Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ọrịa Ndị Zuru Ụwa Ọnụ?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ọrịa Ndị Zuru Ụwa Ọnụ?

Ihe Baịbụl Kwuru

Baịbụl buru amụma na a ga-enwe ọrịa ndị na-efe efe n’oge ikpeazụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ọrịa ndị ga-ezu ụwa ọnụ. (Luk 21:11) Chineke ejighị ọrịa ndị ahụ zuru ụwa ọnụ ata ndị mmadụ ahụhụ, kama n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eji Alaeze ya wepụ ha, wepụkwa ọrịa ndị ọzọ niile ndị mmadụ na-arịa.

 Baịbụl ò kwuru na a ga-enwe ọrịa ndị zuru ụwa ọnụ?

O nweghị ọrịa ọ bụla na-efe efe zuru ụwa ọnụ Baịbụl kpọrọ aha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl akpọghị koronavaịrọs, ọrịa o biri n’ájá ọcha, ma ọ bụ ọrịa inflenza aha. Ma, o kwuru na a ga-enwe “ọrịa na-efe efe” na “ajọ ọrịa.” (Luk 21:11; Mkpughe 6:⁠8) Ha so n’ihe ndị na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ,” nke a na-akpọkwa “ọgwụgwụ usoro ihe a.”​—⁠2 Timoti 3:1; Matiu 24:⁠3.

 Ò nwetụla mgbe Chineke ji ọrịa taa ndị mmadụ ahụhụ?

Baịbụl kwuru na e nwere ugboro ole na ole Chineke ji ọrịa taa ndị mmadụ ahụhụ. Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe Chineke tiri ụfọdụ ndị ekpenta. (Ọnụ Ọgụgụ 12:​1-16; 2 Ndị Eze 5:​20-27; 2 Ihe E Mere 26:​16-21) Ma, ekpenta ahụ abịaghị gbasaa fee ndị ọzọ, ma ndị aka ha dị ọcha. Kama ihe mere Chineke ji tie ha ya bụ maka na ha nupụụrụ ya isi.

 Chineke ò ji ọrịa ndị zuru ụwa ọnụ ata ndị mmadụ ahụhụ?

Mbanụ. Ụfọdụ ndị na-ekwu na Chineke ji ọrịa ndị zuru ụwa ọnụ na ọrịa ndị ọzọ ndị mmadụ na-arịa ata ha ahụhụ. Ma, Baịbụl akwadoghị ihe a ha na-ekwu. Ọ̀ bụ maka gịnị?

Otu ihe bụ na ụfọdụ ndị fere Chineke n’oge gara aga rịara ọrịa ndị kpara ha aka ọjọọ, ụfọdụ ndị na-efe ya taa na-arịakwa ọrịa ndị na-anaghị ekwe ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Dị ka ihe atụ, n’oge ochie, nwoke ezi omume aha ya bụ Timoti nwere ‘ọrịa nke ọ na-arịakarị.’ (1 Timoti 5:23) Ma, Baịbụl ekwughị na ọrịa ahụ gosiri na ihe ya adịghịzi Chineke mma. Taa kwa, ụfọdụ ndị na-efe Chineke na­-arịa ọrịa, ụfọdụ ebutekwala ọrịa. Ọtụtụ mgbe, ihe kpatara ya bụ na ha nọ n’ebe e nwere ọrịa ahụ.​—⁠Ekliziastis 9:⁠11.

Ihe ọzọ bụ na Baịbụl gosiri na oge Chineke ga-ata ndị ọjọọ ahụhụ erubeghị. Kama, anyị bi “n’ụbọchị nzọpụta,” ya bụ, n’oge Chineke na-akpọ mmadụ niile ka ha bịa fee ya ka e nwee ike zọpụta ha. (2 Ndị Kọrịnt 6:⁠2) ‘Ozi ọma Alaeze Chineke’ a na-ekwusa n’ụwa niile bụ otu ụzọ o si akpọ mmadụ niile òkù ahụ.​​—⁠Matiu 24:⁠14.

 Ò nwere mgbe ọrịa ndị zuru ụwa ọnụ na-agaghịzi adị?

Ee. Baịbụl kwuru na n’oge na-adịghị anya, o nweghịzi onye ga na-arịa ọrịa. Chineke ga-agwọ ndị mmadụ ọrịa ha niile mgbe Alaeze ya ga-achịwa ụwa. (Aịzaya 33:24; 35:​5, 6) Ọ ga-emekwa ka ahụhụ, ihe mgbu, na ọnwụ kwụsị. (Mkpughe 21:⁠4) Ọ ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ, ahụ́ esie ha ike, ha ebirikwa n’ụwa ebe a mgbe ihe niile ga-adị otú Chineke chọrọ ya.​—⁠Abụ Ọma 37:29; Ọrụ Ndịozi 24:⁠15.

 Amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara ọrịa

Matiu 4:23: “[Jizọs] wee gazuo Galili dum, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ, na-agwọkwa ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla ndị mmadụ nwere.”

Ihe ọ pụtara: Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ bụ obere ihe na-egosi ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ niile n’oge na-adịghị anya.

Luk 21:11: ‘A ga-enwe ọrịa na-efe efe.’

Ihe ọ pụtara: Ọrịa dị n’ebe dị iche iche n’ụwa so n’ihe ndị na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ.

Mkpughe 6:8: “Lee! ịnyịnya nke ahụ́ ya chanwụrụ achanwụ; onye nọ n’elu ya nwekwara aha bụ́ Ọnwụ. Hedis sochikwara ya anya. E nyekwara ha ikike . . . ka ha jiri . . . ajọ ọrịa . . . na-egbu ndị mmadụ.”

Ihe ọ pụtara: Amụma a dị n’akwụkwọ Mkpughe gbasara ndị nọ n’ịnyịnya anọ na-egosi na a ga-enwe ọrịa ndị zuru ụwa ọnụ n’oge anyị a.