Gaa n'Isiokwu

Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya Hà Na-egosi n’Eziokwu na Ọ Bụ Jizọs Bụ Mesaya?

Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya Hà Na-egosi n’Eziokwu na Ọ Bụ Jizọs Bụ Mesaya?

Ihe Baịbụl kwuru

Ee. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọtụtụ amụma e buru gbasara “Mesaya bụ́ Onye Ndú,” onye e kwuru na ọ ga-abụ “Onye Nzọpụta nke ụwa,” mezuru n’isi ya. (Daniel 9:​25; 1 Jọn 4:​14) Mgbe Jizọs nwụchara, amụma ndị e buru gbasara Mesaya ka nọkwa na-emezu n’isi ya.​​—⁠Abụ Ọma 110:1; Ọrụ Ndịozi 2:​34-​36.

 Gịnị ka “Mesaya” pụtara?

Okwu Hibru bụ́ Ma·shiʹach (Mesaya) na okwu Grik bụ́ Khri·stos (Kraịst) pụtara otu ihe, ya bụ, “Onye E Tere Mmanụ.” N’ihi ya, “Jizọs Kraịst” pụtara “Jizọs Onye E Tere Mmanụ,” ma ọ bụ “Jizọs bụ́ Mesaya.”

N’oge Baịbụl, ọ bụrụ na a họpụta mmadụ ka ọ rụọ ọrụ pụrụ iche, a na-ete ya mmanụ. Otú a na-esikarị ete mmadụ mmanụ bụ ịwụsa ya mmanụ n’isi. (Levitikọs 8:​12; 1 Samuel 16:13) Ọ bụ Chineke họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ Mesaya. Ihe a bụ nnukwu ọkwá. (Ọrụ Ndịozi 2:​36) Ma, otú e si tee Jizọs mmanụ abụghị ịwụsa ya mmanụ nkịtị n’isi, kama Chineke ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ.​​—⁠Matiu 3:​16.

 Amụma ndị e buru gbasara Mesaya hà nwere ike imezu n’isi ọtụtụ ndị?

Mba. Otú ahụ akara dị ná mkpịsị aka mmadụ na-enweghị mgbe ya na nke onye ọzọ na-abụ otu, ka amụma ndị e buru gbasara Mesaya ma ọ bụ Kraịst na-enweghị mgbe ọ ga-emezu n’isi ihe karịrị otu onye. Ma, Baịbụl gwara anyị ka anyị kpachara anya maka na “Kraịst ụgha na ndị amụma ụgha ga-ebili, ha ga-emekwa ihe ịrịba ama na ihe ijuanya dị ukwuu ka ha wee duhie ọbụna ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.”​​—⁠Matiu 24:⁠24.

 Mesaya ọ̀ ka ga-abịa n’ọdịnihu?

Mba. Baịbụl buru amụma na Mesaya ga-esi n’ezinụlọ Eze Devid chịrị Izrel. (Abụ Ọma 89:​3, 4) Ma, akwụkwọ ndị e dere aha ndị niile si n’ezinụlọ Devid adịkwaghị. Ọ ga-abụ na e bibiri ha mgbe ndị Rom bibiri Jeruselem n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst. * Kemgbe ahụ, e nweghị ihe mmadụ ga-agbakwasịli ụkwụ kwuo na ya si n’ezinụlọ eze Devid. Ma n’oge Jizọs nọ n’ụwa, akwụkwọ ndị e dere aha ndị niile si n’ezinụlọ Devid ka dị, e nweghịkwa onye iro ya ọ bụla nwere ike igosi na Jizọs ghara ụgha mgbe o kwuru ihe gosiri na o si n’ezinụlọ Devid.​​—⁠Matiu 22:​41-​46.

 Amụma ndị e buru na Baịbụl gbasara Mesaya hà dị ole?

E nweghị ike ikwu kpọmkwem amụma ole e buru na Baịbụl gbasara Mesaya. Dị ka ihe atụ, otú ụfọdụ ndị si agụ amụma ole dị n’amaokwu Baịbụl ndị na-ekwu gbasara Mesaya nwere ike ịdị iche n’otú ndị ọzọ si agụ ha. N’amụma e buru n’Aịzaya 53:​2-7, e kwuru ihe dị iche iche gbasara Mesaya. Ụfọdụ ndị nwere ike iwere ha niile ka otu amụma, ebe ndị ọzọ nwere ike iwere ihe nke ọ bụla e kwuru n’ebe ahụ gbasara Mesaya ka amụma kwụụrụ onwe ya.

 Ụfọdụ amụma ndị e buru gbasara Mesaya bụ́ ndị mezuru n’isi Jizọs

Amụma

Ọ Dị na

O Mezuru na

Ọ ga-abụ nwa Ebreham

Jenesis 22:​17, 18

Matiu 1:1

Ọ ga-esi n’ezinụlọ Aịzik, nwa Ebreham

Jenesis 17:⁠19

Matiu 1:2

A ga-amụ ya n’ebo Juda, n’Izrel

Jenesis 49:⁠10

Matiu 1:​1, 3

Ọ ga-esi n’ezinụlọ Eze Devid

Aịzaya 9:7

Matiu 1:1

Ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-amụ ya

Aịzaya 7:​14

Matiu 1:​18, 22, 23

A ga-amụ ya na Betlehem

Maịka 5:2

Matiu 2:​1, 5, 6

A ga-akpọ ya Ịmanuel *

Aịzaya 7:​14

Matiu 1:​21-​23

A ga-amụ ya n’ezinụlọ ndị ogbenye

Aịzaya 53:2

Luk 2:7

A ga-egbu ụmụaka mgbe a mụchara ya

Jeremaya 31:⁠15

Matiu 2:​16-​18

A ga-esi n’Ijipt kpọpụta ya

Hosia 11:1

Matiu 2:​13-​15

A ga-akpọ ya onye Nazaret *

Aịzaya 11:1

Matiu 2:​23

Onye ozi ga-ebutere ya ụzọ

Malakaị 3:1

Matiu 11:​7-​10

A ga-ete ya mmanụ n’afọ 29 Oge Ndị Kraịst * ka ọ bụrụ Mesaya

Daniel 9:​25

Matiu 3:​13-​17

Chineke ga-ekwu na ọ bụ Ọkpara ya

Abụ Ọma 2:7

Ọrụ Ndịozi 13:​33, 34

Ọ ga-anụrụ ụlọ Chineke ọkụ n’obi

Abụ Ọma 69:9

Jọn 2:​13-​17

Ọ ga-ezi ozi ọma

Aịzaya 61:1

Luk 4:​16-​21

Ozi ọma ọ ga-ezi na Galili ga-eme ka e nwee oké ìhè

Aịzaya 9:​1, 2

Matiu 4:​13-​16

Ọ ga-arụ ọrụ ebube ka Mozis

Diuterọnọmi 18:⁠15

Ọrụ Ndịozi 2:​22

Ọ ga-agwa ndị mmadụ uche Chineke otú Mozis mere

Diuterọnọmi 18:​18, 19

Jọn 12:⁠49

Ọ ga-agwọ ọtụtụ ndị ọrịa

Aịzaya 53:4

Matiu 8:​16, 17

Ọ gaghị eme ka ndị mmadụ towe ya

Aịzaya 42:2

Matiu 12:​17, 19

Ọ ga-emetere ndị na-ata ahụhụ ebere

Aịzaya 42:3

Matiu 12:​9-​20; Mak 6:​34

Ọ ga-eme ka a mata na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi

Aịzaya 42:​1, 4

Matiu 12:​17-​20

Ọ ga-abụ Onye Ndụmọdụ Dị Ebube

Aịzaya 9:​6, 7

Jọn 6:​68

Ọ ga-eme ka a mata aha Jehova

Abụ Ọma 22:⁠22

Jọn 17:6

Ọ ga-eji ihe atụ kụzie ihe

Abụ Ọma 78:2

Matiu 13:​34, 35

Ọ ga-abụ Onye Ndú

Daniel 9:​25

Matiu 23:⁠10

Ọtụtụ ndị agaghị enwe okwukwe na ya

Aịzaya 53:1

Jọn 12:​37, 38

Ọ ga-abụ nkume na-akpọbi mmadụ ụkwụ

Aịzaya 8:​14, 15

Matiu 21:​42-​44

Ndị mmadụ ga-ajụ ya

Abụ Ọma 118:​22, 23

Ọrụ Ndịozi 4:​10, 11

A ga-akpọ ya asị na nkịtị

Abụ Ọma 69:4

Jọn 15:​24, 25

Ọ ga-anọ n’elu ịnyịnya ibu banye Jeruselem, ndị mmadụ ana-aṅụrị ọṅụ

Zekaraya 9:9

Matiu 21:​4-9

Ụmụaka ga-eto ya

Abụ Ọma 8:2

Matiu 21:​15, 16

Ọ ga-abịa n’aha Jehova

Abụ Ọma 118:⁠26

Jọn 12:​12, 13

Ezigbo enyi ya ga-arara ya nye

Abụ Ọma 41:9

Jọn 13:⁠18

A ga-akwụ onye ga-arara ya nye mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ *

Zekaraya 11:​12, 13

Matiu 26:​14-​16; 27:​3-​10

Ndị enyi ya ga-ahapụ ya gbaa ọsọ

Zekaraya 13:7

Matiu 26:​31, 56

A ga-agbagide ya akaebe ụgha

Abụ Ọma 35:⁠11

Matiu 26:​59-​61

Ọ ga-agba ndị na-ebo ya ebubo nkịtị

Aịzaya 53:7

Matiu 27:​12-​14

A ga-agbụ ya ọnụ mmiri

Aịzaya 50:6

Matiu 26:67; 27:​27, 30

A ga-akụ ya ihe n’isi

Maịka 5:1

Mak 15:⁠19

A ga-apịa ya ihe

Aịzaya 50:6

Jọn 19:1

Ọ hapụrụ ka ndị chọrọ iti ya ihe tie ya ihe

Aịzaya 50:6

Jọn 18:​22, 23

Ndị ọchịchị ga-ejikọta aka megide ya

Abụ Ọma 2:2

Luk 23:​10-​12

A ga-eji ntu si n’aka ya na n’ụkwụ ya kpọgide ya n’osisi

Abụ Ọma 22:⁠16

Matiu 27:35; Jọn 20:⁠25

A ga-efere uwe ya nza

Abụ Ọma 22:⁠18

Jọn 19:​23, 24

A ga-agụnye ya ná ndị mmehie

Aịzaya 53:⁠12

Matiu 27:⁠38

A ga-akwa ya emo, kparịakwa ya

Abụ Ọma 22:​7, 8

Matiu 27:​39-​43

Ọ ga-ata ahụhụ n’ihi ndị mmehie

Aịzaya 53:​5, 6

1 Pita 2:​23-​25

Ọ ga-adị ya ka Chineke ọ̀ hapụla ya

Abụ Ọma 22:1

Mak 15:⁠34

A ga-enye ya mmanya gbara ụka na ihe na-elu ilu ka ọ ṅụọ

Abụ Ọma 69:⁠21

Matiu 27:⁠34

Akpịrị ga-akpọ ya nkụ mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ

Abụ Ọma 22:⁠15

Jọn 19:​28, 29

Ọ ga-enyefe Chineke mmụọ ya

Abụ Ọma 31:5

Luk 23:⁠46

Ọ ga-ekweta ịnwụ

Aịzaya 53:⁠12

Mak 15:⁠37

Ọ ga-eji ndụ ya gbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie

Aịzaya 53:⁠12

Matiu 20:⁠28

A gaghị agbaji ọkpụkpụ ya ọ bụla

Abụ Ọma 34:⁠20

Jọn 19:​31-​33, 36

A ga-ama ya ube

Zekaraya 12:⁠10

Jọn 19:​33-​35, 37

A ga-eli ya n’ebe a na-eli ndị ọgaranya

Aịzaya 53:9

Matiu 27:​57-​60

A ga-akpọlite ya n’ọnwụ

Abụ Ọma 16:⁠10

Ọrụ Ndịozi 2:​29-​31

A ga-eji onye ọzọ dochie onye raara ya nye

Abụ Ọma 109:8

Ọrụ Ndịozi 1:​15-​20

Ọ ga-anọdụ ala n’aka nri Chineke

Abụ Ọma 110:1

Ọrụ Ndịozi 2:​34-​36

^ par. 5 Akwụkwọ e ji eme nchọnchọ McClintock na Strong dere kwuru, sị: “O doro anya na akwụkwọ ndị e dere aha ebo ndị Juu na ezinụlọ dị iche iche ha si lara n’iyi n’oge e bibiri Jeruselem, ọ bụghị tupu oge ahụ.”

^ par. 40 Ịmanuel bụ aha Hibru. Ọ pụtara “Chineke Nọnyeere Anyị.” Aha a na-egosi ọrụ Jizọs ga-arụ maka na ọ bụ Mesaya. Ọbịbịa ọ bịara n’ụwa na ọrụ ndị ọ rụrụ gosiri na Chineke nọnyeere ndị na-efe ya.​​—⁠Luk 2:​27-​32; 7:​12-​16.

^ par. 52 O nwere ike ịbụ na okwu a sụgharịrị “onye Nazaret” si n’okwu Hibru bụ́ neʹtser. Neʹtser pụtara “mgbọrọgwụ.”

^ par. 58 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú Baịbụl si gosi na ọ bụ n’afọ 29 Oge Ndị Kraịst ka Jizọs ghọrọ Mesaya, gụọ isiokwu bụ́ “Otú Amụma Daniel Si Gosi Mgbe Mezaịa Ga-abịa.”

^ par. 127 Amụma a dị n’akwụkwọ Zekaraya, ma otu onye so dee Baịbụl aha ya bụ Matiu sịrị na ‘e kwuru ya site n’ọnụ Jeremaya onye amụma.’ (Matiu 27:⁠9) Ọ ga-abụ na mgbe ụfọdụ, a na-ebute akwụkwọ Jeremaya ụzọ n’akwụkwọ Baịbụl ndị a na-akpọ ‘Akwụkwọ Ndị Amụma.’ (Luk 24:44) Mgbe Matiu kwuru ‘Jeremaya,’ ọ ga-abụ na ihe o bu n’obi bụ akwụkwọ ndị amụma ahụ niile, nke akwụkwọ Zekaraya so na ha.