Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl ekwughị gbasara “ite ime” nke mmadụ ịma ama wepụ nwa nọ ya n’afọ. Ma, e nwere ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru gbasara otú Chineke si ele ndụ mmadụ anya, ma nke nwa e bu n’afọ.

Ndụ bụ onyinye si n’aka Chineke. (Jenesis 9:6; Abụ Ọma 36:9) O weere ndụ mmadụ niile ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ma nke nwa e bu n’afọ. Ọ bụ ya mere na mmadụ kpachara anya gbuo nwa nọ n’afọ, a na-ewere onye ahụ ka onye gburu ọchụ.

Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-alụ ọgụ, ha ewee merụọ nwaanyị dị ime ahụ́, nwa ya ewee pụta ma mmadụ anwụghị n’ihe mberede a, a ghaghị iri ya iwu dị ka ihe onye lụ nwaanyị ahụ gwara ya si dị; ọ ga-akwụkwa ya site n’aka ndị ikpe. Ma ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’ihe mberede a, ị ga-eme ka mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi.”—Ọpụpụ 21:22, 23. *

 Olee mgbe ndụ mmadụ na-amalite?

Chineke weere ya na ndụ na-amalite ozugbo nwaanyị tụụrụ ime. N’Okwu ya bụ́ Baịbụl, Chineke kwuru ọtụtụ mgbe na nwa e bu n’afọ bụ mmadụ. Ka anyị lee ihe atụ ụfọdụ na-egosi na Chineke anaghị ewere ya na nwa e bu n’afọ dị iche na nke a mụrụla amụ.

  • Eze Devid si n’ike mmụọ nsọ gwa Chineke, sị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ.” (Abụ Ọma 139:16) Chineke weere Devid ka mmadụ dị ndụ tupudị a mụọ ya.

  • Ihe ọzọkwa bụ na tupudị a mụọ Jeremaya onye amụma, Chineke ma na o nwere ọrụ pụrụ iche ọ ga-arụrụ ya. Chineke gwara ya, sị: “Tupu mụ akpụọ gị n’ime afọ, amaara m gị, tupu gị esi n’akpa nwa pụta, edoro m gị nsọ. Emere m gị onye amụma nke mba dị iche iche.”—Jeremaya 1:5.

  • Luk onye so dee Baịbụl, onye bụ́kwanụ dọkịta, ji otu okwu Grik o ji kọwaa nwa e bu n’afọ kọwaa nwa a mụrụ ọhụrụ.—Luk 1:41; 2:12, 16.

 Chineke ọ̀ ga-agbaghara onye terela ime?

Chineke nwere ike ịgbaghara ndị tetụrụla afọ ime. Ọ bụrụ na ha amalite ile ndụ anya otú Chineke si ele ya, ha ekwesịghị ichewe na ndụ a ha dị enweghị isi. “Jehovah dị ebere na-emekwa amara. . . Dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka o mere ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ.” * (Abụ Ọma 103:8-12) Jehova ga-agbaghara ndị niile ji obi ha chegharịa ná mmehie ndị ha mere, ma ndị nke terela ime.—Abụ Ọma 86:5.

 Ọ bụrụ na ndụ nne ma ọ bụ nwa e bu n’afọ nọ n’ihe ize ndụ, o nwere ihe o mere ma o tee ime ahụ?

N’ihi ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara nwa e bu n’afọ, mmadụ ekwesịghị ite ime n’ihi na a gwara ya na nwa e bu n’afọ ma ọ bụ yanwa nwere ike ịnwụ ma a hapụ ime ahụ.

Ọ bụ eziokwu na ọ naghị emekarị, gịnịkwanụ ka a ga-eme ma ọ bụrụ na mgbe a na-amụ nwa e nwee nsogbu biliterenụ nke ga-eme ka ọ dị mkpa ikpebi ichebe ndụ nne ma ọ bụ nke nwa o bu n’afọ? A bịa na nke a, ndị ọ gbasara ga-eji aka ha ekpebi ndụ onye nke a ga-echebe.

^ par. 3 Otú e si sụgharịa iwu a na Baịbụl ụfọdụ bịaziri mee ka o yie ka ebe nsogbu dị bụ ma ihe mee nwaanyị ahụ dị ime, ọ bụghị nwa o bu n’afọ. Ma, okwu Hibru e si na ya sụgharịa ihe a gosiri na ihe a na-ekwu okwu ya bụ ma nwaanyị ahụ dị ime ma ọ bụ nwa o bu n’afọ nwụọ.

^ par. 8 Jehova bụ aha Chineke, e kwukwara gbasara aha a na Baịbụl.—Abụ Ọma 83:18.