Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka ma Echiche Igbu Onwe M Batawa M n’Obi?

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka ma Echiche Igbu Onwe M Batawa M n’Obi?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ee! Baịbụl bụ akwụkwọ si n’aka “Chineke, bụ́ onye na-akasi ndị e wedara n’ala obi.” (2 Ndị Kọrịnt 7:6) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ na-ekwu maka ọrịa na isi ịkpakọ mmadụ ọnụ, ma o nyerela ọtụtụ ndị aka ka ha kwụsị ịna-eche echiche igbu onwe ha. Ndụmọdụ ndị dị na ya nwekwara ike ịbara gị uru.

 Olee ndụmọdụ ndị bara uru Baịbụl nyere?

  • Mee ka ndị ọzọ mara ihe ndị na-echegbu gị.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”​—Ilu 17:17.

     Ihe ọ pụtara: Mgbe ọ bụla anyị nwere ihe na-echegbu anyị, ọ dị mkpa ka anyị gwa ya ndị ọzọ ka ha nyere anyị aka.

     Ọ bụrụ na i meghị ka ndị ọzọ mara ihe ndị na-echegbu gị, o nwere ike ịbụrụ gị ibu ga-anyịgbu gị. Ma ọ bụrụ na ị kọọrọ ya ndị ọzọ, o nwere ike ịdịtụrụ gị mfe. O nwedịrị ike ime ka ị mata na nsogbu ahụ adịchaghị njọ otú i chere.

     Megodị ihe a: Chọọ onye ị ga-akọrọ otú obi dị gị taa. O nwere ike ịbụ onye ezinụlọ gị ma ọ bụ enyi ị tụkwasịrị obi. * I nwekwara ike idetu otú obi dị gị n’akwụkwọ.

  • Gaa hụ dọkịta.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu.”​—Matiu 9:12.

     Ihe ọ pụtara: Anyị kwesịrị ịga hụ dọkịta ma ọ bụrụ na ahụ́ adịghị anyị.

     Mmadụ ichewe echiche igbu onwe ya nwere ike igosi na isi akpakọchaghịzi onye ahụ ọnụ. Ebe ọ bụ na ihere ekwesịghị ime mmadụ ma ọ rịawa ọrịa dị ka isi ọwụwa ma ọ bụ ahụ́ ọkụ, ihere ekwesịghị imewe anyị ma ụdị ihe a mewe anyị. E nwere ike ịgwọta onye isi na-akpakọchaghịzi ọnụ ma ọ bụ onye na-echegbukarị onwe ya.

     Megodị ihe a: Egbula oge ịga hụ dọkịta maara nke a na-akọ.

  • Cheta na ihe banyere gị na-emetụ Chineke n’obi.

     Ihe Baịbụl kwuru: “A na-ere nza ise mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali naanị ihe dị nta, ka ọ́ bụghị ya? Ma a dịghị echefu otu n’ime ha n’ihu Chineke. . . . Unu atụla egwu; unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”​—Luk 12:​6, 7.

     Ihe ọ pụtara: Chineke ji gị kpọrọ ihe.

     O nwere ike ịdị gị ka o nweghị onye ihe gbasara gị na-emetụ n’obi, ma cheta na Chineke na-ahụ ihe gị na ya na-alụ. Ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi, ọ sọgodi ya ya bụrụ na ike ụwa agwụla gị. Abụ Ọma 51:17 sịrị: “Chineke, ị gaghị eleghara obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute, anya.” Chineke chọrọ ka ị dịrị ndụ n’ihi na ọ hụrụ gị n’anya.

     Megodị ihe a: Chọpụta ihe ndị Baịbụl kwuru gosiri na Chineke hụrụ gị n’anya. Dị ka ihe atụ, gụọ isi nke 24 n’akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso, nke bụ́ akwụkwọ e ji amụ Baịbụl.

  • Kpegara Chineke ekpere.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”​—1 Pita 5:7.

     Ihe ọ pụtara: Chineke chọrọ ka ị kọọrọ ya kpọmkwem ihe niile dị gị n’obi ma gwa ya ihe niile na-echegbu gị.

     Chineke nwekwara ike ime ka obi ruo gị ala ma nyekwa gị ike ị ga-eji die ihe ọ bụla bịaara gị. (Ndị Filipaị 4:​6, 7, 13) Ọ bụ otú a ka ọ na-esi akwado ndị niile ji obi ha na-arịọ ka o nyere ha aka.​—Abụ Ọma 55:22.

     Megodị ihe a: Kpegara Chineke ekpere taa. Kpọọ ya aha ya, bụ́ Jehova, mgbe ị na-ekpe ekpere ahụ ma gwa ya nnọọ otú obi dị gị. (Abụ Ọma 83:18) Rịọ ya ka o nyere gị aka ka ị na-edi nsogbu gị.

  • Na-echebara nkwa ndị Baịbụl kwere maka ọdịnihu echiche.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka maka mkpụrụ obi. Ọ bụ nke e ji n’aka, nke guzosikwara ike.”​—Ndị Hibru 6:19.

     Ihe ọ pụtara: Obi gị nwere ike ịna-awụgharị gị ka ụgbọ mmiri ebili mmiri na-enugharị, obi dịtụ gị mma, obi ajọtụ gị njọ. Ma, olileanya si na Baịbụl ga-eme ka obi sie gị ike.

     Olileanya ahụ dị na Baịbụl abụghị mmadụ ịmụ anya na-arọ nrọ, kama ha bụ nkwa ndị Chineke n’onwe ya kwere na ya ga-ewepụ ihe niile na-akpata ahụ́ ụfụ.​—Mkpughe 21:4.

     Megodị ihe a: Gụọ isi nke 5 na broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! ka ị matakwuo nkwa ndị Chineke kwere na Baịbụl.

  • Na-eme ihe ndị na-amasị gị ime.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa.”​—Ilu 17:22.

     Ihe ọ pụtara: Mgbe anyị na-eme ihe ndị na-eme anyị obi ụtọ, o nwere ike ime ka ahụ́ dịkwuo anyị mma.

     Megodị ihe a: Chọọ otu ihe na-atọ gị ụtọ ime mee. Dị ka ihe atụ, gee egwú ga-eme ka obi na-atọ gị ụtọ, gụọ otu akụkọ na-agba ume, ma ọ bụ mee otu ihe ị na-enwe mmasị ime. Ihe ọzọkwa ga-eme ka ị na-enwekwu obi ụtọ bụ ịna-emere ndị ọzọ ihe, ọ sọgodị ya ya bụrụ obere ihe ka i meere ha.​—Ọrụ Ndịozi 20:35.

  • Lekọta onwe gị anya.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara . . . uru.”​—1 Timoti 4:8.

     Ihe ọ pụtara: Imega ahụ́, ihi ezigbo ụra, na iri nri na-edozi ahụ́ na-abara anyị uru.

     Megodị ihe a: Wepụta oge gasie ije ike, ọ bụrụgodị naanị nkeji iri na ise n’ụbọchị.

  • Cheta na otú obi dị mmadụ na-agbanwe agbanwe, otú ahụ ihe ndị ọzọ ná ndụ na-agbanwekwa.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.”​—Jems 4:14.

     Ihe ọ pụtara: Nsogbu na-echu mmadụ ụra taa, ọ sọkwa ya ya bụrụ nke yiri ka o nweghị ngwọta ugbu a, nwere ike ọ gaghị adịte aka.

     Otú ọ sọkwara ya yie ka nsogbu ị na-enwe taa a ọ̀ dịruru njọ, ihe nwere ike ịgbanwe echi. N’ihi ya, mee ihe ọ bụla i nwere ike ime ka i die ya. (2 Ndị Kọrịnt 4:8) Nsogbu ahụ ị na-enwe nwere ike ịkwụsị ka oge na-aga, ma ọ bụrụ na i gbuo onwe gị, nsogbu nke ahụ enweghị ngwọta.

     Megodị ihe a: Gụọ akụkọ Baịbụl ndị kwuru gbasara ndị ike ụwa gwụrụ, nke na ha chọrọ ka ọnwụ bịa gburu ha. Ị ga-ahụ otú ndụ ha si mechaa ka mma, ọtụtụ mgbekwa, o mere otú ha na-atụghịdị anya ya. Ka anyị hụ ụfọdụ n’ime ha.

 È nwere ndị Baịbụl kọrọ na o nwere mgbe ha chọrọ ka ọnwụ bịa gbuo ha?

 Ee. Baịbụl kwuru na e nwere ndị kwuru ihe gosiri na ha chọrọ ka ọnwụ bịa gburu ha. Chineke abaraghị ha mba, kama o nyeere ha aka. O nwekwara ike imere gị otu ihe ahụ.

Ịlaịja

  •  Ònye ka ọ bụ? Ịlaịja bụ onye amụma nwere obi ike. Ma o nwere mgbe ike ụwa gwụrụ ya. Jems 5:17 sịrị: “Ịlaịja bụ nwoke nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.”

  •  Gịnị mere o ji chọọ ịnwụ? O nwere oge ọ dị Ịlaịja ka ọ̀ bụ naanị ya nọ, ụjọ jikwa ya, ya adịkwa ya ka o nweghịzi uru ya bara. N’ihi ya, ọ rịọrọ Chineke, sị: “Jehova, wepụ mkpụrụ obi m.”​—1 Ndị Eze 19:4.

  •  Gịnị nyeere ya aka? Ịlaịja kọọrọ nnọọ Chineke otú ọ dị ya n’obi. Olee otú Chineke si gbaa ya ume? Chineke gosiri na ọ ghọtara otú obi dị ya ma mee ka Ịlaịja hụ ụdị ike O nwere. O mekwara ka obi sie Ịlaịja ike na ọ ka bara uru, nyekwa Ịlaịja onye ruru eru ga-enyere ya aka ma hụ ya n’anya.

  •  Gụọ gbasara Ịlaịja: 1 Ndị Eze 19:​2-18.

Job

  •  Ònye ka ọ bụ? Job bụ nwoke bara ezigbo ọgaranya. O nwekwara ezinụlọ buru ibu, bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe ezi Chineke.

  •  Gịnị mere o ji chọọ ịnwụ? Ọtụtụ ihe ọjọọ bidoro ime Job ná mberede. Ihe niile o nwere funahụrụ ya. Ụmụ ya niile nwụkwara n’otu ihe mberede. O bidoro ịrịa otu ọrịa ọjọọ. N’ikpeazụ, ndị sị na ha bụ ndị enyi ya boro ya ebubo na ọ bụ ya metere ihe nsogbu niile ahụ ji na-abịara ya. Job kwuru na ndụ ya agwụla ya ike nakwa na ya achọghịzi ịdị ndụ.​—Job 7:16.

  •  Gịnị nyeere ya aka? Job kpegaara Chineke ekpere. Ọ gwakwara ndị ọzọ okwu. (Job 10:​1-3) Enyi ya bụ́ Elaịhu, onye nwere ọmịiko, gbara ya ume. O nyeere ya aka ile nsogbu ya anya otú dị mma. Nke kachanụ bụ na Job nabatara ndụmọdụ na enyemaka Chineke.

  •  Gụọ gbasara Job: Job 1:​1-3, 13-​22; 2:7; 3:​1-13; 36:​1-7; 38:​1-3; 42:​1, 2, 10-13.

Mozis

  •  Ònye ka ọ bụ? Mozis bụ onye ndú ndị Izrel oge ochie, bụrụkwa onye amụma ji obi ya niile jeere Chineke ozi.

  •  Gịnị mere o ji chọọ ịnwụ? Ọrụ Mozis nwere karịrị ya aka, e nwere ndị na-ekwujọ ya mgbe niile nke mekwara ka ike gwụ ya. N’ihi ya, ọ gwara Chineke, sị: “Biko, gbuo m ka m nwụọ.”​—Ọnụ Ọgụgụ 11:​11, 15.

  •  Gịnị nyeere ya aka? Mozis gwara Chineke otú obi dị ya. Chineke mekwara ka ọrụ Mozis dịrị ya mfe ka ike ghara ịna-agwụ ya.

  •  Gụọ gbasara Mozis: Ọnụ Ọgụgụ 11:​4-6, 10-17.

^ Ọ bụrụ na ị na-echesi echiche ike igbu onwe gị, ya abụrụkwa na o nweghị onye ezinụlọ gị nọ nso ị ga-akọrọ otú obi dị gị, kpọọ ndị na-ahụ maka ihe gbata gbata n’ebe i bi kọọrọ ha, ma ọ bụrụ na e nwere ya.