Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Igbe Ọgbụgba Ndụ?

Gịnị Bụ Igbe Ọgbụgba Ndụ?

Ihe Baịbụl kwuru

Igbe ọgbụgba ndụ bụ igbe dị nsọ Chineke nyere ndị Izrel iwu ka ha rụọ, ọ gwakwara ha otú ha ga-esi arụ ya. Ọ bụ n’ime ya ka e tinyere “ihe àmà ahụ” ka ọ ghara imebi, ya bụ iwu iri ahụ e dere na mbadamba nkume abụọ ahụ.—Ọpụpụ 25:8-10, 16; 31:18.

  • Otú Ọ ha na Ihe E Ji Rụọ Ya. Igbe ahụ dị kubit abụọ na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu (111 x 67 x 67cm; 44 x 26 x 26 in.). E ji osisi akeshịa rụọ ya, jirikwa ọlaedo machie ime na azụ ya. E ji ọlaedo kpụọ ihe e ji chọọ gburugburu ọnụ ya mma. E jikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe e ji ekpuchi ya, kpụọ cherọb abụọ e ji ọlaedo mee n’akụkụ abụọ nke ihe ahụ e ji ekpuchi ya. Ha chere ibe ha ihu, kpudo ihu n’ihe e ji ekpuchi ya, chịlie nku ha elu ma gbasaa ya n’elu ihe ahụ e ji ekpuchi ya. E ji ọlaedo kpụọ ihe anọ yiri mgbaaka ma rụnye ya n’akụkụ ya anọ. E jikwa osisi akeshịa rụọ okporo osisi e ji ọlaedo machie ma tinye ya n’ihe ahụ yiri mgbaaka ka e jiri ya na-ebugharị ya.—Ọpụpụ 25:10-21; 37:6-9.

  • Ebe E Busara Ya. Ebe mbụ e busara Igbe ahụ bụ n’ebe Kasị Nsọ n’ụlọikwuu. A rụrụ ụlọikwuu ahụ a na-anọ efe ofufe otú a ga na-ebugharị ya ebugharị. A rụrụ ya mgbe a rụrụ Igbe ahụ. E ji àkwà mgbochi sachie ebe e busara igbe ahụ ka ndị nchụàjà na ndị ọzọ ghara ịhụ ya. (Ọpụpụ 40:3, 21) Ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’ebe Igbe ahụ dị otu ugboro n’afọ n’ụbọchị a na-achụ àjà mkpuchi mmehie. (Levitikọs 16:2; Ndị Hibru 9:7) E mechara buga Igbe ahụ n’ebe kasị nsọ n’ụlọ nsọ ahụ Sọlọmọn rụrụ.—1 Ndị Eze 6:14, 19.

  • Ihe Mere E ji Rụọ ya. Ọ bụ n’ime Igbe ahụ ka e debere arịa ndị dị nsọ ga na-echetara ndị Izrel ọgbụgba ndụ ha na Chineke gbara n’Ugwu Saịnaị. Igbe ahụ na-aba ezigbo uru n’ụbọchị a na-achụ àjà mkpuchi mmehie.—Levitikọs 16:3, 13-17.

  • Ihe Ndị E Tinyere n’Ime Igbe Ahụ. Ihe mbụ e tinyere n’ime Igbe ahụ bụ mbadamba nkume abụọ ahụ e dere iwu iri na ya. (Ọpụpụ 40:20) E mechakwara tinye ya ite ọlaedo mana dị n’ime ya nakwa “mkpanaka Erọn nke wara okooko.” (Ndị Hibru 9:4; Ọpụpụ 16:33, 34; Ọnụ Ọgụgụ 17:10) Ọ ga-abụ na e mechara wepụ ite ahụ na mkpanaka Erọn n’ime ya n’ihi na ọ dịghị n’ime Igbe ahụ mgbe e bugara ya n’ụlọ nsọ.—1 Ndị Eze 8:9.

  • Otú E Si Ebugharị Ya. Ndị Livaị na-eji okporo osisi akeshịa ebu Igbe ahụ n’ubu ha. (Ọnụ Ọgụgụ 7:9; 1 Ihe E Mere 15:15) A runyere okporo osisi e ji ebu Igbe ahụ ka ndị Livaị ghara imetụ ya aka mgbe ha na-ebu ya. (Ọpụpụ 25:12-16) A na-eji “àkwà mgbochi” nke kewara ebe Nsọ na ebe Kasị Nsọ ekpuchi Igbe ahụ mgbe ọ bụla a na-ebu ya.—Ọnụ Ọgụgụ 4:5, 6. *

  • Ihe Igbe Ahụ Nọchiri Anya Ya. Igbe ahụ mere ka a mata na Jehova nọnyeere ndị Izrel. Dị ka ihe atụ, ígwé ojii ahụ pụtara n’elu Igbe ahụ dị n’ebe Kasị Nsọ nakwa n’ebe ụmụ Izrel mara ụlọikwuu na-egosi na Jehova nọnyeere ha ma na-agọzi ha. (Levitikọs 16:2; Ọnụ Ọgụgụ 10:33-36) Mgbe Baịbụl kwuru na Jehova “nọ ọdụ n’elu cherọb,” ihe ọ na-ekwu gbasara ya bụ Cherọb abụọ ahụ a kpụrụ n’elu ihe e ji kpuchie Igbe ahụ. (1 Samuel 4:4; Abụ Ọma 80:1) Cherọb abụọ ahụ bụ “ihe nnọchianya ụgbọ ịnyịnya” Jehova. (1 Ihe E Mere 28:18) Ọ bụ n’ihi ihe Igbe ahụ nọchiri anya ya mere Devid ji dee na Jehova “bi na Zayọn” mgbe e bugara Igbe ahụ ebe ahụ.—Abụ Ọma 9:11.

  • Aha Ụfọdụ A Kpọrọ Ya. E nwere ọtụtụ aha Baịbụl kpọrọ Igbe ahụ dị nsọ, dị ka, “Igbe ihe àmà,” “Igbe ọgbụgba ndụ,” “Igbe Jehova” nakwa “Igbe nke ike [Jehova] gị.”—Ọnụ Ọgụgụ 7:89; Jọshụa 3:6, 13; 2 Ihe E Mere 6:41.

    A kpọrọ ihe e ji kpuchie Igbe ahụ “ihe mkpuchi mmehie” ma ọ bụ “ebe mkpuchi mmehie.” (1 Ihe E Mere 28:11; Union Version) Aha a a kpọrọ ya mere ka o doo anya na ihe e ji kpuchie Igbe ahụ nwere ihe pụrụ iche a na-eji ya eme n’ụbọchị mkpuchi mmehie. Nnukwu onye nchụàjà n’Izrel na-efesa ọbara anụ ndị e ji chụọ àjà n’ihu ihe mkpuchi ahụ. Ọbara ahụ o fesara na-aghọ ihe mkpuchi mmehie ‘maka yanwa, ezinụlọ ya nakwa maka ọgbakọ Izrel dum.’—Levitikọs 16:14-17.

Igbe ọgbụgba ndụ ahụ ọ̀ ka dị ruo taa?

E nweghị ihe na-egosi na Igbe ahụ ka dị ruo taa. Baịbụl kwuru na Igbe ahụ abaghịzi uru n’ihi na àjà Jizọs chụrụ mere ka e nwee ọgbụgba ndụ ọhụrụ e ji dochie ọgbụgba ndụ ahụ mere e ji rụọ ya. (Jeremaya 31:31-33; Ndị Hibru 8:13; 12:24) Baịbụl buru amụma na e nwere mgbe Igbe ọgbụgba ndụ ahụ na-agaghịzi adị, ndị na-efe Chineke agaghịkwa na-echeta ya.—Jeremaya 3:16.

Mgbe a malitechara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Jọn onyeozi nọ n’ọhụụ hụ Igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’eluigwe. (Mkpughe 11:15, 19) Igbe ahụ ọ hụrụ n’ọhụụ mere ka a mata na Chineke gọziri ma nabata ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.

Igbe ahụ ọ̀ bụ ọtụmọkpọ?

Mba. Ọ bụghị Igbe ahụ na-eme ka ihe gaziere mmadụ. Di ka ihe atụ, Igbe ahụ dị n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu mgbe ha gara ibuso E-aị agha, ma e meriri ha n’ihi ihe ọjọọ otu onye Izrel mere. (Jọshụa 7:1-6) E nwekwara mgbe ndị Izrel bu Igbe ahụ gaa ịlụso ndị Filistia agha. E meriri ha n’ihi arụrụala Họfnaị na Finihas bụ ndị nchụàjà nọ na-arụ. (1 Samuel 2:12; 4:1-11) Ndị Filistia mechara buru Igbe ahụ laa, ma Chineke tagidere ha ahụhụ rụọ mgbe ha bughachitere ya ndị Izrel.—1 Samuel 5:11–6: 5.

Akụkọ gbasara Igbe ọgbụgba ndụ ahụ

Afọ (T.O.N.K.)

Ihe merenụ

1513

Bezalel na ndị ọzọ ji ihe ndị Izrel tụkọtara rụọ Igbe ahụ.—Ọpụpụ 25:​1, 2; 37:1.

1512

Mgbe Mozis doro Igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ụlọikwuu nakwa ndị nchụàjà nsọ.—Ọpụpụ 40:​1-3, 9, 20, 21.

1512—Ruo mgbe afọ 1070 gachara

E bugara ya ebe dị iche iche.—Jọshụa 18:1; Ndị Ikpe 20:26, 27; 1 Samuel 1:​24; 3:3; 6:​11-​14; 7:​1, 2.

Mgbe afọ 1070 gachara

Eze Devid bubatara ya na Jeruselem.​—2 Samuel 6:​12.

1026

E bugara ya n’ụlọ nsọ Sọlọmọn wuru na Jeruselem.—1 Ndị Eze 8:​1, 6.

642

Eze Josaya bughachiri ya n’ụlọ nsọ.—2 Ihe E Mere 35:3. *

Tupu afọ 607

Ọ ga-abụ na e bupụrụ ya n’ụlọ nsọ. O soghị n’ihe ndị a kpọrọ aha na a kwaara laa Babịlọn mgbe e bibiri ụlọ nsọ ahụ na 607 T.O.N.K. ma ọ bụ ihe ndị e bughachiri na Jerusalem mgbe ha lọghachiri.—2 Ndị Eze 25:13-17; Ezra 1:​7-​11.

63

Mgbe Ọchịagha ndị Rom bụ Pompey merichara Jerusalem ma banye n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọ nsọ ahụ, ọ chọpụtara na Igbe ahụ adịghịzi ebe ahụ. *

^ par. 8 Mgbe ọ bụla ndị Izrel na-emeghị ihe Chineke gwara ha gbasara otú ha ga-esi ebugharị Igbe ahụ nakwa otú a ga-esi na-ekpuchi ya, ọ na-akpatara ha ezigbo nsogbu.—1 Samuel 6:19; 2 Samuel 6:2-7.

^ par. 31 Baịbụl e kwughị mgbe e bupụrụ ya, ihe mere e ji bupụ ya nakwa onye bupụrụ ya.

^ par. 35 Lee akwụkwọ bụ The Histories, nke Tacitus, Book V dere, na paragraf nke 9.