Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ịkpọ Ozu Ọkụ?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ịkpọ Ozu Ọkụ?

Ihe Baịbụl kwuru

O nweghị ebe Baịbụl kwuru kpọmkwem banyere ịkpọ ozu ọkụ. O nweghịkwanụ ebe Baịbụl nyere iwu na a ga na-eli ozu eli ma ọ bụ kpọọ ya ọkụ.

Baịbụl kwuru gbasara ndị fere Chineke ndị liri ndị ha nwụrụ anwụ. Dị ka ihe atụ, Ebreham gbara ezigbo mbọ nweta ebe ọ ga-eli Sera, nwunye ya.​—Jenesis 23:​2-​20; 49:​29-​32.

Baịbụl kwukwara gbasara ndị fere Chineke ndị kpọrọ ozu ndị nwụrụ anwụ ọkụ. Dị ka ihe atụ, mgbe e gburu Eze Sọl nke Izrel na ụmụ ya nwoke atọ n’agha, ozu ha tọgbọ n’ebe ndị iro ha ji ha mere ihe masịrị ha. Mgbe ndị dike Izrel nụrụ banyere ya, ha gara buru ozu Sọl na ụmụ ya, kpọọ ha ọkụ ma lie ọkpụkpụ ha. (1 Samuel 31:​8-​13) Baịbụl gosiri na nke a bụ ụzọ dị mma e nwere ike isi lie ozu ụmụ nwoke ndị ahụ.​—2 Samuel 2:​4-6.

Ihe ụfọdụ na-abụghị eziokwu banyere ịkpọ ozu ọkụ

Ụgha: Ịkpọ ozu ọkụ bụ ịkparị onye ahụ nwụrụ anwụ.

Eziokwu: Baịbụl kwuru na ndị nwụrụ anwụ na-alaghachi n’ájá, nke bụ́ ihe na-emekarị ozu ma o ree. (Jenesis 3:​19) Ịkpọ ozu ọkụ na-enye aka mee ka ozu ahụ ree ngwa ngwa ma ghọọ ntụ ma ọ bụ ájá.

Ụgha: Ọ bụ naanị ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma ka Baịbụl kwuru na a kpọrọ ozu ha ọkụ.

Eziokwu: E nwere ndị nupụụrụ Chineke isi Baịbụl kwuru na a kpọrọ ozu ha ọkụ, dị ka Ekan na ndị ezinụlọ ya. (Joshụa 7:25) Ma nke a bụ ihe mere naanị otu ugbo, emeghị ya ka ọ bụrụ iwu. (Diuterọnọmi 21:​22, 23) Dị ka anyị kwuru ná mbụ, e nwedịrị ndị rubeere Chineke isi a kpọrọ ozu ha ọkụ, dị ka Jọnatan, nwa Eze Sọl.

Ụgha: Chineke agaghị akpọlite onye a kpọrọ ozu ya ọkụ.

Eziokwu: Ihe ọ bụla e mere ozu agaghị egbochi Chineke ịkpọlite onye nwụrụ anwụ, ma e liri ya n’ala, kpọọ ya ọkụ, onye ahụ ò furu n’ime osimiri, ma ọ bụ anụ ọhịa tagburu ya. (Mkpughe 20:13) Ọ gaghị esiri Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ike inye onye ahụ ahụ́ ọhụrụ.​—1 Ndị Kọrịnt 15:​35, 38.