Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Na-acha Uhie Uhie E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 17?

Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Na-acha Uhie Uhie E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 17?

Ihe Baịbụl kwuru

 Anụ ọhịa ahụ nke na-acha uhie uhie, e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 17, nọchiri anya òtù na-anọchite anya mba niile dị́ n’ụwa, na-agbakwa mbọ ka ha dị n’otu. Mgbe mbụ òtù a pụtara, a kpọrọ ya Njikọ Mba Niile, ma a na-akpọzi ya Òtù Mba Ụwa.

Ihe ndị ga-enyere gị aka ịmata anụ ọhịa ahụ nke na-acha uhie uhie

  1.   Ọ bụ òtù na-achị achị. Anụ ọhịa ahụ nke na-acha uhie uhie nwere “isi asaa” ndị e kwuru na ha nọchiri anya “ugwu asaa” nakwa “ndị eze asaa,” ma ọ bụ ọchịchị. (Mkpughe 17:​9, 10) Na Baịbụl, ugwu na anụ ọhịa dị iche iche na-anọchi anya ọchịchị.​—Jeremaya 51:24, 25; Daniel 2:​44, 45; 7:​17, 23.

  2.   Ọ na-anọchi anya ọchịchị ụwa niile. Anụ ọhịa ahụ nke na-acha uhie uhie yiri anụ ọhịa nke nwere isi asaa e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13, nke nọchiri anya ọchịchị ụwa niile. Anụ ọhịa abụọ a nwere isi asaa, mpi iri, nakwa aha na-ekwulu Chineke. (Mkpughe 13:1; 17:3) O doro anya na otú a ha si yie abụghị ná ndaba. Anụ ọhịa ahụ nke na-acha uhie uhie bụ ihe na-anọchi anya ọchịchị ụwa niile.​—Mkpughe 13:15.

  3.   Ike ya si n’aka ndị ọchịchị ndị ọzọ. Anụ ọhịa ahụ nke na-acha uhie uhie si n’ọchịchị ndị ọzọ pụta, nke pụtara na ha nyere ya ikike.​—Mkpughe 17:11, 17.

  4.   E nwere ihe jikọrọ ya na okpukpe. Babịlọn Ukwu ahụ, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, nọ n’elu anụ ọhịa ahụ nke na-acha uhie uhie. Ihe ọ na-egosi bụ na ndị okpukpe na-agwa ya ihe ọ ga-eme.​—Mkpughe 17:​3-5.

  5.   Ọ naghị asọpụrụ Chineke. Anụ ọhịa ahụ nwere ‘aha nke na-ekwulu Chineke.’​—Mkpughe 17:3.

  6.   E nwere oge ọ kwụsịtụrụ ịkpa ike. E nwere mgbe anụ ọhịa ahụ nke na-acha uhie uhie ga-anọ ‘n’abis,’ * ya bụ, na e nwere mgbe ọ na-agaghị akpa ike. Ma, ọ ga-emecha pụta ọzọ.​—Mkpughe 17:8.

Otú anụ ọhịa ahụ si emezu amụma e buru na Baịbụl

 Tụlee otú Òtù Mba Ụwa na nke bú ya ụzọ, bụ́ Njikọ Mba Niile, sirila mezuo amụma Baịbụl buru banyere anụ ọhịa ahụ nke na-acha uhie uhie.

  1.   Ọ bụ òtù na-achị achị. Òtù Mba Ụwa na-akwado ọchịchị ụwa n’ihi na ọ na-agba mbọ ka mba ndị nọ́ n’òtù ha hara. *

  2.   Ọ na-anọchi anya ọchịchị ụwa niile. N’afọ 2011, mba ndị sonyeere Òtù Mba Ụwa ruru otu narị na iri itoolu na atọ. N’ihi ya, Òtù Mba Ụwa na-ekwu na ha na-anọchite anya ọtụtụ mba nakwa ọtụtụ ndị n’ụwa niile.

  3.   Ike ya si n’aka ndị ọchịchị ndị ọzọ. Ọ bụ mba dị iche iche ndị sonyeere Òtù Mba Ụwa hiwere ya, ọ bụkwa mba ndị ahụ na-enye ya ikike.

  4.   E nwere ihe jikọrọ ya na okpukpe. Okpukpe ndị e nwere n’ụwa kwadoro Njikọ Mba Niile, na-akwadokwa Òtù Mba Ụwa. *

  5.   Ọ naghị asọpụrụ Chineke. Ihe mere e ji hiwe Òtù Mba Ụwa bụ ka “o mee ka mba niile dịrị n’udo nakwa ka ọ na-echebe mba niile.” * N’agbanyeghị na ihe a ha kwuru mere ha ji hiwe ya nwere ike iyi ezigbo ihe, nke bụ́ eziokwu bụ na Òtù Mba Ụwa anaghị asọpụrụ Chineke n’ihi na ha na-ekwu na ha ga-eme ihe Chineke kwuru na ọ bụ naanị Alaeze ya ga-emeli.​—Abụ Ọma 46:9; Daniel 2:​44.

  6.   E nwere oge ọ kwụsịtụrụ ịkpa ike. E hiwere Njikọ Mba Niile obere oge a lụchara Agha Ụwa Mbụ ka o mee ka udo dịrị. Ma, o melighị ka mba dị iche iche ghara ịlụ agha. Ọ kwụsịrị ịrụ ọrụ mgbe a malitere Agha Ụwa nke Abụọ n’afọ 1939. Mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ n’afọ 1945, e hiwere Òtù Mba Ụwa. Ya na Njikọ Mba Niile yiri, ma n’ihe e bu n’obi hiwe ya ma n’otú o si arụ ọrụ ma n’otú e si hazie ya.

^ Akwụkwọ bụ́ Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words, kwuru na okwu Grik bụ́ “abis” pụtara “olulu na-enweghị nsọtụ ma ọ bụ njedebe.” Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik kpọrọ ya “olulu na-enweghị njedebe.” Na Baịbụl, abis pụtara ebe mmadụ na-agaghị emeli ihe ọ bụla ma ọ bụ ebe a tụrụ mmadụ mkpọrọ.

^ Gụọ Article nke abụọ n’akwụkwọ Charter of the United Nations.

^ Dị ka ihe atụ, otu òtù na-anọchite anya chọọchị Protestant dị iche iche n’Amerịka kwuru n’afọ 1918 na ọ bụ Njikọ Mba Niile ga-abụ “ọchịchị nke na-anọchi anya alaeze Chineke n’ụwa.” N’afọ 1965, ndị na-anọchite anya okpukpe Buda, Katọlik, Ọtọdọks, Hindu, Alakụba, Protestant, na okpukpe ndị Juu, zukọrọ na San Fransisko ka ha kpeere Òtù Mba Ụwa ekpere ma kwado ya. N’afọ 1979 kwa, Poopu John Paul nke Abụọ kwuru na ya nwere olileanya na Òtù Mba Ụwa “ga na-abụ òtù ga-akacha na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ka udo dịrị.”

^ Gụọ Article nke mbụ n’akwụkwọ Charter of the United Nations.