Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

M̀ Kwesịrị Imetakwu Ndị Enyi?

M̀ Kwesịrị Imetakwu Ndị Enyi?

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Alan sịrị: “Ndị ihe na-adabara mụ na ha bụ ndị ọgbọ m. Ọ na-esiri m ezigbo ike imeta ndị ọzọ enyi.”

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sara sịrị: “Ndị enyi m dị ole na ole, ọ dịkwa m mma otú ahụ. Abụghị m ụdị onye na-aga emeta ndị ọ na-amaghị enyi.

Ọ̀ dị gị otú ahụ ọ dị Alan na Sara? È nwere ndị ọ bụ naanị ha ka gị na ha bụ enyi, nke na ị naghị emetali ndị ọzọ enyi?

Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, isiokwu a bụ maka gị.

  • Ihe ndị na-esi ná mmadụ na naanị otu ndị ịkpa apụta

  • Ihe i nwere ike ime

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Ihe ndị na-esi ná mmadụ na naanị otu ndị ịkpa apụta

E nweghị ihe dị njọ ná mmadụ inwe ndị ya na ha bụ ezigbo enyi. Ọ na-eme ka ahụ́ ruo onye ahụ ala na ya na ndị ihe na-adabara ya na ha nọ.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Karen sịrị: “Obi na-adị mmadụ ụtọ ma o nwee ndị ihe ya na-amasị na otu ndị ihe na-adabara ya na ha. Ọ na-amasị ndị na-eto eto ka ha na ndị ha ma na-akpa.

Ị̀ Maara? Jizọs na ndịozi ya iri na abụọ bụcha enyi, mana ya na mmadụ atọ n’ime ha, ya bụ, Pita, Jems na Jọn kacha akpachi anya.​—⁠Mak 9:2; Luk 8:⁠51

Mana mmadụ ihọrọ naanị otu ndị ka ya na ha na-akpa, ma na-eze ndị ọzọ eze, nwere ike ịkpata nsogbu. Dị ka ihe atụ:

  • O nwere ike ime ka ị ghara inwetakwu ezigbo ndị enyi ga-enyere gị aka.

    Otu nwa okorobịa aha ya bụ Evan sịrị: “Ịna-emeta naanị ndị ọgbọ gị ma ọ bụ naanị ndị dị ka gị enyi ga-eme ka ị ghara ịmụta ihe n’aka ndị ọzọ.”

  • O nwere ike ime ka o yie ka onwe gị ò juru gị afọ.

    Otu onye na-eto eto aha ya bụ Sara sịrị: “Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu ndị ka gị na ha na-akpa, o nwere ike ime ka ndị ọzọ chewe na ị naghị achọ ịtụpụrụ onye ọ bụla ọzọ ọnụ.”

  • O nwere ike ime ka ị na-achọ ndị ọzọ okwu

    Otu nwa okorọbịa aha ya bụ James sịrị: “Mmadụ nwere ike ọ gaghị na-achọ okwu, ma ọ bụrụ na ndị ya na ha na-akpa na-achọ okwu, o nwere ike ị masiwa gị. O nwedịrị ike ịdị ya ka ihe egwuregwu.”

  • O nwere ike itinye gị ná nsogbu, karịchaa ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na ha kpawa, ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ.

    Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Martina sịrị: “Naanị otu onye na-akpa àgwà ọjọọ ezuola ime ka ndị òtù ya niile bido kpawa àgwà ọjọọ.”

Ihe i nwere ike ime

  • Chebara ụdị onye i kwesịrị ịbụ echiche.

    Jụọ onwe gi, sị: ‘Olee ụdị onye m kwesịrị ịbụ? Ndị mụ na ha na-akpa hà na-eme ka ọ dịrị m mfe ka ọ bụ ka o siere m ike ịbụ ụdị onye m kwesịrị ịbụ? M̀ ka ga-achọ ka mụ na ha na-akpa ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ?’

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”​—⁠1 Ndị Kọrịnt 15:⁠33.

    Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ellen sịrị: “Ọ bụrụ na ndị gị na ha na-akpa abụghị ụdị ndị na-akpa ụdị àgwà i kwesịrị ịna-akpa, ha nwere ike ime ka i mewe ihe ndị ị na-agaraghị eme.”

  • Chebara ihe ndị dị gị ezigbo mkpa echiche.

    Jụọ onwe gị sị: ‘M̀ nwere ike ime ihe m kpebiri na m gaghị eme iji mee ka mụ na ndị enyi m ka na-akpa? Gịnị ka m ga-eme ma ọ bụrụ na enyi m emee ihe na-adịghị mma?’

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ndị niile m hụrụ n’anya nke ukwuu ka m na-abara mba.”​—⁠Mkpughe 3:⁠19.

    Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Melanie sịrị: “Ọ bụrụ na otu n’ime ndị enyi gị emee ihe ọjọọ, ọ ga-adị gị ka ime ka mmadụ mata gbasara ihe ahụ o mere ga-egosi na ị bụghị ezigbo enyi.”

  • Metakwuo ndị ọzọ enyi.

    Jụọ onwe gị, sị: ‘Ò nwere uru m ga-erite ma m metakwuo ndị ọzọ m na-amaghị nke ọma enyi?’

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”​—⁠Ndị Filipaị 2:⁠4.

    Otu nwa okorobịa aha ya bụ Brian sịrị: “O nwere ike ịbụ na ihe na-esiri ụmụaka ndị a na-eche na o nweghị onye ma ha ike n’ụlọ. Mana i metahaala ha enyi, ị ga-amata na ha bụ ndị ezigbo mmadụ.”

Isi ihe dị mkpa: O nweghị ihe dị njọ ná mmadụ inwe ndị ya na ha na-akpachi anya. Mana, ọ ga-abakwara gị uru ma ọ bụrụ na i metakwuo ndị ọzọ enyi. Baịbụl sịrị: “Onye na-emekwa ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ”​—⁠Ilu 11:⁠25.