Gaa n'Isiokwu

À Ga-ebibi Ụwa?

À Ga-ebibi Ụwa?

Ihe Baịbụl kwuru

Mba, a gaghị ebibi ụwa anyị a, a gaghịkwa agba ya ọkụ, ma ọ bụkwanụ were ọzọ dochie ya. Baịbụl kwuru na Chineke kere ụwa ka e biri na ya ruo mgbe ebighị ebi.

  • “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”​​—⁠Abụ Ọma 37:⁠29.

  • “[Chineke] tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.”​​—⁠Abụ Ọma 104:⁠5.

  • “Ụwa na-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi.”​​—⁠Ekliziastis 1:⁠4.

  • ‘Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya, Onye mere ka o guzosie ike, ekeghị ya n’efu, ọ kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.’​​—⁠Aịzaya 45:⁠18.

Ụmụ mmadụ hà ga-ebibi ụwa?

Chineke agaghị ekwe ka ụmụ mmadụ jiri imebi ikuku na mmiri, agha, ma ọ bụkwanụ ihe ọ bụla ọzọ bibie ụwa kpamkpam. Kama, ọ ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa a.’ (Mkpughe 11:18) Olee otú Chineke ga-esi eme ya?

Chineke ga-eji Alaeze ya zuru okè nke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa dochie anya ọchịchị ụmụ mmadụ nke na-enwebeghi ike ichebe ụwa a. (Daniel 2:44; Matiu 6:​9, 10) Ọ bụ Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, ga na-achị n’Alaeze ahụ. (Aịzaya 9:​6, 7) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o mere ihe ndị gosiri na ọ ga-achịkwali otú ihe ndị e kere eke si akpa ike. (Mak 4:​35-41) Ebe Jizọs bụ Eze nke Alaeze Chineke, ọ ga na-achị ụwa na ihe niile dị n’ime ya. Ọ ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ n’ụwa otú ha dị n’ogige Iden.​​—⁠Matiu 19:28; Luk 23:⁠43.

Baịbụl ó kwughị na a ga-agba ụwa a ọkụ?

Mba, o kwughị otú ahụ. Ihe na-emekarị ka ụfọdụ ndị chee otú ahụ bụ na ha na-aghọtahie ihe e kwuru na 2 Pita 3:⁠7. Ebe ahụ sịrị: “Eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ.” Ka anyị tụlee ihe abụọ dị ezigbo mkpa ga-enyere anyị aka ịghọta ihe okwu ndị ahụ pụtara.

  1. Na Baịbụl, e nwere ihe dị iche iche “eluigwe,” “ụwa,” na “ọkụ” nwere ike ịpụta. Dị ka ihe atụ, Jenesis 11:1 kwuru, sị: “Ụwa niile wee na-asụ otu asụsụ.” N’ebe a, “ụwa” pụtara ụmụ mmadụ.

  2. Ihe a nọ na-ekwu tupu e kwuo ihe ahụ dị na 2 Pita 3:7 gosiri ihe eluigwe, ụwa, na ọkụ pụtara n’ebe ahụ. Amaokwu nke 5 na nke 6 gosiri na ihe ga-eme eluigwe na ụwa nke dị ugbu a ga-eyi ihe mere n’oge Iju Mmiri Noa. N’oge ahụ, e bibiri ụwa oge ochie, ma o nweghị ihe mere mbara ala anyị. Kama, Iju Mmiri ahụ bibiri ụmụ mmadụ ndị na-eme ihe ike. Ọ bụ ha bụ “ụwa” e bibiri. (Jenesis 6:​11) O bibikwara ihe e nwere ike ịkpọ “eluigwe” e nwere mgbe ahụ, ya bụ, ụmụ mmadụ chịrị ụwa n’oge ahụ. N’ihi ya, ihe e bibiri bụ ụmụ mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ọ bụghị ụwa nkịtị. E bibighị Noa na ezinụlọ ya mgbe e bibiri ụwa oge ahụ. Ọ bụkwa n’ụwa ka ha ka bi mgbe Iju Mmiri ahụ gachara.​​—⁠Jenesis 8:​15-​18.

Mgbe a ga-ebibi ụwa nke dị ugbu a, nke “ọkụ” ahụ e kwuru okwu ya na 2 Pita 3:7 nọchiri anya ya, ọ bụ naanị ndị ọjọọ ka a ga-ebibi, o nweghị ihe ga-eme ụwa nkịtị anyị a otú ahụ ọ na-enweghị ihe mere ya mgbe e ji Iju Mmiri bibie ụwa n’oge Noa. Chineke kwere nkwa na a ga-enwe “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” nke ‘ezi omume ga-ebi n’ime ha.’ (2 Pita 3:​13) “Eluigwe ọhụrụ,” ma ọ bụ ọchịchị ọhụrụ, ya bụ, Alaeze Chineke ga-achị “ụwa ọhụrụ,” ma ọ bụ ụmụ mmadụ ọhụrụ bụ́ ndị ezi omume. Mgbe Alaeze ahụ ga-achịwa ụwa, ụwa ga-aghọ paradaịs ebe udo dị.​​—⁠Mkpughe 21:​1-4.