Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri Ndị Ihe Na-esiri Ike na Ndị Ji Ụgwọ Aka?

Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri Ndị Ihe Na-esiri Ike na Ndị Ji Ụgwọ Aka?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ee. Baịbụl ga-enyeliri ha aka. Lee ụzọ ihe anọ Baịbụl kwuru ga-enyere ha aka.

  1.   Azụla ihe ọ bụla ị hụrụ. Baịbụl sịrị na “atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru, ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.” (Ilu 21:5) Azụla ihe ọ bụla naanị na ị nụrụ na a na-ere ya ere. Kpebie ego ole ị ga-emefu, gbaliakwa ka ị ghara imefu ego karịrị ego ole ahụ i kpebiri.

  2.   Ejila ụgwọ n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya. Baịbụl kwuru, sị: ‘Onye gbaziiri ihe bụ ohu onye gbazinyere ya ihe.’ (Ilu 22:7) Ọ bụrụ na i jiwela ụgwọ ejiwe, ya abụrụkwa na ị naghị akwụbata ego ole a chọrọ ka ị na-akwụbata, gakwuru onye i ji ụgwọ ka gị na ya kwurịta otú ọzọ ị ga-esi na-akwụ ya ụgwọ ahụ. Nọgide na-arịọ ya. Mee ihe Baịbụl gwara onye nara mmadụ n’ibé, onye ahụ ọ nara n’ibé aghara ịkwụghachi ego ọ gbaziiri, ya esi otú ahụ koro ụgwọ ahụ. Baịbụl sịrị ya: “Gaa daa n’ala, rịọsiekwa mmadụ ibe gị arịrịọ ike. Ekwela ka ụra gaa gị n’anya ma ọlị, ekwekwala ka anya gị nke na-enwu gbaa roo ụra.” (Ilu 6:1-5) Ọ bụrụgodị na o kwetaghị na nke mbụ ị rịọrọ ya, nọgide na-arịọ ya.

  3.   Ewerela ego ka ihe kacha mkpa ná ndụ. Baịbụl sịrị: “Onye aka ntagide na-achọ akụnụụba ma ọ maghị na ụkọ ihe ga-adakwasị ya.” (Ilu 28:22, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Mmadụ inwe anyaụfụ na mmadụ ịdị anyaukwu ga-eme ka ihe siere onye ahụ ike, meekwa ka ife Chineke ghara ịbụ mkpa ya.

  4.   Ka ihe i nwere ju gị afọ. Baịbụl sịrị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:8) Ego enweghị ike ime ka ụwa zuoro onye nwere ya ma ọ bụkwanụ mee ka ọ na-enwe obi ụtọ. Ụfọdụ n’ime ndị kacha nwee obi ụtọ abụdịghị ndị nwere ego. Ihe mere obi ji dị ha ụtọ bụ maka na ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha hụrụ ha n’anya, ha na Chineke adịrịkwa ná mma.​—Ilu 15:17; 1 Pita 5:6, 7.