Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA

Otú Di na Nwunye Ga-esi Egosi na Ha Hụrụ Ibe Ha n’Anya

Otú Di na Nwunye Ga-esi Egosi na Ha Hụrụ Ibe Ha n’Anya

Ka chi na-abọ, ka ndị di na nwunye na-akwụsịlata igosi ibe ha na ha hụrụ ha n’anya. Ọ bụrụ na ọ bụ ụdị ihe a ka gị na ya na-alụ, ò nwere ihe o mere?

 Ihe i kwesịrị ịma

Igosi di gị ma ọ bụ nwunye gị na ị hụrụ ya n’anya bụ ihe dị ezigbo mkpa ga-eme ka alụmdi na nwunye unu bụrụ a kwaa a kwụrụ. Otú ahụ iri ihe oriri na ịṅụ mmiri mgbe mgbe si eme ka ahụ́ gbasie mmadụ ike, ka di ma ọ bụ nwunye ịna-egosi ibe ya na ọ hụrụ ya n’anya mgbe mgbe ga-esi eme ka alụmdi na nwunye ha sie ike ma na-akakwu mma. Ọ bụrụgodi na o teela di na nwunye lụrụ, onye nke ọ bụla n’ime ha ka kwesịrị ịna-eme ka ibe ya ghọta na ọ hụrụ ya n’anya ma jiri ya kpọrọ ihe.

Onye nwere ezigbo ịhụnanya anaghị achọ ọdịmma onwe ya naanị. Ọ na-achọ ime ihe ga-eme onye ọzọ obi ụtọ. N’ihi ya, onye ahụ anaghị egosi di ma ọ bụ nwunye ya na ọ hụrụ ya n’anya naanị mgbe o metụrụ ya n’obi, kama, ọ na-achọpụta mgbe di ma ọ bụ nwunye ya chọrọ ka o gosi ya na ọ hụrụ ya n’anya, gbalịakwa gosi ya.

Ọ bụ ndị nwunye ka ọ dị mkpa ka e gosi na a hụrụ ha n’anya karịa. Di nwere ike ịhụ nwunye ya n’anya nke ukwu. Ma ọ bụrụ na ọ bụ naanị n’isi ụtụtụ na n’abalị ma ọ bụkwanụ tupu ha enwee mmekọahụ ka ọ na-eme ka ọ mara na ọ hụrụ ya n’anya, o nwere ike isiri nwunye ya ike ikweta na ọ hụrụ ya n’anya n’eziokwu. Ọ ga-aka mma ịna-eme ka nwunye gị mara na ị hụrụ ya n’anya ugboro ugboro n’ụbọchị.

 Ihe i nwere ike ime

Na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị na ị hụrụ ya n’anya. Di ma ọ bụ nwunye ịgwa ibe ha okwu ndị dị ka “Ahụrụ m gị n’anya, ị bụ ọ̀ dị m n’obi,” nwere ike ime ka onye nke ọ bụla mara na e ji ya kpọrọ ihe.

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.”​—Matiu 12:34.

Aro: Ọ bụghị naanị n’ọnụ ka ị ga na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị na ị hụrụ ya n’anya. I nwere ike ide ya n’akwụkwọ, zigara ya ozi n’iimel ma ọ bụkwanụ gị ezigara ya ozi n’ekwentị.

Mee ihe ndị gosiri na ị hụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị n’anya. Ụzọ ọzọ mmadụ nwekwara ike isi gosi na ọ hụrụ di ma ọ bụ nwunye ya n’anya n’eziokwu bụ ịdịda ya aka, ịmụmụrụ ya ọnụ ọchị, ma ọ bụ inye ya onyinye mgbe ụfọdụ. Di nwekwara ike ibutere nwunye ya akpa, mepeere ya ụzọ, nyere ya aka saa efere, saa ákwà ma ọ bụdị sie nri. Ọtụtụ ndị nwunye na-ewere ya na ihe a ndị di ha na-emere ha bụ ụzọ ha si egosi na ha hụrụ ha n’anya n’eziokwu, ọ bụghị naanị iji nyere ha aka.

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ka anyị hụ . . . n’anya, ọ bụghị [naanị] n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.”​—1 Jọn 3:18.

Aro: Na-emeso di gị ma ọ bụ nwunye ihe otú ahụ i si mesoo ya mgbe ahụ unu na-akpa.

Wepụtanụ oge unu ga-eji na-anọrị. Ịwepụta oge naanị unu ga-eji na-anọrị ga-eme ka alụmdi na nwunye unu sikwuo ike, ọ ga-emekwa ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mara na gị na ya ịna-anọrị na-atọgbu gị atọgbu. Nke bụ́ eziokwu bụ na iwepụta oge unu ga-eji na-anọrị agaghị adịchara unu mfe, karịchaa ma ọ bụrụ na unu nwere ụmụ ma ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa unu na-eme n’ụbọchị. Ma, unu nwere ike hazie ihe dị mfe naanị unu abụọ nwere ike ịme, dị ka iji ụkwụ gagharịa ebe ụfọdụ.

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”​—Ndị Filipaị 1:10.

Aro: Ụfọdụ ndị di na nwunye na-anaghị enwecha ohere na-ewepụta mgbede ma ọ bụ ngwụcha izu ụfọdụ ha ji eme mkpapụ.

Mata di gị ma ọ bụ nwunye gị nke ọma. Otú di ma ọ bụ nwunye si achọ ka a na-egosi ya na a hụrụ ya n’anya anaghị abụ otu. Kwuritanụ otú onye nke ọ bụla n’ime unu ga-esi chọọ ka ibe ya na-egosi ya na ọ hụrụ ya n’anya. Kwuritakwanụ ma ò nwere ihe ndị ọzọ ị ga-achọ ka di gị ma ọ bụ nwunye gị meere gị. Gbazie mbọ hụ na i meere di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe ndị ahụ. Cheta na igosi di gị ma ọ bụ nwunye gị na ị hụrụ ya n’anya bụ ihe dị ezigbo mkpa ga-eme ka alụmdi na nwunye unu bụrụ a kwaa a kwụrụ.

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ịhụnanya adịghị . . . achọ ọdịmma nke ya.”​—1 Ndị Kọrịnt 13:​4, 5.

Aro: Kama ịna-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ka ọ na-egosi gị na ọ hụrụ gị n’anya, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe m ga-eme ka di m ma ọ bụ nwunye m hụkwuo m n’anya?’