Gaa n'Isiokwu

À Gbanwere Ihe E Dere na Baịbụl ma Ọ Bụ Kpaa Ya Aka?

À Gbanwere Ihe E Dere na Baịbụl ma Ọ Bụ Kpaa Ya Aka?

Mba. E leruola Akwụkwọ Nsọ dị iche iche e ji aka dee n’oge ochie anya ma chọpụta na a gbanweghị ihe ndị bụ́ isi dị na Baịbụl n’agbanyeghị na e ji ihe ndị na-emebi emebi depụtaghachi ya ugboro ugboro ruo ọtụtụ narị afọ.

Ọ̀ pụtara na e nweghị ihe ọ bụla e dehiere n’oge a na-edepụtaghachi ya?

A hụla ọtụtụ narị Akwụkwọ Nsọ ndị e ji aka dee n’oge ochie, ihe e dere ebe ole na ole n’ụfọdụ n’ime ha dịkwa iche n’ihe e dere n’ibe ha. Ihe a gosiri na e dehiere ihe ụfọdụ mgbe a na-edepụtaghachi Baịbụl. Ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ e dehiere bụ ụmụ obere ihe, nke mere na ha emeghị ka isi ihe a na-ekwu gbanwee. Ma, a chọpụtala ebe ole na ole e dehiere ihe ndị gbara ezigbo ọkpụrụkpụ, ọ ga-abụkwa na e nwere ndị ma ụma dehie ụfọdụ n’ime ha ọtụtụ afọ gara aga iji gbanwee ihe Baịbụl na-ekwu. Ka anyị leba anya na abụọ n’ime ihe ndị mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  1. Ihe e dere na 1 Jọn 5:7 na Baịbụl ochie ụfọdụ bụ: “e nwere Nna ahụ, Okwu ahụ, na Mmụọ Nsọ n’eluigwe, ha atọ bụkwa otu.” Ma, ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ ndị a tụkwasịrị obi gosiri na okwu ndị a adịghị na Baịbụl ndị mbụ dere Baịbụl dere. E denyere ha mgbe ọtụtụ afọ gachara. * N’ihi ya, Baịbụl ndị e leziri anya sụgharịa n’oge a wepụrụ ha.

  2. E dere aha Chineke ọtụtụ puku ugboro n’Akwụkwọ Nsọ ndị e ji aka dee n’oge ochie. Ma, ọtụtụ Baịbụl wepụchara ya, jiri utu aha dị iche iche dochie ya, dị ka “Onyenwe anyị” ma ọ bụ “Chineke.”

Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na o nweghị ọtụtụ ihe ndị ọzọ e dehiere na Baịbụl?

Ka ọ dị ugbu a, e nweela ọtụtụ Akwụkwọ Nsọ ndị e ji aka dee a hụrụla. N’ihi ya, ịchọpụta ihe e dehiere esighịzi ike otú o siburu. * Mgbe e lebachara akwụkwọ ndị ahụ anya ma jiri ihe e dere na ha tụnyere ibe ha, à chọpụtala na ihe dị na Baịbụl anyị taa bụ ihe dị na Baịbụl mbụ e dere?

  • Otu ọkachamara aha ya bụ William H. Green kwuru gbasara ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru (ọtụtụ ndị na-akpọkwa ya “Agba Ochie”), sị: “E nwere ike ikwu na e nweghị akwụkwọ mgbe ochie ọzọ e depụtaghachiri ihe dị na ya nke ọma otú a n’ewepụghị ya ihe ọ bụla.”

  • E nwere ihe otu ọkachamara n’ihe gbasara Baịbụl dere banyere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ.” Aha ọkachamara ahụ bụ F. F. Bruce. Ọ sịrị: “Ihe ndị na-egosi na ihe e dere n’Agba Ọhụrụ bụ eziokwu juru eju. Ha karịrị ihe ndị na-egosi na ihe dị n’akwụkwọ ọgụgụ ndị e dere n’oge ochie bụ eziokwu, n’agbanyeghị na e nweghị ndị na-agbagha ihe ndị e dere n’akwụkwọ ọgụgụ ndị ahụ.”

  • Otu nwoke aha ya bụ Frederic Kenyon, onye ihe gbasara Akwụkwọ Nsọ ndị e ji aka dee n’oge ochie doro anya, kwuru na onye “ji Baịbụl zuru ezu nwere ike ikwu n’atụghị egwu ma ọ bụ n’ezoghị ọnụ na ihe ya ji bụ Okwu Chineke n’eziokwu. Ihe ndị bụ́ isi e dere na ya ka dị otú ha dị ná mmalite n’agbanyeghị na ọtụtụ ọgbọ agaala kemgbe ọtụtụ afọ Chineke nyere anyị ya.”

Olee ihe ndị ọzọ ga-eme ka obi sie anyị ike na ihe dị na Baịbụl ugbu a bụ ihe dị na Baịbụl mbụ e dere?

  • Ma ndị Juu ma Ndị Kraịst, ndị so depụtaghachi Baịbụl, ahapụghị ide ihe jọrọ ezigbo njọ ndị ohu Chineke mere. * (Ọnụ Ọgụgụ 20:12; 2 Samuel 11:2-4; Ndị Galeshia 2:11-14) Ha dere ihe dị iche iche gosiri na isi ndị Izrel nupụụrụ Chineke adịghị mma, gbaakwa ihe na-abụghị eziokwu ha na-akụzi n’anwụ. (Hosia 4:2; Malakaị 2:8, 9; Matiu 23:8, 9; 1 Jọn 5:21) Otú a ha si depụtaghachi ihe niile nke ọma gosiri na ha bụ ndị a ga-atụkwasịli obi nakwa na ha ji Okwu Chineke dị nsọ kpọrọ ezigbo ihe.

  • Ebe ọ bụ Chineke nyere ndị dere Baịbụl ike mmụọ nsọ ha ji dee ya, ọ̀ bụ na ọ gaghị ejide n’aka na ọkọ agaghị akọ ihe e dere na ya? * (Aịzaya 40:8; 1 Pita 1:24, 25) A sị kwuwe, ọ chọrọ ka ọ baara ma ndị oge ochie ma ndị oge a uru. (1 Ndị Kọrịnt 10:11) N’eziokwu, “e dere ihe niile e dere n’oge gara aga ka e jiri ha kụziere anyị ihe, ka obi anyị na-atachi na nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.”—Ndị Rom 15:4.

  • Ọ na-abụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwuwe okwu mgbe ụfọdụ, ha ekwuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. O meghị ha obi abụọ ma à gbanweela ihe Chineke chọrọ ka e dee na ya.—Luk 4:16-21; Ọrụ Ndịozi 17:1-3.

^ par. 3 Okwu ndị ahụ adịghị n’akwụkwọ Codex Sinaiticus, Codex Alexandrinus, Akwụkwọ Mpịakọta Vatican nke 1209, Vulgate Latịn nke mbụ, Philoxenian-Harclean Syriac Version, ma ọ bụ Peshitta nke Siriak.

^ par. 5 Dị ka ihe atụ, a hụla Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (ọtụtụ ndị na-akpọ ya Agba Ọhụrụ) e ji aka dee karịrị puku ise (5,000).

^ par. 9 E nweghị ihe Baịbụl kwuru nke gosiri na ndị mmadụ, ndị na-anọchite anya Chineke anaghị emehie ihe. Kama, o kwuru ihe bụ́ eziokwu gbasara mmadụ ọ bụla. Ọ sịrị: “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-anaghị eme mmehie.”—1 Ndị Eze 8:46.

^ par. 10 Ọ bụ eziokwu na ihe Baịbụl kwuru gosiri na Chineke agwaghị ndị dere Baịbụl okwu niile ha ga-ede, ha ana-ede, ma o duziri ha, ha edee uche ya.—2 Timoti 3:16, 17; 2 Pita 1:21.