Gaa n'Isiokwu

Ihe Baịbụl Kwuru Ò Gosiri na Mmadụ Nwere Ikike Ikpebiri Onwe Ya Ihe? Ọ̀ Bụ Chineke Na-ekpebi Ihe Ị Ga-abụ?

Ihe Baịbụl Kwuru Ò Gosiri na Mmadụ Nwere Ikike Ikpebiri Onwe Ya Ihe? Ọ̀ Bụ Chineke Na-ekpebi Ihe Ị Ga-abụ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Chineke kere anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe, ọ bụghị ka yanwa na-ekpebiri anyị ihe ma ọ bụ ka akara aka na-edu anyị. Ihe a Chineke mere gosiri na ọ na-akwanyere anyị ùgwù. Lee ihe Baịbụl kwuru.

  •   Chineke kere mmadụ n’oyiyi ya. (Jenesis 1:26) Anyị adịghị ka ụmụ anụmanụ na-enweghị ọgụgụ isi, kama e kere anyị n’oyiyi Chineke. Ọ bụ ya mere anyị ji ahụ ndị ọzọ n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi. Otú ọzọ anyị sikwa yie Onye okike anyị bụ na anyị nweere onwe anyị ikpebiri onwe anyị ihe.

  •   Ọ bụ anyị ka ọ kacha dịrị n’aka ikpebi otú ndụ anyị ga-adị n’ọdịnihu. Baịbụl na-agwa anyị ka anyị ‘họrọ ndụ site n’ige ntị n’olu Chineke,’ ya bụ, ịhọrọ idebe iwu Chineke. (Diuterọnọmi 30:19, 20) Chineke agaghị agwa anyị ụdị ihe a ma a sị na anyị enweghị ikike ikpebiri onwe anyị ihe. Ọ bụrụkwa na Chineke amarachaa na anyị enweghị ikike ikpebiri onwe anyị ihe, na-agwa anyị ka anyị họrọ ndụ, ọ ga-adịzi ka ọ̀ bụ onye obi tara mmiri. Chineke anaghị amanye anyị ka anyị mee ihe ọ chọrọ, kama ọ na-arịọ anyị arịrịọ, sị: “A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu! Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri.”—Aịzaya 48:18.

  •   Ọ bụghị akara aka na-eme ka ihe gaziere mmadụ ma ọ bụ ka ihe ghara ịgaziri ya. Ị chọọ ka ihe gaziere gị, ị ga-agbasi mbọ ike. Baịbụl sịrị, “Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum mee ha.” (Ekliziastis 9:10) Ọ sịkwara na “atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.”—Ilu 21:5.

 Anyị ikpebiri onwe anyị ihe bụ onyinye magburu onwe ya Chineke nyere anyị, n’ihi na ọ na-eme ka anyị jiri aka anyị kpebie iji ‘obi anyị dum’ hụ ya n’anya.—Matiu 22:37.

Ọ́ bụghị Chineke na-ekpebi otú ihe niile si aga?

 Baịbụl sịrị na Chineke bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nakwa na o nweghị onye ike ya na ya hà. (Job 37:23; Aịzaya 40:26) Ma, Chineke anaghị eji ike ya ekpebi otú ihe niile si aga. Dị ka ihe atụ, Baịbụl sịrị na Chineke “jidere onwe” ya mgbe ndị Babịlọn nọ na-emejọ ndị Izrel. (Aịzaya 42:14) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Chineke kpebiri ịhapụgodị ndị họọrọ ịna-eme ndị ọzọ ihe ọjọọ. Ma, ọ gaghị ahapụ ha ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:10, 11.