Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ikwu Okwu n’Asụsụ Dị Iche Iche?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ikwu Okwu n’Asụsụ Dị Iche Iche?

Ihe Baịbụl Kwuru

Ihe a na-akpọ ‘ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche’ bụ ihe ahụ mere mgbe mmụọ nsọ mere ka ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ sụọ asụsụ dị iche iche n’ebughị ụzọ mụọ asụsụ ahụ. Ihe a bụ ọrụ ebube. (Ọrụ Ndịozi 10:46) Onye ọ bụla ma asụsụ ahụ ha na-asụ ghọtara ihe ha na-ekwu. (Ọrụ Ndịozi 2:​4-8) Ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche bụ otu n’ime onyinye nke mmụọ nsọ Chineke mere ka ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ nweta.​—Ndị Hibru 2:4; 1 Ndị Kọrịnt 12:​4, 30.

 Olee mgbe a malitere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, n’ebeekwa?

Ebe mbụ a rụrụ ọrụ ebube a bụ na Jeruselem, n’ụtụtụ ụbọchị ndị Juu na-eme ememme Pentikọst, n’afọ 33. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ zukọtara, ‘ha niile jupụtara na mmụọ nsọ, malitekwa ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.’ (Ọrụ Ndịozi 1:15; 2:​1-4) Ìgwè mmadụ “si ná mba niile dị n’okpuru eluigwe” gbakọtara, ‘onye ọ bụla nụkwara ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ nke ya.’​—Ọrụ Ndịozi 2:​5, 6

 Gịnị mere e ji kwuo okwu n’asụsụ dị iche iche?

  1. Iji mee ka ndị mmadụ mata na Chineke nọnyeere Ndị Kraịst. N’oge ochie, Chineke rụrụ ọrụ ebube iji gosi na ya nọnyeere ndị na-efe ya, dị ka Mozis. (Ọpụpụ 4:​1-9, 29-31; Ọnụ Ọgụgụ 17:10) Ọ bụkwa otú ahụ ka ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche si gosi na Chineke nọnyeere ọgbakọ Ndị Kraịst oge ochie ahụ ka malitere ọhụrụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Asụsụ dị iche iche bụ maka ihe ịrịba ama, ọ bụghị n’ebe ndị kwere ekwe nọ, kama n’ebe ndị na-ekweghị ekwe nọ.”​—1 Ndị Kọrịnt 14:22.

  2. Iji mee ka Ndị Kraịst nwee ike izi ọtụtụ ndị ozi ọma. Ndị nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche kwuru, sị: “Anyị na-anụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ anyị banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.” (Ọrụ Ndịozi 2:11) N’ihi ya, ihe ọzọ dị mkpa mere e ji mee ya bụ ka Ndị Kraịst nwee ike “ịgba àmà nke ọma,” nakwa ka ha “mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ” Jizọs, otú ahụ Jizọs nyere ha n’iwu. (Ọrụ Ndịozi 10:42; Matiu 28:19) Ihe dị ka puku mmadụ atọ n’ime ndị hụrụ ọrụ ebube a ma gee ntị n’ozi ọma e ziri ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ụbọchị ahụ.​—Ọrụ Ndịozi 2:41.

 Ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche ọ̀ ga-adịgide?

Mba. Onyinye dị iche iche nke mmụọ nsọ, ma ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, bụ ihe ga-anọ nwa mgbe. Baịbụl buru amụma, sị: “Ma ọ bụrụ na e nwere onyinye ibu amụma, a ga-ewepụ ha; ọ bụrụ na e nwere ịsụ asụsụ dị iche iche, ha ga-akwụsị.”​—1 Ndị Kọrịnt 13:8.

 Olee mgbe ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche kwụsịrị?

E nyere Ndị Kraịst onyinye nke mmụọ nsọ n’oge ndịozi. Ndị Kraịst ndị ọzọ si n’aka ndịozi Jizọs nweta onyinye nke mmụọ nsọ. Ọtụtụ mgbe, otú ha si nweta ya bụ mgbe ndịozi bikwasịrị ha aka n’isi. (Ọrụ Ndịozi 8:18; 10:​44-46) O yiri ka ndị ahụ nwetara onyinye nke mmụọ nsọ ahụ n’aka ndịozi enyefeghị ya ndị ọzọ. (Ọrụ Ndịozi 8:​5-7, 14-17) Dị ka ihe atụ, onye na-arụrụ gọọmenti ọrụ nwere ike inye mmadụ akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala, ma onye ahụ e nyere akwụkwọ ikike ahụ enweghị ikike inye onye ọzọ ikike ịnya ụgbọala. Ihe a gosiri na ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche kwụsịrị mgbe ndịozi na ndị ahụ nwetara mmụọ nsọ n’aka ha nwụchara.

 Olee maka ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche taa?

Ihe Baịbụl kwuru gosiri na onyinye ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche kwụsịrị n’oge ndịozi. N’ihi ya, o nweghị onye nwere ike ikwu taa na ya si n’ike Chineke na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche. *

 Olee otú e si amata ezigbo Ndị Kraịst?

Jizọs kwuru na ihe a ga-eji amata ndị na-eso ụzọ ya bụ ezigbo ịhụnanya. (Jọn 13:​34, 35) Pọl onyeozi kwukwara na ịhụnanya bụ ihe a ga na-eji amara ezigbo Ndị Kraịst. (1 Ndị Kọrịnt 13:​1, 8) O kwuru na e nwere àgwà ndị mmụọ nsọ Chineke ga-eme ka Ndị Kraịst na-akpa. A na-akpọ àgwà ndị ahụ niile “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” Nke mbụ n’ime ha bụ ịhụnanya.​—Ndị Galeshia 5:​22, 23