Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke na Nwaanyị Ibikọ Ọnụ n’Alụghị Alụ?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke na Nwaanyị Ibikọ Ọnụ n’Alụghị Alụ?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl kwuru na ihe Chineke chọrọ bụ ka ụmụ mmadụ “zere ịkwa iko.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:⁠3) Ihe so n’ihe ndị Baịbụl kpọrọ “ịkwa iko” bụ di ma ọ bụ nwunye ịgba n’èzí, nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọ nakwa nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọ.

 Gịnị mere Chineke ji chọọ ka nwoke na nwaanyị lụọ alụọ tupu ha ebiri?

  • Ọ bụ Chineke bidoro alụmdi na nwunye. Alụmdi na nwunye malitere mgbe Chineke jikọrọ nwoke na nwaanyị mbụ ka ha bụrụ di na nwunye. (Jenesis 2:​22-24) O bughị n’obi ka nwoke na nwaanyị biri n’alụghị alụ.

  • Chineke maara ihe ga-akacha baara ụmụ mmadụ uru. Ihe Chineke bu n’obi bido alụmdi na nwunye bụ ka nwoke na nwaanyị lụọ alụọ ma ghara ịhapụ ibe ha mgbe ọ bụla. Ime otú ahụ ga-abara ndị niile nọ n’ezinụlọ uru ma na-echebekwa ha. Ka anyị lebagodị anya n’ihe atụ a. Mmadụ zụọ ụdị oche ma ọ bụ tebụl a na-edewe ụkwụ ya na akụkụ ya ndị ọzọ iche iche, ndị rụrụ ya na-etinyekarị ebe ha kọwara otú e kwesịrị isi jikọta ihe ndị ahụ ọnụ. Otú ahụ ka ọ dị n’ihe gbasara alụmdi na nwunye. Ndụmọdụ Chineke nyere na Baịbụl na-eme ka anyị mata otú di na nwunye ga-esi na-ebi n’udo. Iwu Chineke na-abara ndị niile na-erubere ya isi uru mgbe ọ bụla.​—Aịzaya 48:​17, 18.

    Ndị rụrụ oche ma ọ bụ tebụl a na-edewe ụkwụ ya na akụkụ ya ndị ọzọ iche iche na-etinyekarị ebe ha kọwara otú e kwesịrị isi jikọta ihe ndị ahụ ọnụ. Ndụmọdụ ndị Chineke nyere na Baịbụl na-eme ka anyị mata otú di na nwunye ga-esi na-ebi n’udo

  • Nwoke na nwaanyị inwe mmekọ mgbe ha na-alụbeghị nwere ike ịkpata ọtụtụ nsogbu. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịkpata nwaanyị ịtụrụ ime ọkwa, ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọ nwoke na nwaanyị na obi mgbawa. *

  • Chineke kere nwoke na nwaanyị ka ha nwee ike ịmụta nwa ma ha nwee mmekọ. Chineke weere ndụ ka ihe dị nsọ, ịmụta nwa bụkwa ọmarịcha onyinye si n’aka Chineke. Chineke chọrọ ka nwoke na nwaanyị lụọ alụọ tupu ha amụta nwa, si otú a gosi na ha ejighị onyinye ahụ Chineke nyere ha egwuri egwu.​—⁠Ndị Hibru 13:⁠4.

 Olee maka nwoke na nwaanyị ibiri tupu ha alụọ ka ha mara ma ọ̀ ga-adabakwara ha?

Ihe na-eme ka nwoke na nwaanyị na-ebi n’udo ma ha lụọ abụghị ibu ụzọ bikọọ mgbe ha na-alụbeghị, buru n’obi na ọ bụrụ na ọ dabaraghị ha, ha ahapụ ịlụ. Kama, ihe ga-eme ka ha na-ebi n’udo bụ ma ha abụọ kpebisie ike na e nweghị ihe ga-etisa ha, nakwa ha abụọ ịgbakọ aka dozie nsogbu ọ bụla bịara ha. * Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị alụọ alụọ, ọ na-enyere ha aka ikpebisi ike na ha agaghị agbasa ma ọ bụ hapụ ibe ha.—Matiu 19:⁠6.

 Olee ihe di na nwunye ga-eme ka ha nwee ike na-ebi n’udo?

E nweghị di na nwunye na-anaghị enwe nsogbu. Ma ọ bụrụ na di na nwunye ana-eme ihe ndị Baịbụl kwuru, ọ ga-enyere ha aka ịna-ebi n’udo. Ka anyị hụ ụfọdụ ihe ndị Baịbụl kwuru:

^ par. 4 Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-Eto Eto Na-Ajụ, Sị . . . Gịnị Ka M Ga-eme ma Enyi M Chọọ Ka Mụ na Ya Nwee Mmekọ Nwoke na Nwaanyị?