Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Ihe M Ga-eme Ka Mmekọ Nwoke na Nwaanyị Ghara Ịna-abata M n’Obi?

Olee Ihe M Ga-eme Ka Mmekọ Nwoke na Nwaanyị Ghara Ịna-abata M n’Obi?

Ihe i nwere ike ime

Kpachapụ anya n’ụdị ndị gị na ha na-akpa. Ọ bụrụ na ndị enyi gị na ụmụ klas unu ana-ekwu okwu iberiibe, esokwala ha. I soro ha, ọ ga-eme ka o siere gị ike iwepụ ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị n’obi gị. Ha kpawa ụdị nkata ahụ, i nwere ike jiri akọ pụọ n’emeghị ka ị̀ bụ onye oké ezi omume. Meekwa ya otú ha na-agaghị akọwa gị ọnụ.

Ị̀ ga-ekwe ka e tinye nsí ná nri ị na-eri? Ọ bụrụ na ị gaghị ekwe, olee uru ọ bara ikponye ihe rụrụ arụ n’uche gị?

Ejikwala ihe iberiibe atụrụ ndụ. Ọtụtụ ihe a na-emepụtara ndị mmadụ ka ha jiri na-atụrụ ndụ taa na-eme ka agụụ mmekọ nwoke na nwaanyị na-agụ ha. Ma, olee ihe Baịbụl gwara anyị? Ọ sịrị: “Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ, wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo oké n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Ejikwala ihe ọ bụla ga-eme ka mmekọ nwoke na nwaanyị gụwa gị na-atụrụ ndụ.

Cheta na agụụ mmekọahụ ịgụ mmadụ abụghị ihe ọjọọ. A sịdị kwuwe, ọ bụ Chineke kere nwoke na nwaanyị ka ha na-enwe mmasị n’ebe ibe ha nọ. Ọ bụ ya mere na ọ bụghị ihe ọjọọ ma di na nwunye na-enwe mmekọahụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na agụụ mmekọahụ na-agụsi gị ike, echekwala na ị bụ onye ọjọọ ma ọ bụkwanụ na ị gaghị emeli ihe dị mma.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ị chọrọ ka ọ dị gị n’obi bụ ihe ga-adị gị n’obi. Ị chọọ, ị ga-emeli ka ihe ọjọọ ghara ịna-abata gị n’obi, ị ga-akpalikwa àgwà ọma.

 

GỤKWUO GBASARA YA

NDỊ NA-ETO ETO

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Nke 1

Ụfọdụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a kwuru gbasara ịṅụ ọgwụ ọjọọ, mmekọ nwoke na nwaanyị, na nwoke na nwaanyị ịkpa.