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Jeruselem Ọhụrụ?

Gịnị Bụ Jeruselem Ọhụrụ?

Ihe Baịbụl kwuru

“Jeruselem Ọhụrụ” pụtara ugboro abụọ na Baịbụl. Jeruselem a abụghị obodo nkịtị, kama ọ nọchiri anya ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ga-aga eluigwe ka ha na Jizọs soro chịa n’Alaeze Chineke. (Mkpughe 3:12; 21:2) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na e nwekwara ike ịkpọ ha nwaanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ.

Ihe ndị ga-enyere gị aka ịmata ihe Jeruselem Ọhụrụ pụtara

  1. Jeruselem Ọhụrụ nọ n’eluigwe. N’ebe ndị ahụ Baịbụl kwuru gbasara Jeruselem Ọhụrụ, ọ sịrị na o si n’eluigwe na-agbadata. Ndị mmụọ ozi nọkwa n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem Ọhụrụ a na-eche nche. (Mkpughe 3:12; 21:2, 10, 12) Otú obodo a si buo ezigbo ibu gosikwara na e nweghị otú ọ ga-esi dịrị n’ụwa. O nwere akụkụ anọ há nhata. A tụọ ya gburugburu, ọ dị “puku fọlọng iri na abụọ,” ma ọ bụ “ihe dị ka puku kilomita abụọ, narị abụọ na iri abụọ.” (Mkpughe 21:16) Ihe ọ pụtara bụ na akụkụ ya nke ọ bụla ga-afọ obere ka o ruo narị kilomita ise na iri isii n’ịdị elu.

  2. Ndị so na Jeruselem Ọhụrụ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị a kpọkwara nwaanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ. A kpọrọ Jeruselem Ọhụrụ ‘nwaanyị a na-alụ ọhụrụ, bụ́ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.’ (Mkpughe 21:9, 10) Nwa Atụrụ ahụ bụ Jizọs Kraịst. (Jọn 1:29; Mkpughe 5:12) “Nwunye Nwa Atụrụ ahụ,” ya bụ, nwaanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ, bụ Ndị Kraịst ha na Jizọs ga-anọ n’eluigwe. Baịbụl ji Jizọs na Ndị Kraịst a tụnyere di na nwunye. (2 Ndị Kọrịnt 11:2; Ndị Efesọs 5:23-25) E dekwara “aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ” n’elu nkume ndị e ji tọọ ntọala Jeruselem Ọhụrụ. (Mkpughe 21:14) Ihe ndị a e kwuru gbasara Jeruselem Ọhụrụ na-eme ka o doo anya na ọ bụ Ndị Kraịst a kpọrọ ka ha dịrị ndụ n’eluigwe bụ Jeruselem Ọhụrụ n’ihi na e kwukwara na ‘e wukwasịrị ha n’elu ntọala nke bụ́ ndịozi na ndị amụma.’—Ndị Efesọs 2:20.

  3. Ndị so na Jeruselem Ọhụrụ ga-abụ ndị ọchịchị. N’oge ochie, Jeruselem bụ isi obodo Izrel. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Eze Devid, Sọlọmọn nwa ya, na ndị si n’ezinụlọ ha nọ chịa “n’ocheeze Jehova.” (1 Ihe E Mere 29:23) A kpọrọ Jeruselem “obodo nsọ.” N’oge ndị si n’ezinụlọ Devid chịrị, Jeruselem nọchiri anya ọchịchị Chineke. (Nehemaya 11:1) A kpọkwara Jeruselem Ọhụrụ “obodo nsọ.” Ndị so na Jeruselem Ọhụrụ a ga-alakwuru Jizọs n’eluigwe soro ya ‘chịa ụwa dị ka ndị eze.’—Mkpughe 5:9, 10; 21:2.

  4. Chineke ga-eji Jeruselem Ọhụrụ meere ndị bi n’ụwa ihe ọma. N’akwụkwọ Mkpughe, a hụrụ ka Jeruselem Ọhụrụ “si n’eluigwe, n’ebe Chineke nọ, na-agbadata.” Ihe a gosiri na ọ bụghị naanị n’eluigwe ka Chineke ji Jeruselem Ọhụrụ na-arụ ọrụ. (Mkpughe 21:2) Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na e nwere ihe jikọtara Jeruselem Ọhụrụ na Alaeze Chineke. Ọ bụ Alaeze a ka Chineke ga-eji eme uche ya “n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Lekwa ihe ọma ụfọdụ Chineke bu n’obi imere ndị bi n’ụwa:

    • A ga-ewepụ mmehie. “Osimiri nke mmiri nke ndụ” si na Jeruselem Ọhụrụ na-asọpụta. Mmiri a na-ede “osisi nke ndụ.” Osisi ndị ahụ bụ “maka ịgwọ mba niile.” (Mkpughe 22:1, 2) A ga-agwọ ndị mmadụ ọrịa niile ji ha, meekwa ka ha na Chineke dịrị ná mma. A ga-esi otú a wepụ mmehie. Ndị mmadụ ga-ezukwa okè otú Chineke bu n’obi mgbe o kere mmadụ.—Ndị Rom 8:21.

    • Ndị mmadụ na Chineke ga-adị n’ezigbo mma. Ọ bụ mmehie mere ka ndị mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. (Aịzaya 59:2) Mgbe a ga-ewepụ mmehie, amụma a ga-emezu kpamkpam: “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha.”—Mkpughe 21:3.

    • A ga-ewepụ ahụhụ na ọnwụ. Chineke ga-eji Alaeze ya ‘hichapụ anya mmiri niile n’anya ndị mmadụ, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.’—Mkpughe 21:4.