Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka “Anya Laara Anya” Pụtara?

Gịnị Ka “Anya Laara Anya” Pụtara?

Ihe Baịbụl zara

“Anya laara anya” so n’Iwu Chineke gwara Mozis ka o nye ndị Izrel n’oge gboo. Jizọs kwughachikwara ya mgbe ọ nọ n’elu ugwu na-akụzi ihe. (Matiu 5:​38, Bible Nsọ nke Union Version; Ọpụpụ 21:​24, 25; Diuterọnọmi 19:21) Ihe ọ pụtara bụ na a tawa onye mere ihe ọjọọ ahụhụ, e kwesịrị ịta ya ahụhụ ya na ihe o mere hà otu. *

Iwu a bụ gbasara onye ma ụma merụọ onye ọzọ ahụ́. E nwere ihe Iwu Mozis kwuru gbasara onye mere otú ahụ. Ọ sịrị: “Ịgbaji ọkpụkpụ ga-alara ịgbaji ọkpụkpụ, anya alaara anya, ezé alaara ezé; ụdị nkwarụ o mere ka onye ahụ nwee ka a ga-eme ka o nwee.”​​—⁠Levitikọs 24:⁠20.

 Gịnị mere e ji nye iwu “anya laara anya”?

E nyeghị iwu “anya laara anya” ka onye ọ bụla nwee ike ịna-emegwara ihe e mere ya. Kama, e nyere ya iji nyere ndị a họpụtara ka ha na-ekpe ikpe aka ịta onye mehierenụ ahụhụ kwesịịrị ya. Ha agaghị ata ya ahụhụ ka ndị obi fere azụ, ha agaghịkwanụ emefere ya ebere ókè.

Iwu a na-emekwa ka onye bu n’obi imerụ ndị ọzọ ahụ́ ma ọ bụ onye na-akpa nkata ime otú ahụ gbanwee obi ya. Iwu Mozis kwuru, sị, “Ndị fọdụrụ [ya bụ, ndị hụrụ ka a na-ata mmadụ ahụhụ kwesịịrị ya otú Chineke chọrọ] ga-anụkwa ya wee tụọ egwu, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ha ga-eme ụdị ihe ọjọọ a n’etiti unu.”​​—⁠Diuterọnọmi 19:⁠20.

 Iwu “anya laara anya” ọ̀ gbasara Ndị Kraịst?

Mba, iwu a abụghị maka Ndị Kraịst. O so n’Iwu Mozis ndị àjà Jizọs chụrụ kagburu.​​—⁠Ndị Rom 10:⁠4.

Mana, iwu a mere ka anyị ghọta otú Chineke si eche echiche. Otu ihe o mere ka anyị ghọta bụ na Chineke ji ikpe ziri ezi kpọrọ ihe. (Abụ Ọma 89:14) O mekwara ka anyị ghọta otú Chineke si ekpe ikpe ziri ezi, ya bụ, na e kwesịrị ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ ruo “n’ókè kwesịrị ekwesị.”​​—⁠Jeremaya 30:⁠11.

 Ihe na-abụghị eziokwu a na-ekwu gbasara iwu “anya laara anya”

Ihe na-abụghị eziokwu a na-ekwu: Obi fere onye tiri iwu “anya laara anya” azụ.

Nke bụ́ eziokwu: Iwu a akwadoghị ka ndị a họpụtara ikpe ikpe jiri aka ike na obi ọjọọ na-ekpe ikpe. Kama, e mee ihe otú iwu ahụ kwuru, ọ pụtara na tupu ndị a họpụtara ikpe ikpe ekpebie ihe a ga-eme, ha ga-ebu ụzọ leruo ihe niile merenụ anya, chọpụtakwa otú onye ahụ mejọrọ ihe kpacharuru anya mee ihe ahụ. (Ọpụpụ 21:​28-​30; Ọnụ Ọgụgụ 35:​22-​25) Ihe a niile na-egosi na iwu “anya laara anya” nyere aka hụ na a tafeghị mmadụ ahụhụ ókè ma ọ bụkwanụ mefeere ya ebere ókè.

Ihe na-abụghị eziokwu a na-ekwu: Iwu “anya laara anya” nyere onye ọ bụla ikike imegwara ihe e mere ya.

Nke bụ́ eziokwu: E nwere Iwu Mozis nke kwuru, sị: “Abọla ọbọ, eburula ụmụ ndị gị iwe n’obi.” (Levitikọs 19:18) Iwu Mozis anaghị agba ndị mmadụ ume imegwara ihe e mere ha. Kama, ọ na-agba ha ume ka ha tụkwasị Chineke obi, nabatakwa ndokwa o mere ka e nwee ndị ikpe ga na-edoziri ha okwu.​​—⁠Diuterọnọmi 32:⁠35.

^ par. 1 Ihe a na-akpọ iwu a mgbe ụfọdụ na Latịn bụ lex talionis. Obodo ndị ọzọ n’oge gboo tikwara ụdị iwu a.