Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ibu Ọnụ?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ibu Ọnụ?

Ihe Baịbụl zara

N’oge ochie, Chineke kwadoro ibu ọnụ ma ọ bụrụ na e bu ihe kwesịrị ekwesị n’obi na-ebu ya. Ma, ọ naghị amasị Chineke ma ọ bụrụ na a na-ebu ọnụ naanị iji mezuo iwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na n’oge anyị a, Baịbụl enyeghị iwu ka a na-ebu ọnụ, ọ sịghịkwanụ onye ebukwala ọnụ.

Olee ihe ndị mere ụfọdụ ndị e kwuru gbasara ha na Baịbụl ji buo ọnụ?

  • Mgbe mmadụ chọrọ ka Chineke nyere ya aka ma ọ bụ ka o duzie ya. Ndị Izrel na-alaghachi Jeruselem buru ọnụ iji gosi na arịrịọ ha nọ na-arịọ Chineke ka o nyere ha aka si ha n’obi. (Ezra 8:​21-​23) Pọl na Banabas kpebiri ibu ọnụ mgbe ụfọdụ ma ha họpụtawa ndị okenye ọgbakọ.​—Ọrụ Ndịozi 14:23.

  • Mgbe mmadụ chọsiri ike ka nzube Chineke mee. Mgbe Jizọs mechara baptizim, o buru ọnụ ụbọchị 40 iji kwadebe onwe ya ime uche Chineke n’ozi ọ na-aga ije.​—Luk 4:​1, 2.

  • Mgbe mmadụ na-egosi na ya echegharịala ná mmehie ndị o mere n’oge gara aga. Chineke si n’ọnụ Joel onye amụma gwa ndị Izrel na-enupụrụ ya isi, sị: “Jirinụ obi unu dum, na ibu ọnu na ịkwa ákwá na iti mkpu arịrị lọghachikwute m.”​—Joel 2:​12-15.

  • N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ihe so n’Iwu Chineke nyere mba Izrel bụ na ha ga na-ebu ọnụ kwa afọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. * (Levitikọs 16:​29-​31) Ibu ọnụ n’ụbọchị ahụ dabara adaba n’ihi na ọ  na-echetara ndị Izrel na ha ezughị okè nakwa na ọ dị ha mkpa ka Chineke gbaghara ha.

Olee ụfọdụ ihe na-ekwesịghị ekwesị a na-ebu n’obi ebu ọnụ?

  • Ime ka a sịkwa. Jizọs kụziri na ibu ọnụ bụ okwu aka mmadụ, nke gbasara naanị onye ahụ na Chineke.​—Matiu 6:​16-​18.

  • Mmadụ ime ka ọ̀ bụ onye ezi omume. Ibu ọnụ anaghị eme ka mmadụ kara ndị ọzọ mma, ọ pụtaghịkwa na ọ bụ onye ahụ kacha ekpere Chineke.​—Luk 18:​9-​14.

  • Mmadụ ime ya ka o jiri ya kagbuo ihe ọjọọ o leziri anya na-eme. (Aịzaya 58:​3, 4) Ọ bụ naanị onye na-erubere Chineke isi, nke jikwa obi ya niile chegharịa ná mmehie ya, ka ọ na-anabata ọnụ ọ na-ebu.

  • Iji mezuo iwu okpukpe mmadụ na-ekpe tiri. (Aịzaya 58:​5-7) Otú ahụ ọ na-ewute ndị mụrụ ụmụ ma ụmụ ha na-erubere ha isi naanị iji mezuo iwu, ka ọ na-adịkwa Chineke ma anyị na-ebu ọnụ n’ihi na e tiri ya n’iwu.

Ọ̀ bụ iwu na Ndị Kraịst ga na-ebu ọnụ?

Mba. Chineke nyere iwu ka ndị Izrel buo ọnụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ma, o wepụrụ iwu ahụ mgbe Jizọs kpuchiri kpam kpam mmehie nke ndị ji obi ha niile chegharịa. (Ndị Hibru 9:​24-​26; 1 Pita 3:​18) A gwaghị Ndị Kraịst ka ha na-edebe Iwu Mozis, nke Ụbọchị Mkpuchi Mmehie bụ otu n’ime ya. (Ndị Rom 10:4; Ndị Kọlọsi 2:​13, 14) N’ihi ya, ọ bụ Onye Kraịst ọ bụla ga-ekpebi ma ọ̀ ga-ebu ọnụ ma ọ gaghị ebu.​—Ndị Rom 14:​1-4.

Ndị Kraịst ma na e jighị ibu ọnụ amata ezigbo ndị na-efe Chineke. Baịbụl ekwughịkwa na ibu ọnụ na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Kama, e ji ọṅụ mara Ndị Kraịst na-ekpere Chineke otú ọ chọrọ, otú ahụ e jikwa ya mara Jehova, bụ́ Chineke “onye obi ụtọ.”​—1 Timoti 1:11; Ekliziastis 3:​12, 13; Ndị Galeshia 5:22.

Echiche na-ezighị ezi ndị e nwere banyere ihe Baịbụl kwuru gbasara ibu ọnụ

Echiche na-ezighị ezi: Pọl onyeozi kwuru ka di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-ebu ọnụ.​—1 Ndị Kọrịnt 7:​5, King James Version.

Nke bụ́ eziokwu: Ihe odide ndị kacha ochie e ji sụgharịa Baịbụl akpọghị ibu ọnụ aha ná 1 Ndị Kọrịnt 7:5. * Ihe a gosiri na ọ bụ ndị depụtaghachiri ihe odide ahụ denyere ibu ọnụ, ma n’ebe a ma na Matiu 17:21; Mak 9:​29; nakwa n’Ọrụ Ndịozi 10:30. Ọtụtụ nsụgharị Baịbụl n’oge anyị a anaghị ekwe etinye ebe ndị a a gbakwụnyere ibu ọnụ.

Echiche na-ezighị ezi: Ndị Kraịst kwesịrị ibu ọnụ iji na-echeta abalị iri anọ ahụ Jizọs buru ọnụ n’ala ịkpa mgbe o mechara baptizim.

Nke bụ́ eziokwu: E nweghị mgbe Jizọs kwuru ka e buo ụdị ọnụ a, e nweghịkwa ihe dị na Baịbụl gosiri na Ndị Kraịst oge mbụ buru ụdị ọnụ a. *

Echiche na-ezighị ezi: Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ebu ọnụ n’oge a na-echeta ọnwụ Jizọs.

Nke bụ́ eziokwu: Jizọs ekwughị ka ndị na-eso ụzọ ya buwe ọnụ n’oge ha ji echeta ọnwụ ya. (Luk 22:​14-​18) Ọ bụ eziokwu na Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-ebu ọnụ ma ọ nwụọ, o nyeghị ha ya ka iwu, kama ihe o kwuru bụ naanị ihe ga-emecha mee. (Matiu 9:​15) Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka onye agụụ na-agụ rie ihe n’ụlọ tupu ha abịawa Ncheta Ọnwụ Jizọs.​—1 Ndị Kọrịnt 11:​33, 34.

^ par. 5 Chineke gwara ndị Izrel, sị: “Unu ga-emekpa mkpụrụ obi unu ahụ́,” ma ọ bụ “taa mkpụrụ obi unu ahụhụ,” n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. (Levitikọs 16:​29, 31; King James Version) E weere ya na ihe a na-ekwu gbasara ya ebe a bụ ibu ọnụ. (Aịzaya 58:3) N’ihi ya, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society bipụtara sụgharịrị amaokwu ahụ otú a: “Ọ bụ . . . ụbọchị unu ga-ebu ọnụ, ya bụ, ụbọchị ịtụgharị uche na nchegharị n’ime obi unu.”

^ par. 13 Gụọ ihe e dere n’akwụkwọ bụ́ A Textual Commentary on the Greek New Testament, nke Bruce M. Metzger dere, Mbipụta nke Atọ, peeji nke 554.

^ par. 15 Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru banyere ụbọchị iri anọ ahụ e ji ebu ọnụ a na-akpọ Lent, sị: “N’ime narị afọ atọ ka ndịozi Jizọs nwụchara, oge e ji ebu ọnụ iji kwadebe maka ememme Ista anaghị agafe otu izu; ọ na-abụkarị otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. . . . Ọ bụ ná nnọkọ ahụ ndị ụkọchukwu nwere na Naịsia ka e kwutetụrụ ihe gbasara ibu ọnụ ụbọchị iri anọ. Ma, ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwudị na ọ bụghị Lent ka e bu n’uche.”​—Mbipụta nke Abụọ, Mpịakọta nke 8, peeji nke 468.