Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ịkwụ Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ịkwụ Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri?

Ihe Baịbụl kwuru

Chineke gwara ndị Izrel oge ochie ka ha nye otu ụzọ n’ụzọ iri * nke ihe niile ha na-akpata n’afọ ka ọ bụrụ onyinye ha na-enye iji na-akwado ofufe Chineke. Chineke gwara ha, sị: “Hụ na ị na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile mkpụrụ gị mịpụtara, bụ́ nke a na-eweta n’ubi kwa afọ.”​—⁠Diuterọnọmi 14:⁠22.

Ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri so n’Iwu Mozis, bụ́ iwu Chineke si n’aka Mozis nye ndị Izrel oge ochie. Iwu ejighị Ndị Kraịst idebe iwu Mozis, n’ihi ya ọ dịghịkwa mkpa na ha ga-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri. (Ndị Kọlọsi 2:​13, 14) Kama Onye Kraịst ọ bụla ga-enye onyinye ego “dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”​—⁠2 Ndị Kọrịnt 9:⁠7.

 Ihe Baịbụl kwuru gbasara ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri ‘n’Agba Ochie’

E kwuru ugboro ugboro gbasara ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri ná nkebi Baịbụl ndị mmadụ na-akpọkarị Agba Ochie. Mgbe a kacha kwuo okwu ya bụ n’oge Chineke nyechara ndị Izrel Iwu ahụ o si n’aka Mozis nye. Ma e nwekwara ebe ole na ole e kwuru okwu inye otu ụzọ n’ụzọ iri tupu oge ndị Izrel.

Tupu E Nye Iwu Mozis

Ebram (ma ọ bụ Ebreham) bụ onye mbụ e kwuru okwu ya na o nyere otu ụzọ n’ụzọ iri. (Jenesis 14:​18-20; Ndị Hibru 7:⁠4) O yiri ka ọ bụ naanị otu ugbo ka Ebram nyere nwoke ahụ bụ́ eze, bụrụkwa onye nchụàjà Selem, onyinye otu ụzọ n’ụzọ iri. O nweghịkwanụ oge ọzọ Baịbụl kwuru na Ebreham ma ọ bụ ụmụ ya nyere otu ụzọ n’ụzọ iri.

Onye nke abụọ Baịbụl kwuru na o nyere otu ụzọ n’ụzọ iri bụ Jekọb, nwa nwa Ebreham. O kwere Chineke nkwa na ọ bụrụ na ọ gọzie ya, na ya ga-enye ya “otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọ bụla” o nwetara. (Jenesis 28:​20-22) Ụfọdụ ndị na-amụ gbasara ihe ndị mere n’oge Baịbụl kwuru na o yiri ka ọ̀ bụ ụmụ anụmanụ Jekọb ji chụọrọ Chineke àjà ka o ji kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ. Ọ bụ eziokwu na Jekọb nyere Chineke ihe ahụ o kwere ya ná nkwa, ma Jekọb emeghị ya ka ọ bụrụ iwu na ndị ọzọ n’ezinụlọ ya ga-enyewekwa otu ụzọ n’ụzọ iri.

N’Iwu Mozis

A gwara ndị Izrel oge ochie ka ha na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri ka ọ bụrụ ihe ha na-eme iji kwadoo otú ha si efe Chineke.

  • Otu ụzọ n’ụzọ iri ndị Izrel nyere ka a na-eji elekọta ndị naanị ọrụ ha bụ ihe ndị gbasara ofufe Chineke, ya bụ, ndị Livaị nakwa ndị nchụàjà, n’ihi na ha enweghị ala ha ga-eji na-arụ ọrụ ugbo. (Ọnụ Ọgụgụ 18:​20, 21) Ndị Livaị na-abụghị ndị nchụàjà na-anara ndị Izrel otu ụzọ n’ụzọ iri, sikwa ‘n’otu ụzọ n’ụzọ iri’ ahụ were “otu ụzọ n’ụzọ iri” kacha mma nye ndị nchụàjà.​—⁠Ọnụ Ọgụgụ 18:​26-29.

  • O yiri ka e nwekwara otu ụzọ n’ụzọ iri ọzọ a gwara ndị Izrel ka ha na-enye kwa afọ. Ọ na-abara ma ndị Livaị ma ndị na-abụghị ndị Livaị uru. (Diuterọnọmi 14:​22, 23) Ọ bụ mgbe e nwere ememme pụrụ iche ka ndị Izrel na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke a, n’afọ ụfọdụkwa, ọ bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ ka a na-enye ya.​—⁠Diuterọnọmi 14:​28, 29; 26:⁠12.

Olee otú e si agbakọ otu ụzọ n’ụzọ iri? Ndị Izrel na-eke ihe niile ha nwetara n’ala ha n’afọ ụzọ iri ma wepụta otu ụzọ n’ime ya. (Levitikọs 27:30) Ọ bụrụ na ha chọrọ iji ego kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ kama inye ihe ha nwetara n’ubi, ha ga-atụkwasị ya otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ihe ahụ. (Levitikọs 27:31) E nyekwara ha iwu ka ha na-enye “otu ụzọ n’ime ụzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na atụrụ” ha, o yiri ka ọ pụtara na ha ga-enye otu nwa ehi, ewu ma ọ bụ atụrụ ọ bụla n’ime iri ọ bụla a mụrụ ọhụrụ.​—⁠Levitikọs 27:⁠32.

Otú ndị Izrel si ama anụ ụlọ nke ha ga-eji nye otu ụzọ n’ụzọ iri bụ na mgbe anụ ụlọ ndị ahụ si n’ebe a na-edebe ha apụta, ha na-ahọrọ nke iri ọ bụla, jiri ya nye otu ụzọ n’ụzọ iri. Iwu machiri ha ịgbanwe ma ọ bụ inyocha anụ nke ọ bụla ha họọrọ, iwu machikwara ha iji ego gbanwere anụ ọ bụla a họọrọ iji nye otu ụzọ n’ụzọ iri. (Levitikọs 27:​32, 33) Ma e nwere ike iji ego gbanwere otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọzọ a na-enye n’oge ememme ndị a na-eme kwa afọ. Iji ego gbanwere ya na-eme ka ihe dịrị ndị Izrel mfe n’ihi na ọtụtụ n’ime ha na-esi n’ebe dị anya na-abịa ememme ndị ahụ.​—⁠Diuterọnọmi 14:​25, 26.

Olee mgbe ndị Izrel ji enye otu ụzọ n’ụzọ iri? Ndị Izrel na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri kwa afọ. (Diuterọnọmi 14:22) Ma n’afọ asaa ọ bụla, a na-enwe ihe dị iche. Afọ ahụ bụ afọ izu ike, bụ́ mgbe ndị Izrel na-agaghị akọ ihe ọ bụla n’ala ha. (Levitikọs 25:​4, 5) Ebe ọ bụ na e nweghị onye kọrọ ihe n’afọ ahụ, o nweghị onye a na-ana otu ụzọ n’ụzọ iri n’oge owuwe ihe ubi. N’afọ atọ ọ bụla nakwa n’afọ isii ọ bụla, ndị Izrel na-enye ndị ogbenye na ndị Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọzọ ahụ.​—⁠Diuterọnọmi 14:​28, 29.

Olee ahụhụ a na-ata mmadụ ma ọ bụrụ na o nyeghị otu ụzọ n’ụzọ iri? O nweghị ihe ọ bụla e kwuru n’Iwu Mozis gbasara ahụhụ a ga-ata onye na-enyeghị otu ụzọ n’ụzọ iri. Inye otu ụzọ n’ụzọ iri bụ ihe mmadụ ga-eji aka ya kpebie ime. Ndị Izrel na-aga n’ihu Chineke kwuo na ha enyela otu ụzọ n’ụzọ iri nke ha ma rịọ ya ka ọ gọzie ha n’ihi na ha enyela otu ụzọ n’ụzọ iri. (Diuterọnọmi 26:​12-15) Chineke weere onye na-achọghị inye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ya ka onye na-ezu ya ohi.​—⁠Malakaị 3:​8, 9.

Inye otu ụzọ n’ụzọ iri ọ̀ bụụrụ ndị Izrel nnukwu ọrụ? Mba. Chineke kwere ndị Izrel nkwa na ọ bụrụ na ha ewebata otu ụzọ n’ụzọ iri ha, na ya ga-awụsa ha ngọzi ya ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ ha. (Malakaị 3:10) Ma n’oge ndị ha na-enyeghị otu ụzọ n’ụzọ iri, obodo ha tara ahụhụ. Chineke agọzighị ha. Ha eriteghịkwa uru n’ọrụ ndị nchụàjà na ndị Livaị n’ihi na ha gara kpawa afọ ha ma kwụsịzie inyere ndị Izrel aka n’ofufe Chineke.​—⁠Nehemaya 13:10; Malakaị 3:⁠7.

 Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ịkwụ Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri ‘n’Agba Ọhụrụ’

Mgbe Jizọs nọ ndụ n’ụwa a, otu ụzọ n’ụzọ iri ka bụkwa ihe a na-atụ anya ya n’aka ndị na-efe Chineke. Ma mgbe Jizọs nwụchara, a kwụsịrị ya.

N’oge Jizọs nọ n’ụwa

Na nkebi Baịbụl nke a na-akpọkarị Agba Ọhụrụ, Baịbụl gosiri na ndị Izrel ka na-atụkwa otu ụzọ n’ụzọ iri mgbe Jizọs nọ n’ụwa. Jizọs n’onwe ya kwudịrị na inye otu ụzọ n’ụzọ iri bụ ihe iwu ji ndị Izrel ime, ma ọ katọrọ ndị ndú okpukpe na-enye nnọọ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile ma “na-eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.”​—⁠Matiu 23:⁠23.

Mgbe Jizọs nwụchara

Mgbe Jizọs nwụchara, ọ dịghịzi mkpa ka a na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri. Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ hichapụrụ ma ọ bụ kagbuo Iwu Mozis, ‘iwu ịnata otu ụzọ n’ụzọ iri’ sokwa na ya.’​—⁠Ndị Hibru 7:​5, 18; Ndị Efesọs 2:​13-15; Ndị Kọlọsi 2:​13, 14.

^ par. 1 Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl a kpọrọ Harper’s Bible Dictionary kwuru na otu ụzọ n’ụzọ iri Baịbụl kwuru okwu ya bụ ego mmadụ wepụtara maka iji ya mee ihe gbasara ofufe Chineke.