Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Iwe?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Iwe?

Ihe Baịbụl Zara

Baịbụl na-akụzi na iwe ọkụ na-emebi ihe. Ọ na-akpa ma onye na-ewe iwe ọkụ ma ndị nọ ya nso aka ọjọọ. (Ilu 29:22) Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe nwere ike ime ka mmadụ wee iwe mgbe ụfọdụ, Baịbụl kwuru na ndị na-ewe “iwe ọkụ” agaghị eketa Alaeze Chineke. (Ndị Galeshia 5:​19-21) E nwere ihe ndị e kwuru na Baịbụl nwere ike inyere mmadụ aka ịkwụsị ịna-ewe iwe ọkụ.

 Ọ̀ọ mgbe niile ka iwe iwe dị njọ?

Mba. E nwere ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ wee iwe. Dị ka ihe atụ, ezigbo “iwe were” ohu Chineke bụ́ Nehemaya mgbe ọ nụrụ na a na-echi ụfọdụ ndị ya na ha so na-efe Jehova ọnụ n’ala.​—Nehemaya 5:6.

Mgbe ụfọdụ, Chineke na-ewe iwe. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ohu Chineke n’oge ochie kwụsịrị ife ya ma malite ife chi ụgha, ‘Jehova wesoro ha iwe dị ọkụ.’ (Ndị Ikpe 2:​13, 14) N’agbanyeghị na e nwere mgbe Jehova were iwe, e jighị iwe mara ya. Ọ na-ewe iwe naanị mgbe e nwere ezigbo ihe kpatara ya, ọ naghịkwa ewefe ya ókè.​—Ọpụpụ 34:6; Aịzaya 48:9.

 Olee mgbe iwe iwe dị njọ?

Iwe dị njọ ma ọ bụrụ iwe ọkụ, ma ọ bụkwanụ nke na-enweghị isi. Ọ bụ ụdị iwe a ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ewekarị. Dị ka ihe atụ:

  • Ken ‘were iwe dị ọkụ’ mgbe Chineke na-anabataghị àjà ọ chụrụ. Ken wegidere iwe ruo na nke igbu nwanne ya.​—Jenesis 4:​3-8.

  • Jona onye amụma ‘were iwe dị ọkụ’ mgbe Chineke meere ndị Ninive ebere. Chineke gbaziri Jona, gwa ya na ‘iwe ọkụ ọ na-ewe ezighị ezi,’ na o kwesịrị imere ndị mmehie ahụ chegharịrị echegharị ebere.​—Jona 3:10–4:​1, 4, 11. *

Ihe atụ ndị a gosiri na ‘iwe mmadụ na-ezughị okè na-ewe anaghị arụpụta ezi omume Chineke.’​—Jems 1:20.

 Olee ihe i nwere ike ime ka ị ghara ịna-ewekarị iwe?

  • Ghọta nsogbu iwe ọkụ nwere ike ịkpata. Ụfọdụ ndị chere na ọ bụrụ na ha ewee iwe ọkụ, na ọ na-egosi na ha dị ike. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-ewekarị iwe ọkụ nwere ezigbo nsogbu. “Dị ka obodo e tidara etida nke na-enweghị mgbidi, otú ahụ ka onye na-adịghị ejide mmụọ ya dị.” (Ilu 25:28) Ma, ọ bụrụ na anyị na-ejideli onwe anyị ma a kpasuo anyị iwe, o gosịrị na anyị bụ dimkpa, marakwa ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike.”​—Ilu 16:32.

  • Chịkwaa iwe gị tupu ya emee ka i mee ihe ị ga-akwara mmakwaara. Abụ Ọma 37:8 kwuru sị: “Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma; ewela iwe naanị iji mee ihe ọjọọ.” Ị chọpụtara na e nwere ihe anyị nwere ike ime ma a kpasuo anyị iwe? Ndị Efesọs kwuru, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela.”

  • A kpasuo gị iwe, o kwe omume, si ebe ahụ pụọ tupu iwe gị aka njọ. Baịbụl kwuru, sị: “Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ; ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.” (Ilu 17:14) Ọ bụ eziokwu na ọ dị mma idozi esemeokwu ngwa ngwa, gị na onye gị na ya na-ese okwu kwesịrị ibugodị ụzọ kwọsa obi unu mmiri tupu unu enwee ike imeda obi kwurịta nsogbu ahụ.

  •  Mata otú ihe si mee. Ilu 19:11 kwuru, sị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” Ọ ga-akacha mma ịma kpọmkwem otú ihe si mee tupu anyị ewewe iwe. Ọ bụrụ na anyị egee ntị nke ọma mata otú niile ihe si mee, o nwere ike ime ka anyị ghara iwewe iwe na-enweghị isi​—Jems 1:​19.

  •  Kpee ekpere maka udo nke obi. Ekpere nwere ike inyere gị aka inweta “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Ndị Filipaị 4:7) Ekpere bụ otu n’ime ụzọ a kacha esi enweta mmụọ nsọ, bụ́kwanụ ihe nwere ike ime ka anyị nwee àgwà ndị dị ka udo, ndidi, na njide onwe onye.​—Luk 11:13; Ndị Galeshia 5:​22, 23.

  • Saa anya na mmiri họrọ ndị gị na ha ga na-akpa. Anyị na-akpakarị àgwà otú ndị enyi anyị si akpa. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji dọọ anyị aka na ntị. Ọ sịrị: “Abụla enyi onye ọ bụla nke na-ewekarị iwe; gị na onye na-ewe iwe ọkụ akpakọrịtala.” Maka gịnị? “Ka ị ghara ịmụta ụzọ ya wee wetara mkpụrụ obi gị ọnyà.”​—Ilu 22:​24, 25.

^ par. 6 O doro anya na Jona nabatara mgbazi ahụ ma kwụsị iwe iwe. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na Chineke ji ya dee akwụkwọ Baịbụl ahụ a kpọrọ aha ya.