Gaa n'Isiokwu

Mmadụ Ịsị “Ekweere M na Jizọs” Ọ̀ Bụ Naanị Ya Ga-eme Ka A Zọpụta Ya?

Mmadụ Ịsị “Ekweere M na Jizọs” Ọ̀ Bụ Naanị Ya Ga-eme Ka A Zọpụta Ya?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ndị Kraịst kwetara na Jizọs nwụrụ maka mmehie mmadụ niile. (1 Pita 3:18) Ma ọ bụghị naanị ikwere na Jizọs bụ Onye Nzọpụta ga-eme ka a zọpụta mmadụ. Ndị mmụọ ọjọọ maara na Jizọs bụ “Ọkpara Chineke,” ma ha agaghị enweta nzọpụta, kama a ga-ebibi ha.​—⁠Luk 4:41; Jud 6.

 Gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?

  •   Ị ga-ekwere na Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà maka mmehie anyị. (Ọrụ Ndịozi 16:​30, 31; 1 Jọn 2:⁠2) Nke a pụtara na onye ahụ ga-ekwere na Jizọs bụ onye dịrị ndụ n’ụwa a nakwa na ihe niile e kwuru na Baịbụl gbasara ya bụ eziokwu.

  •   Mụta ihe Baịbụl na-akụzi n’eziokwu. (2 Timoti 3:15) Baịbụl kwuru na Pọl onyeozi na Saịlas gwara onye na-elekọta ụlọ nga, sị: “Kwere n’Onyenwe anyị Jizọs, a ga-azọpụtakwa gị.” Ka e mesịrị, ha bidoro ịkụziri onye ahụ na-elekọta ụlọ nga “okwu Jehova.” * (Ọrụ Ndịozi 16:​31, 32) Nke a na-egosi na e nweghị otú onye ahụ na-elekọta ụlọ nga ga-esi kwere na Jizọs n’eziokwu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ ghọtagodị ihe ụfọdụ dị mkpa dị n’Okwu Chineke. O kwesịrị inweta ezi ihe ọmụma dị n’Akwụkwọ Nsọ.​—⁠1 Timoti 2:​3, 4.

  •   Chegharịa. (Ọrụ Ndịozi 3:19) I kwesịrị ichegharị ma ọ bụ si n’ala ala obi gị gosi na ihe ọjọọ ndị i meburu na-ewute gị. Ka ị na-akwụsị ịkpa àgwà ndị na-adịghị Chineke mma ma na-arụ “ọrụ kwesịrị nchegharị,” ndị ọzọ ga-ahụ ihe ndị gosiri na i chegharịala.​—⁠Ọrụ Ndịozi 26:⁠20.

  •   Mee baptizim. (Matiu 28:19) Jizọs kwuru na a ga-eme ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya baptizim. E mere onye ahụ na-elekọta ụlọ nga e kwuburu okwu ya baptizim. (Ọrụ Ndịozi 16:33) Mgbe Pita onyeozi kwusakwaara ìgwè mmadụ oziọma gbasara Jizọs, “e mere ndị ji obi ha niile nabatara okwu ya baptizim.”​—⁠Ọrụ Ndịozi 2:​40, 41.

  •   Na-erube isi n’iwu ndị Jizọs nyere. (Ndị Hibru 5:⁠9) Ndị ‘na-edebe ihe niile’ Jizọs nyere n’iwu na-esi n’otú ha si ebi ndụ gosi na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Matiu 28:20) Ha na-abụ ‘ndị na-eme okwu Chineke eme, ọ bụghị ndị na-anụ naanị ọnụnụ.’​—⁠Jems 1:⁠22.

  •   Tachie obi ruo ọgwụgwụ. (Mak 13:13) Ka e nwee ike ịzọpụta ndị na-eso ụzọ Jizọs, ọ dị mkpa na ha ‘ga-atachi obi.’ (Ndị Hibru 10:36) Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi mere nnọọ ihe niile Jizọs kụziri ma rubere Chineke isi, o mekwara nke a malite mgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst ruo ụbọchị ọ nwụrụ.—1 Ndị Kọrịnt 9:27.

 Oleekwanụ maka ekpere ahụ a na-akpọ “Ekpere Onye Mmehie”?

 Na chọọchị ụfọdụ, ndị mmadụ na-ekpe ụdị ekpere dị iche iche dị ka nke ahụ a na-akpọ “Ekpere Onye Mmehie” na “Ekpere Nzọpụta.” N’ekpere ahụ, onye na-ekpe ya na-ekwupụta na ya bụ onye mmehie, kwuokwa na ya kweere na Jizọs nwụrụ maka mmehie ya. Ọ na-arịọkwa Jizọs ka ọ bata n’ime obi ya ma ọ bụ n’ime ndụ ya. Ma e nweghị ebe Baịbụl kwuru maka ụdị ekpere a ma ọ bụ kwuo na ọ dị mma ka mmadụ na-ekpe ụdị ekpere a ga na-agwa ya ihe ọ ga-ekwu.

 Ụfọdụ ndị chere na ha kpechahaala ekpere a a kpọrọ “Ekpere Onye Mmehie” na o doola ha anya na a ga-azọpụta ha. Ma e nweghị ụdị ekpere mmadụ ga-ekpe ya emee ka onye ahụ nweta nzọpụta. Anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị na-emekwa mmehie mgbe ọ bụla. (1 Jọn 1:⁠8) Ọ bụ ya mere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere mgbe niile ka Chineke gbaghara ha mmehie ha. (Luk 11:​2, 4) Nke ọzọ bụ na e nwere Ndị Kraịst gaara enweta ndụ ebighị ebi ma ha agaghịzi enweta ya n’ihi na ha kwụsịrị irubere Chineke isi.​—⁠Ndị Hibru 6:​4-6; 2 Pita 2:​20, 21.

 Olee otú e si bido ikpe “Ekpere Onye Mmehie”?

 Ndị na-akọ ihe ndị mere n’oge ochie enweghị otu olu ma a bịa n’otú e si bido ikpe ekpere a a na-akpọ “Ekpere Onye Mmehie.” Ụfọdụ n’ime ha sị na o bidoro mgbe a malitere inwe chọọchị ndị jụrụ ụfọdụ ihe chọọchị Katọlik na-akụzi. Ndị ọzọ sịrị na ndị mmadụ bidoro ikpe “Ekpere Onye Mmehie” mgbe chọọchị ndị ọhụrụ pụtara n’agbata afọ 1701 na afọ 1900. Nke ọ bụla ọ bụ, o nweghị ebe Akwụkwọ Nsọ kwadoro ikpe ụdị ekpere a. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dị iche n’ihe Baịbụl na-akụzi.

^ Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.