Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

ṄOMIE OKWUKWE HA | JỌNATAN

“Ọ Dịghị Ihe Na-egbochi Jehova”

“Ọ Dịghị Ihe Na-egbochi Jehova”

Weregodị ya na ị na-ahụ ebe ndị agha Filistia na-eche nche ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu. Ebe ahụ nọpụrụ iche, bụrụkwa okwute okwute, kpọọkwa nkụ. Ka ha si n’ebe ha nọ lelie anya, ha hụrụ ihe juru ha anya. Ha hụrụ ụmụ nwoke abụọ, bụ́ ndị Izrel ka ha guzo n’otu ndagwurugwu na-ele ha. Ihe a ha hụrụ tọrọ ha ọchị. Ihe a erughị ihe ga-eme ka obi koro ha n’elu. Ọ bụghị taa ka ndị Filistia bidoro imeri ndị Izrel. Ụmụ Izrel chọọ ịmụ mma ha ji aga ugbo, ọ bụ ndị Filistia a, bụ́ ndị iro ha, ga-amụrụ ha ya. A bịakwanụ ná ngwá agha, ndị agha ndị Izrel amaghị ebe anọ. Ihe ọzọkwa bụ na ndị agha a na-abịanụ dị naanị mmadụ abụọ. Ha jirigodị ezigbo ngwá ọgụ, bụrụkwa aka ochie n’ịlụ agha, hà ga-chịtali ájá? N’ihi ya, ndị agha ndị Filistia ahụ kwara ha emo, sị: “Gbagokwutenụ anyị, ka anyị gosi unu ihe!”​—1 Samuel 13:​19-23; 14:​11, 12.

Nke bụ́ eziokwu bụ na otu ndị ga-egosirịrị ibe ha ihe. Ma, ọ bụ ndị Filistia ka a ga-egosi ihe. Ndị Izrel abụọ ahụ ji ọsọ gbada ndagwurugwu ahụ, gafere ya ma gbagowe ugwu dị ha n’ihu. Ugwu ahụ dị elu nke na ha ji ma aka ha ma ụkwụ ha na-arị ya. Ma, ha nọgidere na-arị ya na-agakwuru ndị agha ahụ na-eche nche. (1 Samuel 14:13) Ihe ndị Filistia a hụziri bụ na otu n’ime ndị a bu ngwá agha, onye na-eso ya abụrụ onye na-eburu ya ihe agha. Ma, ọ̀ bụ naanị otu onye ka ọ kpọ bịa ibuso ìgwè ndị agha agha? Isi ọ̀ dịkwa ya mma?

Isi dị ya mma, kama okwukwe ya siri ike ka ígwè. Aha ya bụ Jọnatan, akụkọ ya na-akụzikwara ezigbo Ndị Kraịst taa ọtụtụ ihe. Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị alụ agha nkịtị taa, ma anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe ga-ewusi okwukwe anyị ike n’aka Jọnatan, ihe ndị dị ka inwe obi ike, ikwesị ntụkwasị obi, na ibute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ.​—Aịzaya 2:4; Matiu 26:​51, 52.

Ezigbo Nwa na Onye Agha Nwere Obi Ike

Ka anyị nwee ike ịghọta ihe mere Jọnatan ji gawa ibuso ndị agha ahụ na-eche nche agha, anyị kwesịrị ịmatakwu ụdị onye ọ bụ. Jọnatan bụ ọkpara Sọl, eze mbụ nke Izrel. Ọ ga-abụ na Jọnatan dị ihe dị ka afọ iri abụọ ma ọ bụ karịa mgbe e tere nna ya mmanụ ịbụ eze. O yiri ka Jọnatan na nna ya dị n’ezigbo mma n’ihi na nna ya na-akọrọ ya ọtụtụ mgbe ihe ọ na-eme. N’oge ahụ, ihe Jọnatan ji mara nna ya abụghị naanị na o toro ogologo, maa mma nwoke ma bụrụ dike n’agha, kama, ọ makwa na nna ya bụ nwoke nwere okwukwe ma dịrị umeala n’obi, nke bụ́kwanụ ihe kacha mkpa e ji ama dimkpa. Jọnatan ghọtara ihe mere Jehova ji họrọ nna ya ịbụ eze. Samuel onye amụma kwudịrị na e nweghị onye dị ka Sọl n’ala Izrel.​—1 Samuel 9:​1, 2, 21; 10:​20-24; 20:2.

Ọ ga-abụrịrị na Jọnatan weere agha o so nna ya na-ebuso ndị iro ndị na-efe Jehova ka ihe ùgwù. Agha ndị ahụ ọ lụrụ dị iche n’agha ndị mmadụ na-alụ taa n’ihi na ha hụrụ mba ha n’anya. N’oge ahụ, Jehova họọrọ ndị Izrel ka ha na-anọchi anya ya. Mba ndị na-efe chi ụgha ekweghịkwa ha kuru mmiri tọgbọ iko. Ndị Filistia, bụ́ ndị ji ife chi ụgha ndị dị ka Degọn merụọ onwe ha, gbalịrị ọtụtụ mgbe ka ha megbuo ma ọ budị gbuchapụ mba a Jehova họọrọ.

Jọnatan na ndị ọzọ hụrụ Jehova n’anya weere ya na agha ahụ ha na-alụ bụ ozi ha na-ejere Jehova Chineke iji gosi na ha na-erubere ya isi. Jehova gọziri mbọ Jọnatan gbara. N’oge na-adịghị anya Sọl ghọchara eze, ọ họọrọ Jọnatan nwa ya ka ọ bụrụ onyeisi nke otu puku ndị agha. Jọnatan dukwaara ha gaa buso ndị agha Filistia na-eche nche na Giba agha. N’agbanyeghị na ndị agha ya ejighị ezigbo ngwá agha, Jehova nyeere Jọnatan aka ya emerie n’agha ahụ. Ihe a mere ka ndị Filistia kpọkọta ìgwè ndị agha buru ibu ka ha busoo ndị Izrel agha. Ụjọ jidere ọtụtụ ndị agha Sọl. Ụfọdụ gbara ọsọ gaa zoo, ụfọdụ aghọọkwa ndị sabo, gaa sonyere ndị agha ndị Filistia. Ma, e nweghị mgbe ụjọ tụrụ Jọnatan.​—1 Samuel 13:​2-7; 14:21.

N’ụbọchị ahụ anyị kwuru banyere ya ná mmalite, Jọnatan kpebiri ịkpọrọ naanị onye na-eburu ya ihe agha, ha ezoro ezo pụọ. Mgbe ha rutewere ebe ahụ ndị agha Filistia nọ na Mikmash, Jọnatan gwaziri onye na-eburu ya ihe agha ihe o bu n’obi ime. Ọ gwara ya na ha ga-eme ka ndị agha Filistia hụ ha. Ọ bụrụ na ndị Filistia agwa ha ka ha gbagota buso ha agha, ha ga-amara na Jehova ga-enyere ha aka. Onye na-eburu ya ihe agha kwetara ozugbo. Ọ ga-abụ na ihe mere o ji kweta bụ n’ihi ihe Jọnatan kwuru. Ọ sịrị: “Ọ dịghị ihe na-egbochi Jehova isi n’aka ọtụtụ mmadụ ma ọ bụ n’aka mmadụ ole na ole mee ka e nwee nzọpụta.” (1 Samuel 14:​6-10) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

O doro anya na Jọnatan ma Chineke ya nke ọma. Ọ makwa na e nweela mgbe Jehova nyeere ndị ohu ya aka ha emerie ndị agha dị ọtụtụ karịa hanwa. E nwekwara oge ndị o si n’aka naanị otu onye merie ndị iro ndị ohu ya. (Ndị Ikpe 3:31; 4:​1-23; 16:​23-30) N’ihi ya, Jọnatan ma na ihe dị mkpa abụghị ole ndị ohu Chineke dị, otú ha siruru n’ike ma ọ bụ ụdị ngwá agha ha nwere, kama, ọ bụ ma hà nwekwara okwukwe. Okwukwe Jọnatan nwere mere ka ọ hapụ Jehova ka o kpebie ma ya na onye na-eburu ya ihe agha hà ga-aga lụso ndị agha ahụ ọgụ. O kwuru ihe ọ ga-abụ ya mee, ya amara na Jehova kwadoro ka ha busoo ndị Filistia ahụ agha. Mgbe ihe ahụ ọ tụrụ anya ya mezuru, ọ gawara n’atụghị ụjọ.

E nwere ihe abụọ gosiri na Jọnatan nwere okwukwe. Nke mbụ, o nwere ezigbo egwu Chineke ya, bụ́ Jehova. Ọ ma na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile anaghị adabere n’ike mmadụ iji mezuo nzube ya. Ma, ọ na-atọ Jehova ụtọ ịgọzi ụmụ mmadụ ji obi ha niile na-efe ya. (2 Ihe E Mere 16:9) Nke abụọ, Jọnatan chọrọ ihe ga-egosi na Jehova na-akwado ya tupu ya agaa n’ihu. Taa, anyị anaghị atụ anya ka Chineke rụọ ọrụ ebube iji gosi na ọ kwadoro ihe anyị chọrọ ime. Ebe anyị nwere Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ ya, anyị nwere ihe niile ga-enyere anyị aka ịmata ihe bụ́ uche Chineke. (2 Timoti 3:​16, 17) Ànyị na-ebu ụzọ achọpụta ihe Baịbụl kwuru tupu anyị emee mkpebi ndị dị mkpa? Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ọ ga-egosi na uche Chineke dị anyị mkpa karịa ihe anyị chere, otú ahụ Jọnatan mere.

Mmadụ abụọ ahụ, otu bụ dike n’agha onye nke ọzọ abụrụ onye na-eburu ya ihe agha, gbagowere ugwu ahụ ndị agha nọ. Ọ bịaziri doo ndị Filistia ahụ anya na ọ bụ ọgụ ka mmadụ abọọ a na-abịa ịlụso ha, ha ezipụ ndị agha ha ka ha gaa memilaa ha. Ndị Filistia dị ọtụtụ karịa ha, nọrọkwa n’ebe dị elu karịa ha. N’ihi ya, o yiri ihe na-agaghị esi ike imemila mmadụ abụọ ahụ n’egbughị oge. Ma, Jọnatan nọ na-akụtu ha otu otu, onye na-eburu ya ihe agha anọrọ ya n’azụ na-egbu ha. O gbughị oge mmadụ abụọ a egbuọla ndị agha ndị Filistia iri abụọ. E nwekwara ihe ọzọ Jehova mere. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ahụ, ndị niile nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu n’ọhịa mara jijiji, tinyere ndị niile na-eche nche; ìgwè ndị agha na-akwakọrọ ihe makwara jijiji, ọbụna ha onwe ha, ala malitekwara ịma jijiji, o wee ghọọ ịma jijiji si n’aka Chineke.”​—1 Samuel 14:15.

Ebe Jọnatan kpọ otu onye ọzọ na-aga ibuso ndị agha na-eche nche agha

Sọl na ndị ha na ya so nọ n’ebe dị anya na-ahụ ka ndị Filistia na-agba òké n’ọhịa, ngwere n’ụzọ, nke na ha bidoro gbuwe ibe ha. (1 Samuel 14:​16, 20) Ndị Izrel katara obi gaa busoo ha agha. Ọ ga-abụ na ọ bụzi ngwá agha ndị Filistia e gburu egbu ka ha jizi lụsowa ha ọgụ. Jehova mere ka ndị ya nwee oké mmeri n’ụbọchị ahụ. Kemgbe mkpamkpa a niile kpara, Jehova agbanwebeghị. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe na Jehova otú ahụ Jọnatan na onye a a na-akpọghị aha ya, na-eburu ya ihe agha nwere, anyị agaghị akwa mmakwaara maka na anyị kpebiri ife Jehova.​—Malakaị 3:6; Ndị Rom 10:11.

“Ya na Chineke Rụrụ Ọrụ”

Ma, agha ahụ adịrịghị Sọl mma otú ọ dịịrị Jọnatan. E nwere ihe ndị dị ezigbo njọ Sọl mere. O nupụụrụ Samuel, bụ́ onye amụma Jehova họpụtara isi, gaa chụọ àjà onye amụma ahụ, bụ́kwa onye Livaị, kwesịrị ịchụ. Mgbe Samuel bịarutere, ọ gwara Sọl na alaeze ya agaghị adịte aka n’ihi ihe ahụ o mere. Ọzọkwa, tupu Sọl eziga ndị agha ya n’ọgbọ agha, o mere ka ha ṅụọ iyi. Ọ sịrị: “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ga-eri ihe tupu anyasị bụ, ruokwa mgbe m ga-abọworị ọbọ n’ahụ́ ndị iro m!”​—1 Samuel 13:​10-14; 14:24.

Ihe a Sọl kwuru gosiri na ọ gbanweela. Ọ̀ ga-abụ na nwoke a dịbu umeala n’obi ma jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe aghọwala onye mpako na onye onwe ya na-ebuzi isi? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị Jehova kwuru ka e tie ụdị iwu a na-enweghị isi na ọdụ gbasara ndị agha a ji obi ha niile gaa ibu agha. Ihe Sọl ji mechie iwu ahụ o tiri bụ “ruokwa mgbe ga-abọworị ọbọ n’ahụ́ ndị iro m.” Ihe a Sọl kwuru ò gosiri na o chere na ọ bụ yanwa bụ o kwuchaa ọ gwụ n’agha ahụ? Ò chefuola na a na-alụ agha a n’ihi na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ bụghị n’ihi na Sọl chọrọ ka e too ya n’ihi na o meriri n’agha ma ọ bụ ka ọ bọọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro ya?

Jọnatan amaghị na nna ya mere ka ndị agha ṅụọ iyi na-enweghị isi. Ezigbo ike gwụrụ ya n’ihi agha ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ ọ lụrụ, n’ihi ya, ọ rụnyere mkpara ya n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ dị n’ọhịa ma rachaa ya. Ozugbo ahụ, o nwetaghachiri ume. Ma otu n’ime ndị agha ya gwara ya banyere iwu ahụ nna ya tiri. Jọnatan zara ya, sị: “Nna m ebutewo nsogbu n’ala a. Biko, leenụ otú anya doworo m maka na m detụrụ ntakịrị mmanụ aṅụ a ire. Lezienụ ihe gaara eme ma a sị na taa ndị Izrel riri ihe ha hụrụ bụ́ ndị ha kwatara n’aka ndị iro ha! N’ihi na ka ọ dị ugbu a, ndị Filistia e gburu ehibeghị nne.” (1 Samuel 14:​25-30) Ihe a o kwuru bụ eziokwu. Jọnatan na-erubere nna ya isi, ma ọ naghị erubere ya isi n’echeghị echiche. Ọ naghị ekwere ihe niile nna ya kwuru n’ebughị ụzọ chebara ya echiche. Àgwà a o nwere mekwara ka ndị ọzọ na-akwanyere ya ùgwù.

Mgbe Sọl matara na Jọnatan edebeghị iwu ahụ o tiri, Sọl ekwetaghịkwa na iwu ahụ o tiri abaghị uru. Kama nke ahụ, o kwuru na e kwesịrị igbu nwa ya. Jọnatan arụwaghị nna ya ụka ma ọ bụkwanụ rịọwa ka e meere ya ebere. Ihe ọ zara gosiri na ọ naghị eche gbasara naanị onwe ya. Ọ sịrị: “Lee m! Ka m nwụọ!” Ma, Ndị Izrel agbaghị nkịtị. Ha sịrị: “Jọnatan ọ̀ ga-anwụ, bụ́ onye mere ka e nwee nzọpụta a dị ukwuu n’Izrel? Tụfịakwa! Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, otu ntutu isi ya agaghị ada n’ala; n’ihi na ya na Chineke rụrụ ọrụ taa.” Gịnị mechara mee? Sọl kwetara ihe ha kwuru. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị Izrel wee si otú a napụta Jọnatan, ọ nwụghịkwa.”​—1 Samuel 14:​43-45.

“Lee m! Ka m nwụọ!”

Otú Jọnatan si nwee obi ike, na-arụsi ọrụ ike ma bụrụ onye na-anaghị achọ ọdịmma onwe ya mere ka o nwee ezi aha. Ezi aha a o nwere zọrọ ya ndụ mgbe a mara ya ikpe ọnwụ. Anyị kwesịrị ịna-echeta na otú ndị mmadụ si were anyị n’ihi àgwà anyị na-akpa kwa ụbọchị dị ezigbo mkpa. Baịbụl gwara anyị na ezi aha bara ezigbo uru. (Ekliziastis 7:1) Ọ bụrụ na anyị emee ka Jọnatan ma meere onwe anyị ezi aha n’ebe Jehova nọ, ndị mmadụ ga na-akwanyere anyị ùgwù.

Iko Ya Ejuwela

N’agbanyeghị ihe Sọl mejọrọ, Jọnatan so ya lụọ agha ndị ọ lụru n’oge ndị ahụ. O doro anyị anya na ọ nọ na-ewute Jọnatan mgbe nna ya malitere inupụ isi na ịdị mpako. Iko nna ya ji nwayọọ nwayọọ na-eju, Jọnatan enwekwanụghị ihe ọ ga-eme iji kwụsị ya.

Iko Sọl mechara ju mgbe Jehova gwara ya ka ọ gaa busoo ndị Amalek agha. Ndị Amalek na-eme ihe ọjọọ nke ukwuu nke na n’oge Mozis, Jehova kwuru na a ga-ebibi mba ahụ niile. (Ọpụpụ 17:14) A gwara Sọl ka o gbuo anụ ụlọ ha niile, gbuokwa eze ha bụ́ Egag. Sọl meriri n’agha ahụ. O dokwara anya na Jọnatan ji obi ike soro nna ya lụọ agha ahụ dịkwa ka ọ na-eme na mbụ. Ma, Sọl kpachaara anya nupụrụ Jehova isi. O gbughị Egag, o kweghịkwa ka ọkọ ọ bụla kọọ anụ ụlọ ha, bụ́ akụnụba ha. Samuel onye amụma gwara Sọl ihe Jehova kpebiri ime. Ọ gwara ya, sị: “Ebe ọ bụ na ị jụwo okwu Jehova, ya onwe ya ajụwo gị ka ị ghara ịbụkwa eze.”​—1 Samuel 15:​2, 3, 9, 10, 23.

Ọ dịghị anya ihe a mechara, Jehova anapụ Sọl mmụọ nsọ ya. Ebe ọ bụ na Jehova anọnyereghịzi Sọl, obi ụtọ ọ na-enwebu lara ka naị, ọ naghị ara ahụ́ iwe abịa ya, obi anaghịkwa eru ya ala. Ọ bịara dị ka à ga-asị na Chineke wepụrụ mmụọ dị mma dị n’ime ya ma were nke na-adịghị mma dochie ya. (1 Samuel 16:14; 18:​10-12) O doro anya na o wutere Jọnatan nke ukwuu mgbe ọ hụrụ ka nna ya bụbu ezigbo mmadụ bịara ghọọ ajọ mmadụ. Ma, nke ahụ emeghị ka Jọnatan kwụsị iji obi ya niile na-ejere Jehova ozi. Ọ ka jikwa obi ya niile na-akwado nna ya, mgbe ụfọdụkwa, na-agwakwa nna ya obi ya n’ezoghị ọnụ. Ma, onye o lekwasịrị anya bụ Jehova, bụ́ Chineke ya na Nna ya nke na-anaghị agbanwe agbanwe.​—1 Samuel 19:​4, 5.

È nweela mgbe ị hụrụ ka onye ị hụrụ n’anya, dị ka onye ezinụlọ gị, ji nke nta nke nta gbanwee ghọọ onye ọjọọ? Ụdị ihe a na-agbawa obi n’eziokwu. Ihe Jọnatan mere na-echetara anyị ihe otu ọbụ abụ mechara dee. Ọ sịri: “Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.” (Abụ Ọma 27:10) Jehova anaghị ahapụ ndị ya. A sịgodị na ụmụ mmadụ na-ezughị okè ga-emechu gị ihu ma gharịpụ gị, Jehova ga-akpọrọ gị, otú ahụ ọ kpọọrọ ọbụ abụ ahụ, ma bụụrụ gị ezigbo Nna na-enweghị atụ.

Ọ ga-abụ na Jọnatan ma na Jehova achọghịzi ka Sọl bụrụ eze. Gịnị ka o mere? Ọ̀ bịara chewe ụdị eze ya gaara abụ? Ò chewere otú ya gaara esi mezie ihe ụfọdụ nna ya mebiri, si otú ahụ mee ka ndị mmadụ mata otú eze na-erube isi si achị ọchịchị? Anyị amaghị ihe dị ya n’obi. Ma, anyị ma na e nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ mechara mee. Nke a ọ̀ pụtara na Jehova gbahapụrụ nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi? Mbanụ. Kama, n’ime ndị niile bụ́ ezigbo ndị enyi e dekọrọ na Baịbụl, Jehova ji nke Jọnatan na Devid maa atụ. Anyị ga-akọ gbasara enyi ahụ n’isiokwu ọzọ ga-ekwu gbasara Jọnatan.