Gaa n'Isiokwu

Olee Otú Ị Ga-esi Adị Ndụ Ebighi Ebi?

Olee Otú Ị Ga-esi Adị Ndụ Ebighi Ebi?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl kwere nkwa, sị: “Onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Gịnị ka Chineke chọrọ ka i mee?

  • Mụọ gbasara Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs. Jizọs kpere ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Olee ihe dị ‘n’ịmata Chineke na Jizọs nke ọma?’ Otú anyị ga-esi amata ha bụ ịmụ Baịbụl nakwa ime ihe ndị anyị na-amụta. * Baịbụl kwuru otú Onye kere anyị na Onye na-enye anyị ndụ, bụ́ Jehova Chineke, si eche echiche. (Ọrụ Ndịozi 17:24, 25) Baịbụl gwakwara anyị gbasara Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, bụ́ onye kụziiri anyị “okwu nke ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:67-69.

  • Nwee okwukwe n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. Jizọs bịara n’ụwa “ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta.” (Matiu 20:28) Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mere ka ụmụ mmadụ nwee ike ịdị ndụ ebighi ebi na paradaịs n’ụwa. * (Abụ Ọma 37:29) Jizọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ihe e kwuru ebe a gosiri na a chọrọ ihe karịrị naanị ikwere na Jizọs. Anyị kwesịrị ‘inwe okwukwe na ya,’ kpebiekwa ime ihe ọ kụziri na ime uche Nna ya.—Matiu 7:21; Jems 2:17.

  • Mee ka gị na Chineke bụrụ ezigbo enyi. Chineke chọrọ ka ị bịaruo ya nso ma bụrụ enyi ya. (Jems 2:23; 4:8) Chineke na-adịru ebighi ebi. Ọ gaghị anwụ anwụ. Ọ chọkwara ka ndị enyi ya dịkwa ndụ ebighi ebi. Chineke si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl gwa anyị ihe ọ chọrọ ka ndị na-achọ ya nweta. Ọ sịrị: “Ka obi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 22:26.

Echiche Na-ezighị Ezi Ndị E Nwere Banyere Ịdị Ndụ Ebighi Ebi

Ụgha: Ndị mmadụ nwere ike iji aka ha eme ka a dịwa ndụ ebighị ebi.

Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na ọganihu ndị e nwerela n’ihe banyere ahụ́ ike na-eme ka ọ dị ka ndụ mmadụ ọ̀ na-agbatịkwu, ọ gaghị emeli ka ndị mmadụ dị ndụ ebighi ebi. Ọ bụ naanị Chineke ga-emeli ka anyị dị ndụ ebighi ebi, n’ihi na ọ bụ ya bụ “isi iyi nke ndụ.” (Abụ Ọma 36:9) O kwere nkwa na ya “ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi,” ma mee ka ndị niile kwesịrị ntụkwasị obi dị ndụ ebighi ebi.—Aịzaya 25:8; 1 Jọn 2:25.

Ụgha: E nwere agbụrụ ọ bụ naanị ha nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi.

Eziokwu: Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama, “ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Ụdị mmadụ ọ bụla si n’agbụrụ dị iche iche ga-adị ndụ ebighị ma ọ bụrụhaala na onye ahụ na-erubere Chineke isi.

Ụgha: Ndụ ebighi ebi ga na-agwụ ike.

Eziokwu: Ọ bụ Chineke, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya ma chọọ ka anyị na-enwe obi ụtọ, kwere nkwa ime ka anyị dị ndụ ebighi ebi. (Jems 1:17; 1 Jọn 4:8) Chineke maara na anyị kwesịrị inwe ihe bara uru anyị na-arụ ka anyị nwee ike inwe obi ụtọ. (Ekliziastis 3:12) Chineke kwere ndị niile ga-adị ndụ ebighi ebi n’ụwa a nkwa na ha ga-enwe ọrụ bara uru ha ga na-arụ ga na-eme ha obi ụtọ. Ọrụ a ga-abara ma hanwa ma ndị ha hụrụ n’anya uru.—Aịzaya 65:22, 23.

Ihe ọzọkwa bụ na ndị ga-adị ndụ ebighi ebi ga-anọgide na-amụta ihe ọhụrụ gbasara Onye kere ha nakwa gbasara ihe ndị ọzọ o kere. O kere ụmụ mmadụ otú ha ga na-achọ ịdị ndụ ebighi ebi na-achọkwa ịmata onye ọ bụ. Ma, ha agaghị ‘achọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.’ (Ekliziastis 3:10, 11) Ma, ndị ahụ ga-adị ndụ ebighi ebi ga na-enwe ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha ha ga na-amụta nakwa ihe ndị ha ga na-eme.

^ par. 2 Ndịàmà Jehova na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego. Ị chọọ ịmatakwu gbasara nke a, lee vidio aha ya bụ Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?

^ par. 3 Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Jizọs Si Azọpụta?